Aionian Verses

Wanawe na binti zake wote wakainuka na kumfariji, lakini alikataa kufarijiwa. Akasema, “Hakika nitashuka kuzimu nikimwombolezea mwanangu.” Babaye akamlilia. (Sheol h7585)
Ụmụ ya ndị ikom na ụmụ ya ndị inyom niile bịara ịkasị ya obi, ma ọ jụrụ ịnabata nkasiobi ọbụla. Ọ sịrị, “Aga m alakwuru nwa m nʼala mmụọ site nʼiru ụjụ.” Nna ya kwagidere akwa nʼihi ya. (Sheol h7585)
Yakobo akasema, “Mwanangu atashuka pamoja nanyi. Kwani ndugu yake amekufa na yeye peke yake amebaki. Ikiwa madhara yatampata katika njia mnayoiendea, ndipo mtakapozishusha mvi zangu kaburini kwa huzuni.” (Sheol h7585)
Ma Jekọb sịrị, “Nwa m agaghị eso unu gaa. Nʼihi na nwanne ya anwụọla, ọ bụkwa naanị ya ka ọ fọdụrụ. Ọ bụrụ na nsogbu ezute ya nʼụzọ nʼije a, unu ga-eme ka m jiri isi awọ m laa nʼili nʼọnọdụ mwute.” (Sheol h7585)
Nanyi mkimchukua huyu naye kutoka kwangu mabaya yanaweza kumpata, mtashusha mvi zangu kwa kaburini kwa huzuni. (Sheol h7585)
Ọ bụrụ na unu anapụkwa m onye nke a, si otu a mee ka ihe ọjọọ zute ya, ọ pụtara na unu ga-eme ka m jiri isi awọ m laa nʼili nʼọnọdụ obi ọjọọ?’ (Sheol h7585)
itakuwa, atakapoona kwamba kijana hayupo nasi atakufa. Na watumishi wako watazishusha mvi za mtumishi wako baba yetu kaburini kwa masikitiko. (Sheol h7585)
mgbe ọ ga-ahụ na nwantakịrị a esoghị anyị, ọ ga-anwụ. Mgbe ahụ, anyị bụ ndị ohu gị, ga-eme ka nna anyị jiri isi awọ laa nʼili nʼọnọdụ obi ọjọọ. (Sheol h7585)
Lakini kama BWANA aumbaye malango ya ardhi ambayo huwameza kama mdomo mkubwa, pamoja na familia zao, na kama wataingia ndani ya shimo wakiwa hai, ndipo mtakapojua kuwa wamemdharau BWANA,” (Sheol h7585)
Ma ọ bụrụ na Onyenwe anyị emee ihe ọhụrụ dị iche, mee ka ala meghee ọnụ ya, lodaa ndị a niile, na ihe niile bụ nke ha, si otu a mee ka ha rịda nʼala ili na ndụ, mgbe ahụ, unu ga-amata na ndị ikom ndị a eledala Onyenwe anyị anya.” (Sheol h7585)
Wao na kila mmoja kwenye familia zao wakaingia ndani shimoni wakiwa hai. Dunia ikwafunika, na kwa njia hii wakapotea kutoka miongoni mwa ile jamii. (Sheol h7585)
Ha niile rịdaruru nʼala ndị nwụrụ anwụ na ndụ. Ala ahụ kpuchikwara ha niile, si otu a mee ka ha laa nʼiyi. (Sheol h7585)
Kwa maana moto kuwashwa kwa hasira yangu na inawaka hadi chini mwa Sheoli; inameza ulimwengu na mavuno yake; inawasha moto misingi ya milima. (Sheol h7585)
Nʼihi na a mụnyela ọkụ nʼọnụma m, ọkụ ga-enwu ruo ala mmụọ nʼokpuru ụwa. Ọ ga-erepịa ụwa na mkpụrụobi niile, ọ ga-amụnye ọkụ na ntọala ugwu ukwu niile. (Sheol h7585)
BWANA huua na huuisha. Hushusha kuzimu na huleta tena juu. (Sheol h7585)
“Onyenwe anyị na-eweta ọnwụ, ya na-emekwa ka a dị ndụ, ọ bụ ya na-eme ka mmadụ daa nʼụra ọnwụ, na-emekwa ka ha dị ndụ ọzọ. (Sheol h7585)
Vifungo vya kuzimu vilinizunguka; kamba za mauti zikaninasa. (Sheol h7585)
Ụdọ niile nke ili kere m agbụ, Ọnya nke ọnwụ guzogidere m. (Sheol h7585)
Mshughulikie Yoabu kwa hekima ambayo umejifunza, lakini usiache mvi zake ziingie kaburini kwa amani. (Sheol h7585)
Ị bụ nwoke maara ihe, ị makwaara ihe ị ga-eme. Ekwela ka Joab, nʼagbanyeghị isi awọ ya, nwụọ nʼudo. (Sheol h7585)
Kwa hiyo sasa usimwache aiepuke adhabu. Wewe ni mwenye hekima, na utajua jinsi itakavyokupasa kumtendea. Utakileta hicho kichwa chenye mvi chini kaburini.” (Sheol h7585)
Ma achọghị m ka ị hapụ ya dịka onye ikpe na-amaghị. Ị bụ nwoke maara ihe. Ị makwaara ihe ị ga-eme ya. Mee ka o jiri isi awọ ọbara juru baa nʼili.” (Sheol h7585)
kama vile wingu liishavyo na kutoweka, hivyo wale waendao sheoli hawatarudi tena kabisa. (Sheol h7585)
Dịka igwe ojii si efefusi ma na-agbasa, otu a ka ọ dịrị onye na-arịda nʼime ili ọ naghị arịpụtakwa. (Sheol h7585)
Upeo uko juu kama mbingu; unaweza kufanya nini wewe? Ni wenye kina kirefu kuliko kuzimu; waweza kufahamu nini wewe? (Sheol h7585)
Ha dị elu karịa eluigwe, gịnị ka ị pụrụ ime? Ha dị ogbu karịa ala ili, gịnị ka ị pụrụ ịma? (Sheol h7585)
Laiti, kwamba ungenificha mimi mbali katika kuzimu mbali kutoka katika mahangaiko, na kwamba ungenitunza mimi katika siri hadi hasira yake imalizike, kwamba ungeniwekea mimi muda maalumu wa kukaa huko na kisha kuniita mimi katika fahamu! (Sheol h7585)
“A sị na ị ga-ezo m nʼala mmụọ, na ị ga-ezobe m tutu ruo mgbe iwe gị gabigara. A sị na ị ga-akanyere m oge ma mesịa cheta m. (Sheol h7585)
Tangu mimi nitazame katika Kuzimu kama nyumbani kwangu; tangu Mimi nimetandaza kiti changu katika giza; (Sheol h7585)
Ọ bụrụ na ebe obibi m na-ele anya ya bụ ili, ọ bụrụ na m agbasaa ihe ndina m nʼelu ọchịchịrị, (Sheol h7585)
Tumaini litakwenda pamoja na mimi katika milango ya Kuzimu wakati sisi tutakapokwenda katika mavumbi? (Sheol h7585)
Olileanya m ọ ga-arịda ruo nʼọnụ ụzọ ama nke ọnwụ? Anyị ga-esokọta rịdaruo nʼuzuzu?” (Sheol h7585)
Wanatumia siku zao katika mafanikio, na wanashuka kuzimu kwa utulivu. (Sheol h7585)
Ha na-anọ ụbọchị ndụ ha niile nʼọganihu, ha na-arịdakwa nʼili ha nʼudo. (Sheol h7585)
Kiangazi na joto huondoa barafu; ndivyo kuzimu pia kunavyowaaribu waliotenda dhambi. (Sheol h7585)
Dịka okpomọkụ na ọkọchị si eme ka mkpụrụ mmiri oyi gbazee, otu a ka ala ili si ewere ndị mehiere nʼike. (Sheol h7585)
Kuzimu kuko wazi mbele ya Mungu; uharibifu hauna kizuizi dhidi yake. (Sheol h7585)
Ala mmụọ gba ọtọ nʼihu Chineke; mbibi tọgbọkwara na-enweghị ihe kpuchiri ya. (Sheol h7585)
kwa kuwa kifoni hakuna kumbukumbu lako. Kuzimuni ni nani atakaye kushukuru? (Sheol h7585)
Nʼetiti ndị nwụrụ anwụ ọ dịghị onye na-ekwupụta aha gị. O nwere onye na-eto gị site nʼala ili? (Sheol h7585)
Waovu wamekataliwa na kupelekwa kuzimu, mataifa yote yanayo msahau Mungu. (Sheol h7585)
Ndị niile na-eme ajọ omume na-alaghachi nʼili; nke a bụkwa ọnọdụ mba niile na-echefu Chineke. (Sheol h7585)
Kwa kuwa hautaiacha roho yangu kuzimuni. Wewe hautamuacha mwaminifu wako kuliona shimo. (Sheol h7585)
Nʼihi na ị gaghị ahapụ m nʼala mmụọ, ị gaghị ekwekwa ka Onye gị kwesiri ntụkwasị obi hụ ire ure. (Sheol h7585)
Kamba za kuzimu zilinizunguka; mitego ya mauti ilininasa. (Sheol h7585)
Ụdọ nke ili kere m gburugburu, ọnya nke ọnwụ guzogidere m. (Sheol h7585)
Yahwe, wewe umeitoa roho yangu kuzimuni; nawe umeniweka hai mbali na kaburi. (Sheol h7585)
O Onyenwe anyị, i si nʼala ili kpọpụta m, i mere ka m dịrị ndụ. (Sheol h7585)
Usiniache niaibishwe, Yahwe; kwa maana ninakuita wewe! Waovu waaibishwe! Na wanyamaze kimya kuzimuni. (Sheol h7585)
O Onyenwe anyị, ekwela ka ihere mee m, nʼihi na akpọkuola m gị; kama mee ka ihere mee ndị na-eme ihe ọjọọ, ka ha tọgbọrọ nʼala mmụọ debe ọnụ ha duu. (Sheol h7585)
Kama kondoo wamechaguliwa kwa ajili ya kuzimu na kifo kitakuwa mchungaji wao. Nao watatawaliwa na wenye haki ifikapo asubuhi, na miili yao italiwa kuzimuni, wakiwa hawana afasi ya kuishi kwa ajili yao. (Sheol h7585)
Dịka atụrụ, ọ bụ ala mmụọ ka a kwadooro ha, ọnwụ ga-abụ onye na-azụ ha dịka atụrụ, ma ndị na-eme ihe ziri ezi ga-emeri ha nʼụtụtụ. Ozu ha ga-erekasị nʼime ili nʼebe dị anya site nʼụlọeze ha. (Sheol h7585)
Bali Mungu ataufufua uhai wangu kutoka katika nguvu ya kuzimu; naye atanipokea. (Selah) (Sheol h7585)
Ma Chineke ga-agbapụta ndụ m site nʼili, nʼezie, ọ ga-akpọrọ m nye onwe ya. (Sela) (Sheol h7585)
Kifo na kiwapate ghafla; na washuke wakiwa hai kuzimuni, maana ndiko waishiko waovu, hapo hapo kati yao. (Sheol h7585)
Ka ọnwụ bịakwasị ndị iro m na mberede; ka ha rịdaa ala mmụọ na ndụ, nʼihi na ihe ọjọọ na-achọta ebe ọnọdụ nʼetiti ha. (Sheol h7585)
Kwa maana uaminifu wa agano lako ni mkuu kwangu; wewe umeokoa uhai wangu kutoka chini kuzimuni. (Sheol h7585)
Nʼihi na ịhụnanya gị nʼebe m nọ dị ukwuu; i sitela nʼomimi nke dị ala site nʼala ndị nwụrụ anwụ dọpụta m. (Sheol h7585)
Maana nimejawa taabu, na uhai wangu umefika kuzimuni. (Sheol h7585)
Nʼihi na ọtụtụ nsogbu ejupụtala mkpụrụobi m, anọ m nso nʼọnụ ụzọ ọnwụ. (Sheol h7585)
Ni nani aweza kuishi na asife, au atakaye iokoa nafsi yake dhidi ya mkono wa kuzimu? (Selah) (Sheol h7585)
Olee onye ahụ nwere ike ịdị ndụ ghara ịhụ ọnwụ anya, maọbụ zọpụta onwe ya site nʼike nke ili? (Sela) (Sheol h7585)
Kamba za mauti zilinizunguka, na mitego ya kuzimu ilinikabili; niliona dhiki na huzuni. (Sheol h7585)
Agbụ nke ọnwụ kekọrọ m, oke ihe mgbu nke ili bịakwasịrị m; nsogbu na iru ụjụ dakwasịrị m. (Sheol h7585)
Kama nikipaa mbinguni, uko huko; kama nikifanya kitanda changu Kuzimuni, tazama, uko huko. (Sheol h7585)
Ọ bụrụ na m arịgoro nʼeluigwe ị nọ nʼebe ahụ. Ọ bụrụkwa na m arịda zoo onwe m nʼala mmụọ, ị nọkwa nʼebe ahụ. (Sheol h7585)
Watalazimika kusema, “Kama vile jembe moja livunjapo ardhi, hivyo mifupa yetu imesambaratishwa kinywani pa kuzimu.” (Sheol h7585)
Ha ga-ekwu sị, “Dịka mmadụ na-egburi, na-akọgharị ala, otu a ka a ghasasịrị ọkpụkpụ anyị nʼọnụ ili.” (Sheol h7585)
Haya tuwameza wakiwa hai, kama kuzimu inavyowachukua wenye afya, na kuwa kama wale waangukao kwenye shimoni. (Sheol h7585)
Ka anyị loo ha na ndụ, dịka ala ili, loo ha kpamkpam dịka ndị na-arịda nʼolulu. (Sheol h7585)
Miguu yake huelekea mauti; hatua zake huelekea njia yote ya kuzimu. (Sheol h7585)
Ụkwụ ya abụọ na-arịdaru nʼọnwụ, nzọ ụkwụ ya abụọ na-eje nʼụzọ ọkụ ala mmụọ. (Sheol h7585)
Nyumba yake ipo juu ya barabara ya kwenda kuzimu; huelekea chini kwenye vyumba vya mauti. (Sheol h7585)
Ụlọ ya bụ okporoụzọ nke na-eduba nʼili, nke na-edubakwa nʼala ọnwụ. (Sheol h7585)
Lakini hajui kwamba wafu wapo pale, wageni wake wapo kwenye vina vya kuzimu. (Sheol h7585)
Ma ha adịghị aghọta na ndị nʼadịghị ndụ nọ nʼebe ahụ, na ndị ọ kpọrọ oku nri aghọọlarị ndị nọ nʼala mmụọ. (Sheol h7585)
Kuzimu na uharibifu vipo wazi mbele za Yehova; je si zaidi sana mioyo ya wana wa wanadamu? (Sheol h7585)
Onyenwe anyị mazuru ihe omimi niile nke ọnwụ na ọkụ ala mmụọ; ọ ga-esikwa aṅaa ghara ịma obi ụmụ mmadụ? (Sheol h7585)
Njia ya uzima huwapeleka juu watu wenye hekima, ili waondoke kutoka chini kuzimu. (Sheol h7585)
Ụzọ ndụ na-agbago elu nye onye nwere uche, iwezuga ha site na-ịgbada nʼala mmụọ dị nʼokpuru. (Sheol h7585)
Ni wewe unayepaswa kumchapa kwa fimbo na kuikoa nafsi yake kuzimu. (Sheol h7585)
Jiri mkpara tie ya ihe ma zọpụta ndụ ya site nʼọnwụ. (Sheol h7585)
Kama kuzimu na Uharibifu havitosheki, ndivyo yalivyo macho ya mtu hayawezi kutosheka. (Sheol h7585)
Dịka afọ adịghị eju ọnwụ na mbibi, otu a ihe na-agụ anya mmadụ adịghị agwụ agwụ. (Sheol h7585)
Kuzimu, tumbo tasa, nchi yenye kiu kwa maji, na moto usiosema, “Inatosha.” (Sheol h7585)
Ala ili, akpanwa nwanyị na-adịghị atụ ime, ala nke mmiri na-adịghị eju afọ, na ọkụ nke na-adịghị asị, ‘O zuola.’ (Sheol h7585)
Chochote mkono wako unakifanya, kifanye kwa nguvu zako kwa sababu hakuna kazi, au ufafanuzi au ujuzi au hekima katika Sheol, unapoenda. (Sheol h7585)
Ihe ọbụla ị na-eme, were ike gị niile mee ya, nʼihi na ịrụ ọrụ maọbụ iche echiche, maọbụ ihe ọmụma, maọbụ amamihe adịghị nʼala ndị nwụrụ anwụ. Ebe ahụ kwa ka ị na-aga. (Sheol h7585)
Nieka kama muhuri kwenye moyo wako, kama muhuri kwenye mkono wako, kwa kuwa mapenzi yana nguvu kama mauti. Mapenzi mazito hayana kurudi kama kwenda kuzimu; miale yake yalipuka; ni miale ya moto inayo waka, miale yenye joto kuliko moto wowote. (Sheol h7585)
Tụkwasị m dịka mgbaaka ihe a kara nʼobi, dịka mgbaaka ihe a kara nʼaka gị nʼihi na ịhụnanya dị ike dịka ọnwụ, ekworo ya dịkwa ike dịka ala mmụọ. Ọ na-enwupụtakwa dịka ọkụ na-ere ere, dịka ọkụ nke dị ukwu. (Sheol h7585)
Hivyo basi kuzimu kumeongeza ladha yake na imefungua kinywa chake kwa kiasi kikubwa; wasomi wao, viongozi wao, manabii na wenye furaha miongoni mwao, watashuka kuzimu. (Sheol h7585)
Nʼihi ya, ala mmụọ na-eme ka ọchịchọ ya saa mbara, ọ na-asaghebigakwa ọnụ ya oke; ndị ukwu na ndị nta bi nʼime ala a ka ọ ga-elo, tinyere ndị na-emebiga mkpọtụ oke, na ndị na-egwuribiga egwu ọṅụ oke. (Sheol h7585)
''Omba ishara ya Yahwe Mungu wako; omba juu ya hilo kwa kina au kwa kiwango cha juu.'' (Sheol h7585)
“Jụọ m bụ Onyenwe anyị Chineke gị, ka m meere gị ihe ịrịbama nke ga-egosi gị na m ga-ebibi ndị iro gị niile dịka m kwuru. Rịọọ m ihe masịrị gị, nʼebe dị elu nʼeluigwe maọbụ nʼebe kachasị omimi nʼụwa.” (Sheol h7585)
Kuzimu haina hamu kwa ajili yako unaye enda pale. Watafufuka waliokufa kwa ajili yako, wafalme wote wa dunia, wafanje watoke katika viti vyao vya enzi, wafalme wote wa mataifa. (Sheol h7585)
Ala mmụọ na-eme mkpọtụ, na-eche izute gị nʼọbịbịa gị; ọ na-akpọte mmụọ nke ndị nwụrụ anwụ ịbịa kelee gị, bụ ndị niile bụburịị ndị ndu nʼụwa, ọ na-eme ka ha si nʼocheeze ha niile bilie bụ ndị niile ahụ bụ eze na mba niile dị iche iche. (Sheol h7585)
Kiburi chako kimeshushwa kuzimu na sauti kifaa cha kamba yako. Buu wameongezeka chini yako na vijidudu vinakufunika wewe.' (Sheol h7585)
Nganga ịbụ eze gị niile, na oke ụzụ ụbọ akwara gị, ka a na-elikọta nʼaja. Ikpuru ga-aghọrọ anụ ahụ gị ebe ndina; ọ bụkwa ikpuru ga-aghọ ihe mkpuchi ahụ gị. (Sheol h7585)
Lakini kwa sasa umeshushwa chini kuzimu, kwenye kina cha shimo. (Sheol h7585)
Ma a ga-ewedata gị ala ruo nʼili, ruo na nsọtụ ala mmụọ. (Sheol h7585)
Hii itatokea kwa sababu umesema, '' Tumefannya magano na kifo; maana kuzimu wameyafikia makubaliano. Hivyo basi hukumu itakapopitishwa kwa wingi, haitatufika sisi, maana tumefanya maneno ya uongo kuwa kimbilio letu, na uongo kuwa makazi yetu. (Sheol h7585)
Nʼihi na unu ekwuola sị, “Anyị na ọnwụ agbaala ndụ, anyị na ala mmụọ enwekọọkwala otu mkpebi. Mgbe ịla nʼiyi ahụ dị ukwuu ga-esi nʼebe anyị nọ gafee, ọ gaghị erute anyị, nʼihi na anyị emeela ka okwu ụgha bụrụ ebe mgbaba anyị; ọ bụkwa nʼime okwu ụgha ka anyị na-ezo onwe anyị.” (Sheol h7585)
Agano lako na kifo litafutwa, na makubaliano yako na kuzimu hayatasimama. Pindi mafuriko makali yatapta, yatawazomba njie. (Sheol h7585)
Mgbe ahụ, a ga-akagbu ọgbụgba ndụ ahụ unu na ọnwụ gbara; mkpebi unu na ala mmụọ agaghị eguzokwa. Mgbe oke ịla nʼiyi ahụ si nʼebe unu nọ na-agafe, ọ ga-azọda unu. (Sheol h7585)
''Nimesema kwamba nusu ya maisha yangu nitapita katika mlango wa kuzimu; Nilitumwa pale miaka yangu yote. (Sheol h7585)
Asịrị m, “Ọ bụ nʼoge m bụ okorobịa ka m ga-agabiga nʼọnụ ụzọ nke ọnwụ, bụrụ onye anapụrụ oge ndụ m nke fọdụrụ afọdụ?” (Sheol h7585)
Maana kuzimu hapata kushukuru wewe; kifo hakikusifu wewe; wale wote waendao ndani ya shimo hawana matumaini ya uaminifu wako. (Sheol h7585)
Nʼihi nʼala mmụọ agaghị eto gị, ọnwụ agakwaghị abụku gị abụ otuto. Ndị na-arịda nʼolulu agaghị ele anya ikwesi ntụkwasị obi gị. (Sheol h7585)
Ulienda kwa Moleki pamoja na mafuta; umeongeza marashi. Ulimtuma balozi wako mbali sana; Alikwenda chini kuzimu. (Sheol h7585)
Ị were mmanụ jekwuru Molek meekwa ka mmanụ otite gị na-esi isi ụtọ baa ụba. Ị zipụrụ ndị nnọchite anya gị gaa na mba dị anya; ị gbadara ruo nʼime ime ala mmụọ. (Sheol h7585)
Bwana Yahwe asema hivi: Katika siku wakati mkangazi uliposhuka chini nilileta maombolezo kwenye dunia. Niliyafunika maji ya chini juu yake, nikayarudisha maji ya bahari. Nilizuia maji makuu, nikaleta maombolezo hata Lebanoni kwa ajili yake. Hivyo miti yote ya shambani ikaomboleza kwa sababu yake. (Sheol h7585)
“‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Nʼụbọchị ahụ e mere ka ọ rịdaruo nʼala mmụọ, a kwụsịrị m ogbu mmiri niile were ha kpuchie ya. A kwụsịrị nsọgharị nke mmiri, meekwa ka ịba ụba nke mmiri ya niile kwụsị. Nʼihi ya, eyinyere m Lebanọn uwe mkpe, osisi niile nke ọhịa kpọnwụkwara nʼihi ya. (Sheol h7585)
Nimeleta tetemeko kwa mataifa wa sauti ya kuanguka kwake, wakati nitakapomtupa chini mpaka kuzimu pamoja na wale walioenda chini kwenye shimo. Hivyo niliitia moyo miti ya Edeni yote katika pande zote za nchi. Hii ilikuwa imechaguliwa na miti iliyokuwa bora ya Lenanoni; miti iliyokunywa maji. (Sheol h7585)
Emere m ka mba niile maa jijiji nʼegwu nʼihi ọdịda ya, mgbe m tụnyere ya na ndị ahụ na-aga nʼolulu nʼime ala mmụọ. Mgbe ahụ, a kasịrị osisi niile mara mma obi, bụ osisi ndị ahụ dị nʼogige Iden, na osisi ọma niile nke Lebanọn, ndị nke mgbọrọgwụ ha na-enweta mmiri nke ọma. (Sheol h7585)
Kwa kuwa walikwenda chini pia pamoja nayo hata kuzimu, kwa wale waliokuwa wameuawa kwa upanga. Kulikuwa na jeshi lake imara, yale mataifa yalikuwa yakiishi kati kivuli chake. (Sheol h7585)
Ha onwe ha kwa, dịka sida ukwuu ahụ, sokwaara gbadaruo nʼala mmụọ, gakwuru ndị niile eji mma agha gbuo, ha na ndị ikom ji mma agha bụ ndị biri nʼokpuru ndo ya nʼetiti mba dị iche iche. (Sheol h7585)
Hodari wa wapiganaji katika Sheoli atasema kuhusu Misri na rafiki zake, 'Wameshuka chini hapa! Watalala pamoja na wasiotahiriwa, pamoja na wale waliokuwa wameuawa kwa upanga.' (Sheol h7585)
Ndị dike nke ndị ndu dike ga-esite nʼala mmụọ kwuo banyere Ijipt na ndị niile ha na ya dị na mma, ‘Ha arịdatala, ha na-edina ala ha na ndị a na-ebighị ugwu, nakwa ndị niile ahụ e ji mma agha gbuo.’ (Sheol h7585)
Wasilale pamoja mashujaa walioanguka wa wasiotahiriwa walioshuka chini kwa Sheoli pamoja na silaha zao zote za vita, na pamoja na panga zao zote walizoziweka chini ya vichwa vyao na maovu yao juu ya mifupa yao. Kwa kuwa walikuwa tishio kwa mashujaa katika nchi ya walio hai. (Sheol h7585)
Ugbu a, e likọọla ha na ndị a na-ebighị ugwu, bụ ndị dike nʼagha, ndị nwụrụ anwụ, ndị ji ngwa agha ha gbadaa nʼime ili ha, ndị e hinyere ngwa agha ha nʼokpuru isi ha, ebe ọta ha dịkwasịrị nʼọkpụkpụ mgbe e tinyere ha nʼili. Ma nʼezie, ndị a bụ dike nʼagha mere ka oke egwu dị nʼala ndị dị ndụ. (Sheol h7585)
Je, nitawaokoa na mkono wa kaburi? Je, nitawaokoa na kifo? Ewe Mauti yako wapi mapigo yako? Ewe kaburi kuko wapi kuharibu kwako? Huruma itafichwa na macho yangu. (Sheol h7585)
“Aga m anapụta ha site nʼike nke Ala mmụọ. Aga m agbapụta ha site nʼọnwụ. Gị ọnwụ, olee ebe ajọọ ọrịa gị niile na-efe efe dị? Gị ala mmụọ, olee ebe ike ịla nʼiyi gị dị? “Agaghị m enwe ọmịiko ọbụla, (Sheol h7585)
Hata kama watachimba kwenye Sheoli, kuna mkono wangu utawachukua. Hata kama watapanda juu kwenda mbingunu, huko nitawaleta chini. (Sheol h7585)
Ọ bụrụ na ha egwuo ala ruo nʼala mmụọ, site nʼebe ahụ ka aka m ga-esi dọlie ha, ọ bụrụkwa na ha arịgoruo ime eluigwe, site nʼebe ahụ ka m ga-esi wedata ha nʼala. (Sheol h7585)
Akasema, Nimemwita Bwana juu ya shida yangu naye akanijibu; kutoka tumbo la Kuzimu nililia kwa msaada! Uliisikia sauti yangu. (Sheol h7585)
Ọ sịrị, “Esitere m nʼahụhụ m kpọkuo Onyenwe anyị, ọ zakwara m. Nʼafọ ala mmụọ ka m si tikuo gị, ị nụkwara olu akwa m. (Sheol h7585)
Sababu mvinyo ni msaliti wa kijana mwenye kiburi ili kwamba asistahimili, lakini hukuza tamaa yake kama kaburi na, kama kifo, haitaweza kuridhishwa. Yeye anajikusanyia kila taifa na anakusanya kwaajili yake watu wote. (Sheol h7585)
Nʼezie, mmanya na-eduhie ya ụzọ, onye jupụtara na nganga, na-adịghị enwe ezumike. Ebe ọ bụ na o nwere anya ukwu dịka ala mmụọ, ọ gaghị enwekwa afọ ojuju dịka ọnwụ. Nʼihi na ọ na-achịkọta mba niile nye onwe ya, ọ na-adọtakwa ọtụtụ ndị mmadụ nʼagha. (Sheol h7585)
Lakini nawaambia yeyote amchukiaye ndugu yake atakuwa katika hatari ya hukumu. Na yeyote amwambiaye ndugu yake kuwa, 'Wewe ni mtu usiyefaa!' atakuwa katika hatari ya baraza. Na yeyote asemaye, 'Wewe mjinga!' atakuwa katika hatari ya moto wa jehanamu. (Geenna g1067)
Ma asị m unu, na onye ọbụla nke na-ewe iwe megide nwanna ya, na-enyefe onwe ya nʼaka ikpe. Onye ọbụla nke na-akpọ nwanna ya ‘Raka,’ ya bụ Onye iberiibe, ga-aza ajụjụ nʼụlọikpe. Ọzọkwa, onye ọbụla nke kpọrọ nwanne ya, ‘Onye nzuzu,’na-edo onwe ya ịba nʼọkụ ala mmụọ. (Geenna g1067)
Na kama jicho lako la kulia linakusababisha kujikwaa, ling'oe na ulitupe mbali nawe. Kwa kuwa ni afadhali kiungo kimoja katika mwili wako kiharibike kuliko mwili mzima kutupwa jehanamu. (Geenna g1067)
Nʼihi nke a, ọ bụrụ na anya aka nri gị na-eme ka i jehie, ghụpụ ya tufuo. Ọ kaara gị mma na i tufuru otu akụkụ ahụ gị baa nʼalaeze karịa na i ji ahụ zuruoke baa nʼọkụ ala mmụọ. (Geenna g1067)
Na kama mkono wako wa kuume unakusababisha kujikwaa, ukate kisha uutupilie mbali nawe. Maana ni afadhali kiungo kimoja katika mwili wako kiharibike kuliko mwili mzima kutupwa jehanamu. (Geenna g1067)
Ọ bụrụ na aka nri gị na-eme ka i jehie, gbupụ ya tufuo. Ọ kaara gị mma na i tufuru otu akụkụ ahụ gị ma baa nʼalaeze eluigwe, karịa na i ji ahụ zuruoke ma baa nʼọkụ ala mmụọ. (Geenna g1067)
Msiwaogope wale ambao wanaua mwili lakini hawana uwezo wa kuua roho. Badala yake, mwogopeni yule ambaye awezaye kuangamiza mwili na roho kule kuzimu. (Geenna g1067)
Unu atụla egwu ndị pụrụ igbu naanị anụ ahụ unu, ma ha enweghị ike ịmetụ mkpụrụobi unu aka. Kama onye unu ga-atụ egwu bụ Onye ahụ nwere ike imebi anụ ahụ unu na mkpụrụobi, tụbakwa ha nʼọkụ ala mmụọ. (Geenna g1067)
Wewe, Kapernaum, unadhani utainuliwa hadi mbinguni? Hapana utashushwa hadi chini kuzimu. Kama kwa Sodoma kungefanyika matendo makuu, kama yalifanyika kwako, ingekuwepo hadi leo. (Hadēs g86)
Ma gị Kapanọm bụ obodo a na-asọpụrụ, a ga-ebuli gị elu ruo eluigwe? Mba, ị ga-arịdaru ọkụ ala mmụọ. Nʼihi na a sị na a rụrụ ọrụ ebube m rụrụ nʼime gị nʼobodo Sọdọm, a garaghị ala ya nʼiyi. Ọ gaara adịrị ruo taa. (Hadēs g86)
Na yeyote asemaye neno kinyume cha Mwana wa Adamu, hilo atasamehewa. Lakini yeyote asemaye kinyume na Roho Mtakatifu, huyo hatasamehewa, katika ulimwengu huu, na wala ule ujao (aiōn g165)
Onye ọbụla nke ga-ekwu okwu megide Nwa nke Mmadụ, a ga-agbaghara ya, ma onye ọbụla na-ekwu megide Mmụọ Nsọ, agaghị agbaghara ya, nʼọgbọ a maọbụ nʼọgbọ nke na-abịa. (aiōn g165)
Aliyepandwa kati ya miti ya miiba, huyu ni yule alisikiaye neno lakini masumbuko ya ulimwengu na udaganyifu wa utajiri hulisonga lile neno lisije likazaa matunda. (aiōn g165)
Mkpụrụ nke dara nʼala ahụ ogwu ogwu dị nọchiri anya obi mmadụ onye nụrụ oziọma ahụ, ma ọchịchọ nke ụwa a, ya na itinye obi nʼakụ nke ụwa a, kpagidere okwu dị nʼime ya, mee ka ọ ghara ịmị mkpụrụ. (aiōn g165)
Na mavuno ni mwisho wa ulimwengu, na wavunaji ni malaika. (aiōn g165)
Onye iro ahụ gara kụọ mkpụrụ puru ahịhịa bụ ekwensu. Owuwe ihe ubi nọchiri anya ọgwụgwụ oge. Ndị owuwe ihe ubi bụkwa ndị mmụọ ozi. (aiōn g165)
Kama vile magugu yanavyo kusanywa na kuchomwa moto, hivyo ndivyo itakavyo kuwa mwisho wa ulimwengu. (aiōn g165)
“Dị ka e siri fopụtasịa ahịhịa ahụ kpọọ ha ọkụ, otu a ka ọ ga-adị mgbe ụwa ga-agwụ. (aiōn g165)
Itakuwa namna hii katika mwisho wa dunia. Malaika watakuja na kuwatenga watu waovu kutoka miongoni mwa wenye haki. (aiōn g165)
Otu a ka ọ ga-adị nʼọgwụgwụ oge. Ndị mmụọ ozi ga-abịa kewapụ ndị ọjọọ site nʼetiti ndị ezi omume, (aiōn g165)
Nami pia ninakwambia kuwa wewe ni Petro, na juu ya mwamba huu nitalijenga kanisa langu. Milango ya kuzimu haitalishinda. (Hadēs g86)
Ma mụ onwe m na-agwa gị, na gị onwe gị bụ Pita. Ọ bụkwa nʼelu nkume a ka m ga-ewu ụlọ chọọchị m. Ike niile nke ọkụ ala mmụọ apụghịkwa iguzo megide ya. (Hadēs g86)
kama mkono wako au mguu wako ukikusababishia kukwazika, ukate na uutupe mbali na wewe. Ni vizuri zaidi kwako wewe kuingia kwenye uzima ukiwa bila mkono au kilema, kuliko kutupwa kwenye moto wa milele ukiwa na mikono yote au miguu yote. (aiōnios g166)
Nʼihi nke a, ọ bụrụ na aka gị maọbụ ụkwụ gị na-eme ka i jehie, gbupụ ya tufukwaa ya. Ọ kaara gị mma inwe ọrụsị maọbụ daa ngwụrọ baa na ndụ, karịa na ị ga-enwe aka abụọ maọbụ ụkwụ abụọ, a tụnye gị nʼọkụ ebighị ebi. (aiōnios g166)
Kama jicho lako likikukwaza, uling`oe na ulitupe mbali na wewe. Ni vizuri zaidi kwako wewe uingie kwenye uzima na jicho moja, kuliko kutupwa kwenye moto wa milele ukiwa na macho yote. (Geenna g1067)
Ọzọ, ọ bụrụ na anya gị na-eme ka i jehie, ghụpụ ya tufuo. Ọ ga-akara gị mma na i nwere otu anya baa na ndụ, karịa inwe anya abụọ, a tụnye gị nʼọkụ ala mmụọ. (Geenna g1067)
Tazama mtu mmoja akaja kwa Yesu na kusema, “Mwalimu, ni kitu gani kizuri ninachotakiwa kufanya ili nipate kuwa na uzima wa milele?” (aiōnios g166)
Otu onye bịakwutere ya, jụọ ya ajụjụ sị, “Ezi onye ozizi, olee ezi ihe m ga-eme ka m keta ndụ ebighị ebi?” (aiōnios g166)
Kila mmoja wenu aliyeacha nyumba, kaka, dada, baba, mama, watoto, au shamba kwa ajili ya jina langu, atapokea mara mia na kuurithi uzima wa milele. (aiōnios g166)
Onye ọbụla hapụrụ ụlọ ya, na ụmụnne ya nwoke, na ụmụnne ya nwanyị, na nne ya na nna ya, na ụmụntakịrị ya, maọbụ ala o nwere, soro m, ga-anata dị ka ụgwọ ọrụ okpukpu narị ihe ọ hapụrụ, natakwa alaeze. Ọ ga-eketakwa ndụ ebighị ebi. (aiōnios g166)
Aliona mtini kandokando ya barabara. Akauendea, lakini hakupata kitu juu yake isipokuwa majani. Aliuambia, “Kusiwe na matunda kwako daima tena.” Na mara hiyo mtini ule ukanyauka. (aiōn g165)
Ọ hụrụ otu osisi fiig nke dị nʼakụkụ ụzọ. Mgbe o rutere nʼukwu ya, ọ hụghị ihe ọbụla nʼelu ya karịa naanị akwụkwọ ndụ. Ya mere, ọ sịrị ya, “Malite taa gaa nʼihu, ị gaghị amịkwa mkpụrụ ọzọ!” Otu mgbe ahụ kwa, osisi ahụ kpọnwụrụ. (aiōn g165)
Ole wenu Waandishi na Mafarisayo, wanafiki! Mnavuka ngambo ya bahari na kufika kumfanya mtu mmoja aamini yale mnayoyafundisha, na anapokuwa kama ninyi, mnamfanya mara mbili mwana wa jehanamu kama ninyi wenyewe mlivyo. (Geenna g1067)
“Ahụhụ ga-adakwasị unu ndị ozizi iwu na ndị Farisii, ndị ihu abụọ! Nʼihi na unu na-agafe oke osimiri na mba dị iche iche, ime ka otu onye chegharịa, bụrụ onye na-eso ụzọ unu. Ma mgbe unu mesịrị nke a, unu na-alaghachi mee ya okpukpu abụọ ka ọ bụrụ nwa ọkụ ala mmụọ karịa onwe unu. (Geenna g1067)
Enyi nyoka, wana wa vipiribao, kwa namna gani mtaikwepa hukumu ya jehanamu? (Geenna g1067)
“Ụmụ agwọ! Ụmụ ajụala! Unu si aṅaa chee na unu ga-agbanarị ikpe nke ịba nʼọkụ ala mmụọ? (Geenna g1067)
Na alipokaa katika Mlima wa Mizeituni, wanafunzi wake walimwendea kwa faragha na kusema, “Tuambie, mambo haya yatatokea lini? Kitu gani kitakuwa dalili ya kuja kwako na mwisho wa ulimwengu?” (aiōn g165)
Mgbe ọ nọdụrụ ala nʼelu Ugwu Oliv, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya iche, sị, “Gwa anyị, olee mgbe ihe ndị a ga-emezu? Gịnị ga-abụkwa ihe ịrịbama nke oge i ji alọghachi na nke ọgwụgwụ ụwa a?” (aiōn g165)
Ndipo atawaambia hao walio mkono wake wa kushoto, 'Ondokeni kwangu, mliolaaniwa, nendeni katika moto wa milele ulioandaliwa kwa ajili ya shetani na malaika zake, (aiōnios g166)
“Mgbe ahụ ọ ga-asịkwa ndị nọ nʼaka ekpe ya, ‘Pụọnụ nʼihu m unu ndị a bụrụ ọnụ. Baanụ nʼime ọdọ ọkụ ebighị ebi ahụ a kwadobeere ekwensu na ndị mmụọ ozi ya. (aiōnios g166)
Hawa watakwenda katika adhabu ya milele bali wenye haki katika uzima wa milele.” (aiōnios g166)
“Ndị a ga-aba nʼịta ahụhụ ebighị ebi. Ma ndị ezi omume ga-aba na ndụ ebighị ebi.” (aiōnios g166)
Wafundisheni kuyatii mambo yote niliyowaamuru, Na tazama, mimi niko pamoja nanyi daima, hata mpaka mwisho wa dunia. (aiōn g165)
Ziekwanụ ha ka ha na-eme ihe niile m nyere unu nʼiwu. Ma chetanụ na m na-anọnyere unu mgbe niile, ruo ọgwụgwụ oge.” (aiōn g165)
lakini yeyote atakaye mkufuru Roho Mtakatifu hatasamehewa kamwe, bali ana hatia ya dhambi ya milele”. (aiōn g165, aiōnios g166)
Ma onye ọbụla ga-ekwulu Mmụọ Nsọ, enweghị ike ịgbaghara ya. Ọ bụ onye ikpe mmehie ebighị ebi mara.” (aiōn g165, aiōnios g166)
lakini masumbufu ya dunia, udanganyifu wa mali, na tamaa za mambo mengine, huwaingia na kulisonga neno, na linashindwa kuzaa matunda. (aiōn g165)
ma nchekasị nke ndụ a, na nghọgbu nke akụnụba, na oke ọchịchọ, nakwa ihe ndị ọzọ na-abata, kpagbuo okwu ahụ, mee ka ọ ghara ịmị mkpụrụ. (aiōn g165)
Kama mkono wako ukikukosesha ukate. Ni heri kuingia katika uzima bila mkono kuliko kuingia kwenye hukumu ukiwa na mikono yote. Katika moto “usiozimika”. (Geenna g1067)
Ọ bụrụ na aka gị na-eme ka i jehie, gbupụ ya. Ọ ga-akara gị mma inwe ọrụsị baa na ndụ karịa inwe aka abụọ banye nʼọkụ ala mmụọ, ebe ọkụ ya na-adịghị anyụ anyụ; (Geenna g1067)
Kama mguu wako ukikukosesha, ukate. Ni vyema kwako kuingia uzimani ukiwa kilema, kuliko kutupwa hukumuni na miguu miwili. (Geenna g1067)
Ọ bụrụ na ụkwụ gị na-eme ka i jehie, gbupụ ya, tufukwaa ya, nʼihi na ọ ga-akara gị mma ịba na ndụ na ngwụrọ karịa inwe ụkwụ abụọ a tụnye gị nʼọkụ ala mmụọ; (Geenna g1067)
Kama jicho lako likikukosesha ling'oe. Ni vyema kwako kuingia katika Ufalme wa Mungu ukiwa na jicho moja, kuliko kuwa na macho mawili na kutupwa kuzimu. (Geenna g1067)
Ọ bụrụ na anya gị na-eme ka i jehie, ghụpụ ya. Ọ ga-akara gị mma na i nwere otu anya baa nʼalaeze Chineke, karịa inwe anya abụọ a tụnye gị nʼọkụ ala mmụọ, (Geenna g1067)
Na alipoanza safari yake mtu mmoja alimkimbilia na akapiga magoti mbele yake, akamwuliza, “Mwalimu Mwema, nifanye nini ili niweze kurithi uzima ya milele?” (aiōnios g166)
Mgbe ọ na-ebili njem, otu nwoke gbaara ọsọ bịa gbuo ikpere nʼihu ya. Ọ jụrụ ya sị, “Ezi onye ozizi ọma, gịnị ka m ga-eme ka m keta ndụ ebighị ebi?” (aiōnios g166)
ambaye hatapokea mara mia zaidi ya sasa hapa duniani: nyumba, kaka, dada, mama, watoto, na ardhi, kwa mateso, na ulimwengu ujao, uzima wa milele. (aiōn g165, aiōnios g166)
nke na-agaghị anataghachikwa nʼụwa a, ụlọ, ụmụnne ndị nwoke, ụmụnne ndị nwanyị, nne, ụmụaka na ala ubi, tinyere mkpagbu, ihe ruru okpukpu narị karịa ihe niile nke ọ hapụrụ. Ọ ga-anatakwa ndụ ebighị ebi nʼụwa ọzọ. (aiōn g165, aiōnios g166)
Aliuambia, “Hakuna yeyote atakayekula tunda kutoka kwako tena”. Na wanafunzi wake wakasikia. (aiōn g165)
Mgbe ahụ, ọ gwara osisi ahụ sị, “Ka mmadụ ọbụla ghara iri mkpụrụ sitere na gị ruo ebighị ebi.” Ndị na-eso ụzọ ya nụrụ mgbe o kwuru okwu a. (aiōn g165)
Atatawala juu ya ukoo wa Yakobo milele na ufalme wake hautakuwa na mwisho. (aiōn g165)
Ọ ga-achị ụlọ Jekọb ruo ebighị ebi, alaeze ya agaghị enwekwa ọgwụgwụ.” (aiōn g165)
(kama alivyosema kwa baba zetu) kwa Abrahamu na uzao wake milele.” (aiōn g165)
Dị ka ọ gwara nna nna anyị ha, nye Ebraham na ụmụ ụmụ ya ruo mgbe ebighị ebi.” (aiōn g165)
kama alivyosema kwa kinywa cha manabii wake waliokuweko katika nyakati za kale. (aiōn g165)
(Dị ka o kwuru na mgbe ochie, site nʼọnụ ndị amụma ya dị nsọ). (aiōn g165)
Wakaendelea kumsihi usituamuru twende kwenye shimo. (Abyssos g12)
Ha rịọsiri ya arịrịọ ike ka ọ ghara inye ha iwu ka ha banye nʼAbis. (Abyssos g12)
Wewe Kapernaumu, Unafikiri utainuliwa mpaka Mbinguni? Hapana, utashushwa chini mpaka kuzimu (Hadēs g86)
Ma gị Kapanọm! Ị na-eche na a ga-ebuli gị elu ruo eluigwe? Mba! Ị ga-arịda nʼala mmụọ! (Hadēs g86)
Tazama, mwalimu fulani wa sheria ya Kiyahudi alisimama na kumjaribu, akisema, “Mwalimu, nifanye nini niurithi izima wa milele?” (aiōnios g166)
Otu ụbọchị, otu onye ozizi iwu biliri ịnwale ya. Ọ jụrụ ya, “Onye ozizi, gịnị ka m kwesiri ime ka m keta ndụ ebighị ebi?” (aiōnios g166)
Lakini nitawaonya mtakaye mwogopa. Mwogopeni yule ambaye baada ya kuwa ameua, ana mamlaka ya kutupa jehanamu. Ndiyo, nawaambiani ninyi, mwogopeni huyo. (Geenna g1067)
Ma aga m ezi unu onye unu ga-atụ egwu. Tụọnụ egwu Onye ahụ nwere ikike igbu anụ ahụ ma tụbakwa ya nʼọkụ ala mmụọ. E, asị m unu tụọnụ ya egwu. (Geenna g1067)
Yule bwana akamsifu meneja dhalimu kwa vile alivyotenda kwa wereu. Kwakua watoto wa ulimwengu huu ni werevu nyingi na hushughulika kwa ujanja na watu wa upande wao kuliko walivyo watoto wa nuru. (aiōn g165)
“Nna ya ukwu toro onyeisi ọrụ ahụ na-ekwesighị ntụkwasị obi nʼihi na ọ kpara agwa dị ka onye nwere uche. Nʼihi na ụmụ, nke ọgbọ a, ji akọnuche na-eso ndị ọgbọ ha karịa ụmụ nke ìhè. (aiōn g165)
Nami nawaambia jifanyieni marafiki kwa mali ya udhalimu ili itakapokosekana wawakaribishe katika makao ya milele. (aiōnios g166)
Agwa m unu, jirinụ akụnụba nke ajọ omume metara onwe unu ndị enyi, ka ọ ga-abụ na mgbe ọ na-adịghịkwa akụ unu nwere, ha ga-anabata unu nʼụlọ obibi ha ebighị ebi. (aiōnios g166)
Na kule kuzimu alipokua katika mateso aliyainua macho yake akamuona Ibrahimu kwa mbali na Lazaro kifuani mwake. (Hadēs g86)
Nʼọkụ ala mmụọ ebe onye ọgaranya ahụ nọ nʼoke ihe mgbu, ọ hụrụ Ebraham ka ọ nọ nʼebe dị anya, hụkwa Lazarọs nʼakụkụ ya. (Hadēs g86)
Mtawala mmoja akamwuliza, akisema, 'Mwalimu mwema, nifanye nini ili niurithi uzima wa milele?' (aiōnios g166)
Otu onye ọchịchị jụrụ ya sị, “Ezi onye ozizi, ọ bụ gịnị ka m ga-eme keta ndụ ebighị ebi.” (aiōnios g166)
ambaye hatapokea mengi zaidi katika ulimwengu huu, na katika ulimwengu ujao, uzima wa milele. ' (aiōn g165, aiōnios g166)
nke na-agaghị anata ihe ndị a nʼọgbọ a, nwekwa ndụ ebighị ebi nʼọgbọ nke na-abịa.” (aiōn g165, aiōnios g166)
Yesu akawaambia, “Wana wa ulimwengu huu huoa na kuolewa. (aiōn g165)
Jisọs gwara ha, “Ndị nke ọgbọ a na-alụ nwunye, ma na-enyekwa ụmụ ha ka a lụrụ ha. (aiōn g165)
Lakini wale wanastaohili kupokea ufufuo wa wafu na kuingia uzima wa milele hawaoi wala hawaolewi. (aiōn g165)
Ma ndị ahụ a gụrụ dị ka ndị kwesiri isoro keta oke nʼọgbọ ahụ, nakwa na mbilite nʼọnwụ agaghị alụ di na nwunye. (aiōn g165)
ili kwamba wote watakaomwamini wapate uzima wa milele. (aiōnios g166)
Ka onye ọbụla kwere na ya nwee ndụ ebighị ebi.” (aiōnios g166)
Kwa maana jinsi hii Mungu aliupenda ulimwengu, kwamba akamtoa mwanae wa pekee, ili kwamba mtu yeyote amwaminiye asiangamie bali awe na uzima wa milele. (aiōnios g166)
Nʼihi na Chineke hụrụ ụwa nʼanya, nke a mere o jiri nye Ọkpara ọ mụrụ naanị ya, ka onye ọbụla kweere na ya ghara ịla nʼiyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi. (aiōnios g166)
Yeye amwaminiye Mwana anao uzima wa milele, lakini kwa yeye asiye mtii Mwana hatauona uzima, bali ghadhabu ya Mungu hushikamana juu yake. (aiōnios g166)
Onye ọbụla kwere nʼỌkpara ahụ nwere ndụ ebighị ebi, ma onye ọbụla jụrụ Ọkpara ahụ agaghị ahụ ndụ nʼihi na iwe Chineke ga-adịrị ya.” (aiōnios g166)
lakini yeye atakaye kunywa maji nitakayompa hatapata kiu tena. Badala yake maji nitakayompa yatakuwa chemchemi inayobubujika hata milele.” (aiōn g165, aiōnios g166)
Ma onye ọbụla ga-aṅụ mmiri ahụ m nyere ya, akpịrị agaghị akpọkwa ya nkụ ọzọ. Nʼeziokwu, mmiri ahụ m nyere ya ga-aghọrọ ya isi iyi nke na-asọpụtara ya ndụ ebighị ebi.” (aiōn g165, aiōnios g166)
Yeye avunaye hupokea mishahara na kukusanya matunda kwa ajili ya uzima wa milele, ili kwamba yeye apandaye naye avunaye wafurahi pamoja. (aiōnios g166)
Ọ bụladị ugbu a, onye na-aghọ mkpụrụ na-anata ụgwọ ọrụ, ọ na-achịkọta mkpụrụ ahụ maka ndụ ebighị ebi, ka onye ghara mkpụrụ na onye ghọrọ ya nwee ike ịṅụrịkọta ọṅụ. (aiōnios g166)
Amini, amini, yeye asikiaye neno langu na kumwamini yeye aliyenituma anao uzima wa milele na hatahukumiwa. Badala yake, amepita kutoka mautini na kuingia uzimani. (aiōnios g166)
“Nʼezie, nʼezie agwa m unu, onye ọbụla na-anụ okwu m ma kwerekwa nʼonye zitere m nwere ndụ ebighị ebi, a gaghị amakwa ya ikpe, ọ gafeela site nʼọnwụ banye na ndụ. (aiōnios g166)
Mnayachunguza maandiko mkidhani ndani yake mna uzima wa milele, na hayo maandiko yanashuhudia habari zangu na (aiōnios g166)
Unu na-enyocha akwụkwọ nsọ nʼihi na unu chere na unu ga-esite na ha nwee ndụ ebighị ebi maọbụ ha na-agba ama banyere m. (aiōnios g166)
Acheni kukifanyia kazi chakula chenye kuharibika, bali mkifanyie kazi chakula kidumucho hata milele kile ambacho mwana wa Adamu atawapa, kwa kuwa Mungu Baba ameweka muhuri juu yake.” (aiōnios g166)
Unu adọgbula onwe unu maka nri nke na-emebi emebi, kama maka nri nke na-adịgide ruo ndụ ebighị ebi, bụ nke Nwa nke Mmadụ ga-enye unu. Nʼihi na Chineke Nna akakwasịla ya akara nkwado ya.” (aiōnios g166)
Kwa kuwa haya ndiyo mapenzi ya Baba yangu, kwamba yeyote amtazamaye Mwana na kumwamini apate uzima wa milele; nami nitamfufua siku ya mwisho. (aiōnios g166)
Nke a bụ uche nke Nna m, na onye ọbụla lere Ọkpara ahụ anya, kwerekwa na ya ga-enweta ndụ ebighị ebi, m ga-emekwa ka o bilie nʼụbọchị ikpeazụ.” (aiōnios g166)
Amini, amini yeye aaminiye anao uzima wa milele. (aiōnios g166)
Nʼeze, nʼezie agwa m unu, onye ọbụla kwerenụ nwere ndụ ebighị ebi. (aiōnios g166)
Mimi ni mkate uishio ambao umeshuka kutoka mbinguni. Kama mtu yeyote akila sehemu ya mkate huu, ataishi milele. Mkate nitakao utoa ni mwili wangu kwa ajili ya uzima wa ulimwengu.” (aiōn g165)
Abụ m achịcha dị ndụ nke siri nʼeluigwe bịa. Ọ bụrụ na onye ọbụla erie achịcha a, ọ ga-adị ndụ ruo ebighị ebi. Nri a bụ anụ ahụ m, nke m ga-enye maka ndụ nke ụwa.” (aiōn g165)
Yeyote aulaye mwili wangu na kuinywa damu yangu anao uzima wa milele, nami nitamfufua siku ya mwisho. (aiōnios g166)
Onye ọbụla riri anụ ahụ m, ṅụọkwa ọbara m nwere ndụ ebighị ebi. A ga m akpọlitekwa ya nʼụbọchị ikpeazụ ahụ. (aiōnios g166)
Huu ndio mkate ushukao kutoka mbinguni, sio kama vile mababa walivyo kula wakafa. Yeye aulaye mkate huu ataishi milele. (aiōn g165)
Nke a bụ achịcha ahụ si nʼeluigwe bịa. Nna nna unu ha riri mánà ma nwụkwaa, ma onye ọbụla na-eri achịcha a ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.” (aiōn g165)
Simoni Petro akamjibu, “Bwana twende kwa nani kwani wewe unayo maneno ya uzima wa milele, (aiōnios g166)
Saimọn Pita zara ya sị, “Onyenwe anyị, onye ka anyị ga-agakwuru? Ọ bụ gị ji okwu nke ndụ ebighị ebi. (aiōnios g166)
Mtumwa hakai nyumbani wakati wote; mwana hudumu siku zote. (aiōn g165)
Ohu enwekwaghị ọnọdụ mgbe ọbụla nʼezinaụlọ, ma ọkpara nwere ọnọdụ ruo ebighị ebi. (aiōn g165)
Amini, amini, nawaambia, iwapo yeyote atalishika neno langu, hataona mauti kamwe.” (aiōn g165)
Nʼezie, nʼezie, agwa unu, onye ọbụla na-edebe okwu m agaghị anwụ ọzọ.” (aiōn g165)
Wayahudi wakamwambia, “Sasa tumejua kuwa una pepo. Abrahamu na mabii walikufa; lakini unasema, 'Ikiwa mtu atalishika neno langu, hataonja mauti'. (aiōn g165)
Mgbe ahụ ndị Juu sịrị ya, “Anyị maara ugbu a na mmụọ ọjọọ bi nʼime gị. Ebraham nwụrụ anwụ ya na ndị amụma, ma gị onwe gị na-asị na onye ọbụla kwere na gị agaghị anwụ ruo mgbe ebighị ebi. (aiōn g165)
Tangu kuanza kwa Ulimwengu haijawahi kamwe kusikiwa kwamba yeyote ameyafumbua macho ya mtu aliyezaliwa kipofu. (aiōn g165)
Site na mgbe e kere ụwa, ọ dịbeghị onye a nụrụ na o meghere anya onye kpuru ìsì. (aiōn g165)
Nimewapa uzima wa milele; hawataangamia kamwe, na hakuna hata mmoja atakayewanyakuwa kutoka mkononi mwangu. (aiōn g165, aiōnios g166)
Ana m enye ha ndụ ebighị ebi. Ha agaghị ala nʼiyi. Mmadụ ọbụla enwekwaghị ike ịpụnarị ha nʼaka m. (aiōn g165, aiōnios g166)
na yeye aishiye na kuniamini mimi hatakufa. Unaamini hili?” (aiōn g165)
Ma onye ọbụla dị ndụ nke na-ekwere na m agaghị anwụ. Ị kwere nke a?” (aiōn g165)
Yeye apendaye uhai wake ataupoteza; bali yeye auchukiaye uhai wake katika ulimemngu huu atausalimisha hata uzima wa milele. (aiōnios g166)
Ndị ọbụla hụrụ ndụ ha nʼanya ga-atụfu ya, ebe ndị ọbụla kpọrọ ndụ ha asị nʼụwa a, ga-edebe ya ruo mgbe ebighị ebi. (aiōnios g166)
Mkutano wakamjibu, “Sisi tumesikia katika sheria ya kwamba Kristo atadumu hata milele. Nawe wasemaje, 'Mwana Adamu lazima ainuliwe juu'? Huyu Mwana wa Mtu ni nani?” (aiōn g165)
Igwe mmadụ ahụ zara ya, “Anyị anụla site nʼakwụkwọ iwu na Kraịst ahụ ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. Ma gịnị mere i ji asị na, ‘A ghaghị iweli Nwa nke Mmadụ elu’? Onye bụ ‘Nwa nke mmadụ a’?” (aiōn g165)
Nami najua ya kuwa agizo lake ni uzima wa milele; basi hayo ninenayo mimi - kama Baba alivyoniambia, ndivyo ninenavyo kwao.” (aiōnios g166)
Ama m na iwu ya bụ ndụ ebighị ebi, nʼihi ya, ihe ọbụla Nna gwara m ka m na-ekwu.” (aiōnios g166)
Petro akamwambia, “Hutaniosha miguu yangu kamwe.” Yesu akamjibu, “Ikiwa sitakuosha, hutakuwa na sehemu pamoja nami.” (aiōn g165)
Pita sịrị ya, “Ị gaghị asaa m ụkwụ ma ọlị.” Jisọs zara ya, “Ọ bụrụ na m asachaghị gị ụkwụ, mụ na gị enweghị oke ọbụla.” (aiōn g165)
Na nitamwomba Baba, Naye atawapa Msaidizi mwingine ili kwamba aweze kuwa pamoja nanyi milele, (aiōn g165)
Aga m arịọ Nna m, ọ ga-enye unu Onye Nkasiobi ọzọ, onye ga-enyere unu aka ma nọnyekwara unu ruo mgbe niile ebighị ebi. (aiōn g165)
kama vile ulivyompatia mamlaka juu ya vyote vyenye mwili ili awape uzima wa milele wale wote uliompatia. (aiōnios g166)
I nyela ya ikike nʼebe mmadụ niile nọ, na ike inye ndị niile i nyere ya ndụ ebighị ebi. (aiōnios g166)
Huu ndio uzima wa milele: kwamba wakujue wewe, Mungu wa kweli na wa pekee, na yeye uliyemtuma, Yesu Kristo. (aiōnios g166)
Nke a bụkwa ndụ ebighị ebi ahụ. Ka ha mata na naanị gị bụ Chineke nʼezie, matakwa Jisọs Kraịst onye ahụ i zitere nʼụwa. (aiōnios g166)
Hutaiacha nafsi yangu iende kuzimu, wala hutaruhusu Mtakatifu wako kuona uozo. (Hadēs g86)
nʼihi na ị gaghị ahapụ mkpụrụobi m nʼala mmụọ, ị gakwaghị ahapụ anụ ahụ nke Onye gị dị nsọ ka ọ hụ ire ure. (Hadēs g86)
Aliliona hili mapema, na akasema kuhusu ufufuo wa Kristo, 'wala alikuwa hakuachwa kuzimu, wala mwili wake haukuoza.' (Hadēs g86)
Ebe o buuru ụzọ hụ ihe ga-eme nʼoge dị nʼihu, o kwuru banyere mbilite nʼọnwụ nke Kraịst, mgbe ọ sịrị, a hapụghị ya nʼala mmụọ; anụ ahụ ya ahụghịkwa ire ure. (Hadēs g86)
Yeye ndiye ambaye lazima mbingu zimpokee mpaka wakati wa kurejeshwa kwa vitu vyote, ambavyo Mungu alizungumzia zamani za kale kwa vinywa vya manabii watakatifu. (aiōn g165)
Onye eluigwe na-aghaghị ịnabata tutu ruo oge ahụ Chineke ga-eweghachi ihe niile nʼọnọdụ ha, dịka o kwere na nkwa nʼogologo oge gara aga site nʼọnụ ndị amụma ya dị nsọ. (aiōn g165)
Lakini Paulo na Barnaba waliongea kwa ujasiri na kusema, “Ilikuwa ni muhimu kwamba neno la Mungu liongelewe kwanza kwenu. Kwa kuwa mnalisukumia mbali kutoka kwenu nakujiona kuwa hamkusitahili uzima wa milele, angalieni tutawageukia Mataifa. (aiōnios g166)
Ma Pọl na Banabas kwuru okwu na-asọghị anya sị, “Ọ dị mkpa na anyị buuru ụzọ gwa unu okwu nke Chineke, ma ebe ọ bụ na unu jụrụ ịnabata ya, na-echekwa na unu ekwesighị inweta ndụ ebighị ebi, lee, anyị ga-agakwuru ndị mba ọzọ. (aiōnios g166)
Mataifa waliposikia hili, walifurahi na kulisifu neno la Bwana. Wengi waliochaguliwa kwa uzima wa milele waliamini. (aiōnios g166)
Mgbe ndị mba ọzọ nụrụ ihe ndị a, obi tọrọ ha ụtọ, ha sọpụkwara okwu nke Onyenwe anyị. Ya mere ndị niile a họpụtara inweta ndụ ebighị ebi bụ ndị kwenyerenụ. (aiōnios g166)
Hivi ndivyo asemavyo Bwana aliyefanya mambo haya yajulikanayo tangu enzi za zamani. (aiōn g165)
Nke a amaara site na mgbe ochie. (aiōn g165)
Maana mambo yake yasioonekana vizuri yamekuwa wazi tangu kuumbwa kwa ulimwengu. Yanaeleweka kupitia vitu vilivyoumbwa. Mambo haya ni uwezo wake wa milele na asili ya uungu. Matokeo yake, watu hawa hawana udhuru. (aïdios g126)
Nʼihi na site nʼoge Chineke kere ụwa na ihe niile dị nʼime ya, ụdịdị ya nke a na-apụghị ịhụ anya na ike nke ebighị ebi ya na ụdịdị ịdị nsọ ya ka e mere ka ọ pụta ìhè nye ụmụ mmadụ. Ụmụ mmadụ na-aghọta ihe ndị a site nʼihe ndị e kere eke. Nʼihi nke a ụmụ mmadụ enwekwaghị ngọpụ. (aïdios g126)
Ni wao walioibadili kweli ya Mungu kuwa uongo, na ambao waliabudu na kutumikia viumbe badala ya Muumbaji, ambaye anasifiwa milele. Amina. (aiōn g165)
Ha were okwu ụgha dochie nʼọnọdụ eziokwu banyere Chineke. Ha na-asọpụrụ, na-efekwa ihe e kere eke, ma hapụ Onye okike, onye a na-eto ruo ebighị ebi. Amen. (aiōn g165)
kwa wale ambao kwa uthabiti wa matendo mema wametafuta sifa, heshima na kutokuharibika, atawapa uzima wa milele. (aiōnios g166)
Chineke ga-enye ndị niile sitere na ntachiobi na ezi ọrụ na-achọ otuto na nsọpụrụ na ndụ ahụ na-adịgide adịgide bụ ndụ ebighị ebi. (aiōnios g166)
Hii ilitokea ili kwamba, kama dhambi ilivyotawala katika kifo, ndivyo hata neema inaweza kutawala kupitia haki kwa ajili ya maisha ya milele kupitia Yesu Kristo Bwana wetu. (aiōnios g166)
Ya mere, dịka mmehie si bụrụ eze nʼọnwụ, otu a kwa ka amara ga-esi bụrụ eze site nʼezi omume iweta ndụ ebighị ebi site nʼaka Jisọs Kraịst, Onyenwe anyị. (aiōnios g166)
Lakini kwa kuwa sasa mmefanywa huru mbali na dhambi na mmefanyika watumwa kwa Mungu, mna tunda kwa ajili ya utakaso. Tokeo ni uzima wa milele. (aiōnios g166)
Ugbu a, e meela ka unu nwere onwe unu site na mmehie. Unu aghọọla ndị ohu Chineke. Uru unu na-erita bụ ịdị nsọ, ọgwụgwụ ya bụkwa ndụ ebighị ebi. (aiōnios g166)
Kwa kuwa mshahara wa dhambi ni mauti, bali zawadi ya bure ya Mungu ni uzima wa milele katika Kristo Yesu Bwana wetu. (aiōnios g166)
Nʼihi na ụgwọ ọrụ mmehie bụ ọnwụ, ma onyinye amara Chineke na-enye nʼefu, bụ ndụ ebighị ebi, site na Jisọs Kraịst Onyenwe anyị. (aiōnios g166)
Wao ni watangulizi ambako Kristo amekuja kwa heshima kuvaa mwili huu - ambaye yeye ni Mungu wa vyote. Naye asifiwe milele. Amina. (aiōn g165)
Ha si nʼagbụrụ nna nna anyị ochie ha. Kraịst nʼonwe ya, nʼụdịdị mmadụ, sikwa nʼagbụrụ ha pụta, onye bụ Chineke nke ihe niile, onye a na-eto ruo ebighị ebi. Amen. (aiōn g165)
Na usiseme, 'Nani atashuka katika shimo?”' (Hii ni, kumleta Kristo juu kutoka kwa wafu). (Abyssos g12)
“maọbụ, ‘Onye ga-arịda nʼime ili?’” (nke a bụ, ịkpọlite Kraịst site na ndị nwụrụ anwụ). (Abyssos g12)
Maana Mungu amewafunga watu wote katika uasi, ili aweze kuwahurumia wote. (eleēsē g1653)
Nʼihi na Chineke enyefeela onye ọbụla nʼaka nnupu isi, ka o si otu a gosi mmadụ niile obi ebere ya. (eleēsē g1653)
Kwa maana kutoka kwake, na kwa njia yake na kwake, vitu vyote vipo. Kwake uwe utukufu milele. Amina. (aiōn g165)
Nʼihi na ihe niile sitere nʼime ya, sitekwa nʼaka ya, dịkwara ya. Ọ bụ ya ka otuto dịrị ruo mgbe niile ebighị ebi! Amen. (aiōn g165)
Wala msiifuatishe namna ya dunia hii, bali mgeuzwe kwa kufanywa upya nia zenu. Fanyeni hivi mpate kujua mapenzi ya Mungu yaliyo mema, yakumpendeza na kamilifu. (aiōn g165)
Unu eyila ụwa nke a, kama bụrụnụ ndị enwoghara site nʼịgbanwe uche unu. Mgbe ahụ, unu ga-enwe ike nwapụta ihe bụ uche Chineke na ihe ọ na-achọ, nke bụ ezi ihe, nke na-atọ ya ụtọ na nke zukwara oke. (aiōn g165)
Sasa kwake yeye aliye na uwezo kufanya msimame kulingana na injili na mafundisho ya Yesu Kristo, kulingana na ufunuo wa siri iliyofichwa kwa muda mrefu, (aiōnios g166)
Ana m enyefe unu nʼaka onye ahụ pụrụ ime ka unu guzosie ike site nʼoziọma m kwusaara unu, nakwa nkwupụta nke Jisọs Kraịst, dịka mkpughe nke ihe omimi ahụ e zoro ezo kemgbe ọtụtụ ọgbọ ndị gara aga siri dị. (aiōnios g166)
lakini sasa imekwisha funuliwa na kufanywa kujulikana na maandiko ya unabii kulingana na amri ya Mungu wa milele, kwa utii wa imani miongoni mwa mataifa yote? (aiōnios g166)
Ma ugbu a, e kpugheela ya, mee ka ọ pụta ìhè site nʼihe ndị amụma dere nʼakwụkwọ nsọ, ka ndị mba ọzọ niile maara ya dịka ihe Chineke ebighị ebi nyere nʼiwu ya si dị, ka ha mụta irube isi nke na-esite nʼokwukwe. (aiōnios g166)
Kwa Mungu pekee mwenye hekima, kupitia Yesu Kristo, kuwe na utukufu milele yote. Amina (aiōn g165)
Ka otuto na nsọpụrụ dịrị Chineke, onye naanị ya bụ onye amamihe, ruo mgbe ebighị ebi, site na Jisọs Kraịst. Amen. (aiōn g165)
Yuko wapi mtu mwenye busara? Yuko wapi mwenye elimu? Yuko wapi msemaji mshawishi wa dunia hii? Je, Mungu hakuigeuza hekima ya dunia hii kuwa ujinga? (aiōn g165)
Olee ebe ndị oke amamihe nọ? Olee ebe ndị ode akwụkwọ nọ? Olee ebe ndị oke ịrụ ụka nke oge a nọ? Chineke o mebeghị ka amamihe nke ụwa a bụrụ ihe efu? (aiōn g165)
Sasa tunaizungumza hekima miongoni mwa watu wazima, lakini si hekima ya dunia hii, au ya watawala wa nyakati hizi, ambao wanaopita. (aiōn g165)
Ma otu ọ dị, anyị na-ekwu okwu amamihe nʼebe ndị tozuru oke nọ. Ma ọ bụghị amamihe nke oge a, maọbụ nke ndị na-achị ụwa taa, bụ ndị na-aghaghị ịla nʼiyi. (aiōn g165)
Badala yake, tunaizungumza hekima ya Mungu katika ukweli uliofichika, hekima iliyofichika ambayo Mungu aliichagua kabla ya nyakati za utukufu wetu. (aiōn g165)
Kama anyị na-ekwu okwu amamihe nke Chineke nʼụzọ dị omimi, bụ amamihe Chineke zonarịrị ụmụ mmadụ site na mbụ, nke Chineke kara aka tupu e kee ụwa na a ga-ekpughe ya nʼoge a maka iwetara anyị otuto. (aiōn g165)
Hakuna yeyote wa watawala wa nyakati hizi aliyeijua hekima hii, Kama wangeifahamu katika nyakati zile, wasingelimsulubisha Bwana wa utukufu. (aiōn g165)
O nweghị onye ọbụla nʼime ndị ọchịchị nke ọgbọ a ghọtara ihe banyere nzube a. Nʼihi na ọ bụrụ na ha maara ya, ha agaraghị akpọgbu Onyenwe otuto ahụ nʼobe. (aiōn g165)
Mtu asijidanganye mwenyewe, kama yeyote miongoni mwenu anadhani ana hekima katika nyakati hizi, awe kama “mjinga” ndipo atakuwa na hekima. (aiōn g165)
Ka onye o bụla ghara ịghọgbu onwe ya, ọ bụrụ na onye ọbụla nʼime unu na-eche nʼobi ya na ya bụ onye maara ihe, dịka ihe ọmụma nke ụwa si dị, ọ ga-akara onye ahụ mma ime onwe ya onye nzuzu, ka o nwe ike bụrụ onye maara ihe. (aiōn g165)
Kwa hiyo, ikiwa chakula kinasababisha kumkwaza kaka au dada, sitakula nyama kamwe, ili nisimsababishe kaka au dada yangu kuanguka. (aiōn g165)
Nʼihi nke a, ọ bụrụ na ihe oriri ga-eme ka nwanna m mee mmehie, agaghị m eri anụ ọzọ, ka m ghara ime ka nwanna m maa nʼọnya. (aiōn g165)
Basi mambo hayo yalitendeka kama mifano kwetu. Yakaandikwa ili kutuonya sisi - tuliofikiliwa na miisho ya zamani. (aiōn g165)
Ihe ndị a niile dakwasịrị ha ka ọ bụrụ ihe ilere anya nye anyị. E dekwara ha nʼakwụkwọ ka ha bụrụ anyị ihe ịdọ aka na ntị nʼihi na anyị bi nʼoge a mgbe ọgwụgwụ ihe niile dị nso. (aiōn g165)
“Kifo, ushindi wako uko wapi? Kifo, uko wapi uchungu wako?” (Hadēs g86)
“Ọnwụ, olee ebe mmeri gị dị? Ọnwụ, olee ebe ihe ụfụ gị dị?” (Hadēs g86)
Katika uchaguzi wao, mungu wa ulimwengu huu amewapofusha fahamu zao zisizoamini. Matokeo yake, hawawezi kuona nuru ya injili ya utukufu wa Kristo, ambaye ni mfano wa Mungu. (aiōn g165)
Nʼebe ha nọ, chi nke ụwa a ekpuchiela uche ndị na-ekweghị ekwe iji gbochie ha ịhụ ìhè nke oziọma ahụ na-ezipụta ebube Kraịst, onye dị nʼụdị Chineke nʼonwe ya. (aiōn g165)
Kwa kipindi hiki kifupi, mateso haya mepesi yanatuandaa sisi kwa ajili ya umilele mzito wa utukufu uzidio vipimo vyote. (aiōnios g166)
Nwantịntị ahụhụ nke anyị na-ata ugbu a, nke na-adị nwa oge, na-akwadoro anyị otuto ebighị ebi dị ukwuu. (aiōnios g166)
Kwa kuwa hatutazami kwa ajili ya vitu ambavyo vinaonekana, bali kwa ajili ya vitu visivyoonekana. Vitu tunavyoweza kuviona ni vya muda tu, bali vitu ambayo havionekani ni vya milele. (aiōnios g166)
Nʼihi na anyị adịghị ele ihe anya nwere ike ịhụ, kama anyị na-ele anya nʼihe ahụ anya na-adịghị ahụ. Nʼihi na ihe ahụ anya na-ahụ na-adị naanị nwa oge, ma ihe ahụ anya na-adịghị ahụ na-adị ruo mgbe ebighị ebi. (aiōnios g166)
Tunajua kwamba kama maskani ya ulimwenguni ambayo tunaishi humo yanaharibiwa, tunalo jengo kutoka kwa Mungu. Ni nyumba isiyotengenezwa kwa mikono ya wanadamu, bali ni nyumba ya milele, katika mbingu. (aiōnios g166)
Nʼihi na anyị ma nke ọma na mgbe e mebiri ụlọ ikwu nke anyị bi nʼime ya, bụ ụlọ nke ụwa a, anyị nwere ụlọ nke sitere na Chineke, ụlọ nke ejighị aka wuo, ga-adị ebighị ebi nʼeluigwe. (aiōnios g166)
Ni kama ilivyoandikwa: “Ametapanya utajiri wake na kuutoa kwa maskini. Haki yake yadumu milele.” (aiōn g165)
Dịka e dere ya, “Ọ gbasara onyinye ya ebe niile nye ndị ogbenye; ezi omume ya na-adịgidekwa ruo mgbe ebighị ebi.” (aiōn g165)
Mungu na Baba wa Bwana Yesu, yeye ambaye anatukuzwa milele, anajua kwamba mimi sidanganyi. (aiōn g165)
Chineke, na Nna nke Onyenwe anyị Jisọs, onye e kwesiri ito aha ya ruo mgbe ebighị ebi, maara na ihe ndị a niile m na-ekwu bụ eziokwu. (aiōn g165)
aliyejitoa mwenyewe kwa ajili ya dhambi zetu ili kwamba atukomboe na nyakati hizi za uovu, kutokana na mapenzi ya Mungu wetu na Baba. (aiōn g165)
Onye nyere onwe ya nʼihi mmehie anyị niile dị ka nzube Chineke bụ Nna anyị si dị, ịzọpụta anyị site nʼoge ọjọọ a nke anyị bi nʼime ya. (aiōn g165)
Kwake uwe utukufu milele na milele. (aiōn g165)
Onye otuto dịịrị ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen. (aiōn g165)
Kila apandaye mbegu katika asili yake ya dhambi atavuna uharibifu, lakini yeye apandaye mbegu katika Roho, atavuna uzima wa milele kutoka kwa Roho. (aiōnios g166)
Ọ bụrụ na mmadụ akụọ mkpụrụ nke anụ ahụ, ọ ga-esikwa nʼanụ ahụ ghọta mmebi, ma ọ bụrụ na mmadụ akụọ mkpụrụ nke Mmụọ, ọ ga-esitekwa na Mmụọ ghọta ndụ ebighị ebi. (aiōnios g166)
Alimketisha Kristo juu mbali na utawala, mamlaka, nguvu, enzi, na kila jina litajwalo. Alimketisha Yesu si tu kwa wakati huu lakini kwa wakati ujao pia. (aiōn g165)
Ọnọdụ ya dị elu karịa ọchịchị niile, na ikike ọchịchị niile, na ike niile na ịchị isi niile, na aha ọkwa ọchịchị nke e nwere ike inye mmadụ, ọ bụghị naanị nʼọgbọ a, kama ma nʼọgbọ ọzọ na-abịa. (aiōn g165)
Ilikuwa katika haya kwamba kwanza mlienenda kulingana na nyakati za ulimwengu huu. Mlikuwa mkienenda kwa kufuata mtawala wa mamlaka ya anga. Hii ndiyo roho yake yule afanyaye kazi katika wana wa kuasi. (aiōn g165)
Nke unu biri ndụ nʼime ha mgbe unu na-agbaso ụzọ niile nke ụwa a, na ụzọ onye ọchịchị nke alaeze ikuku, bụ mmụọ ahụ na-arụ ọrụ ugbu a na ndụ ndị ahụ na-enupu isi. (aiōn g165)
Alifanya hivi ili katika nyakati zijazo aweze kutuonesha utajiri mkuu wa neema yake. Hutuonesha sisi hili kwa njia ya wema wake ndani ya Kristo Yesu. (aiōn g165)
O mere nke a igosi ọgbọ nke na-abịa, ịdị ukwuu nke akụ amara ya, nke o sitere nʼobiọma ya gosi anyị nʼime Kraịst Jisọs. (aiōn g165)
inanipasa kuwaangazia watu wote juu ya nini ni mpango wa Mungu wa siri. Huu ni mpango ambao ulikuwa umefichwa kwa miaka mingi iliyopita, na Mungu ambaye aliviumba vitu vyote. (aiōn g165)
meekwa ka mmadụ niile hụ ihe bụ atụmatụ nke ihe omimi e zoro nʼime Chineke onye kere ihe niile, ọtụtụ afọ. (aiōn g165)
Haya yangetokea kupitia mpango wa milele ambao aliukamilisha ndani ya Kristo Yesu Bwana wetu. (aiōn g165)
Nke a bụ nʼusoro nke atụmatụ ya dị ebighị ebi, nke e mezuru nʼime Jisọs Kraịst Onyenwe anyị, (aiōn g165)
kwake yeye kuwe utukufu ndani ya kanisa na katika Kristo Yesu kwa vizazi vyote milele na milele. Amina. (aiōn g165)
ọ bụ ya ka otuto dịrị nʼime chọọchị na nʼime Kraịst Jisọs ruo ọgbọ niile nke mgbe niile, ebighị ebi ruo ebighị ebi. Amen. (aiōn g165)
kwa kuwa vita yetu si ya damu na nyama, bali ni dhidi ya falme na mamlaka ya roho na watawala wa ulimwengu wa uovu na giza, dhidi ya pepo katika sehemu za mbingu. (aiōn g165)
Nʼihi na ndị anyị na-alụso ọgụ abụghị ndị mmadụ efu nwere anụ ahụ na ọbara, kama ọ bụ megide ndịisi ha niile, megide ịchị isi niile, megide ike usuu mmụọ ọjọọ nke ike ụwa ọchịchịrị a, megidekwa mmụọ ajọ ihe niile nọ nʼebe dị elu nke eluigwe. (aiōn g165)
Sasa kwa Mungu na Baba yetu uwe utukufu milele na milele. Amina. (aiōn g165)
Ka otuto dịrị Chineke anyị, bụ Nna anyị, ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen. (aiōn g165)
Huu ni ukweli wa siri iliyokuwa imefichwa kwa miaka mingi na kwa vizazi. Lakini sasa imefunuliwa kwa wote waaminio katika Yeye. (aiōn g165)
Nke bụ ihe omimi ahụ, nke e zoro ezo site nʼoge ahụ nakwa ọgbọ niile ndị a gara aga, ma ugbu a e mekwara ka ọ pụta ìhè nye ndị nsọ Chineke. (aiōn g165)
Watateseka kwa maangamizi ya milele wakiwa wametengwa na uwepo wa Bwana na utukufu wa nguvu zake. (aiōnios g166)
Ndị a ga-ata ahụhụ mbibi ruo ebighị ebi, ebe ha na-agaghị ahụ ihu Onyenwe anyị na ebube nke ike ya, (aiōnios g166)
Sasa, Bwana wetu Yesu Kristo mwenyewe, na Mungu Baba yetu aliyetupenda na kutupa faraja ya milele na ujasiri mwema kwa ajili ya maisha yajayo kupitia neema, (aiōnios g166)
Ka Onyenwe anyị Jisọs Kraịst nʼonwe ya, na Chineke Nna anyị, onye hụrụ anyị nʼanya, site nʼamara ya nye anyị agbamume dị ebighị ebi na ezi olileanya, (aiōnios g166)
Lakini kwa sababu hii mimi nilipewa rehema ili kwamba ndani yangu mimi, awali ya yote, Kristo Yesu adhihirishe uvumilivu wote. Alifanya hivyo kama kielelezo kwa wote watakaomtumaini Yeye kwa ajili ya uzima wa milele. (aiōnios g166)
Ọ bụ nʼihi nke a ka e ji gosi m ebere, ka Kraịst Jisọs site nʼime m, bụ onye kachasị dị njọ, gosi enweghị ọgwụgwụ nke ntachiobi ya, ka m bụrụ ihe nlere anya nye ndị ahụ niile ga-ekwere na ya, ma nata ndụ ebighị ebi. (aiōnios g166)
Na sasa kwa Mfalme asiye na ukomo, asiyekufa, asiyeonekana, Mungu pekee, iwe heshima na utukufu milele na milele. Amina. (aiōn g165)
Ugbu a, ka enye Eze ahụ na-adị ruo mgbe niile, Onye na-adịghị anwụ anwụ, Onye a na-adịghị ahụ anya, Onye naanị ya bụ Chineke, nsọpụrụ na otuto ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen. (aiōn g165)
Piga vita vizuri vya imani. Shikilia uzima wa milele ulioitiwa. Ilikuwa ni kwa sababu hii kwamba ulitoa ushuhuda mbele ya mashahidi wengi kwa kile kilicho chema. (aiōnios g166)
Na-agbasi mgba ọma nke okwukwe gị ike, jidesiekwa ndụ ebighị ebi ahụ aka ike bụ nke a kpọrọ gị oku maka ya mgbe i mere ezi nkwupụta gị nʼihu ọtụtụ ndị akaebe. (aiōnios g166)
Peke yake anaishi milele na akaaye katika mwanga usiokaribiriwa. Hakuna mtu awezaye kumwona wala awezaye kumtazama. Kwake iwe heshima na uweza wa milele. Amina. (aiōnios g166)
Onye naanị ya na-adịghị anwụ anwụ. Onye na-ebikwa nʼime ìhè nke mmadụ ọbụla na-apụghị ịbịaru nso. Onye mmadụ ọbụla na-ahụbeghị anya mgbe ọbụla, onye a na-apụghịkwa ịhụ anya. Ọ bụ ya ka nsọpụrụ na ike dịrị ruo mgbe ebighị ebi. Amen. (aiōnios g166)
Waambie matajiri katika ulimwengu huu wasijivune, na wasitumaini katika utajiri, ambao siyo wa uhakika. Badala yake, wanapaswa kumtumaini Mungu. Ambaye hutupatia utajiri wote wa kweli ili tufurahie. (aiōn g165)
Nye ndị bụ ọgaranya nʼoge ugbu a iwu ka ha ghara ịnya isi, maọbụ tụkwasị obi ha nʼakụnụba, nke a na-ejighị aka. Kama ka ntụkwasị obi ha dịrị na Chineke onye na-enyezu anyị ihe niile site nʼakụ ya nʼihi ime anyị obi ụtọ. (aiōn g165)
Ni Mungu aliyetuokoa na kutuita kwa wito mtakatifu. Hakufanya hivi kulingana na kazi zetu bali kulingana na neema na mpango wake mwenyewe. Alitupatia mambo haya katika Kristo Yesu kabla ya nyakati kuanza. (aiōnios g166)
Ọ zọpụtara anyị, kpọbata anyị na ndụ dị nsọ. Ọ bụghị nʼihi na anyị kwesiri ka a kpọọ anyị, kama, ọ bụ nʼihi nzube ya na amara ya. E nyere anyị amara nʼime Kraịst Jisọs tupu a tọọ ntọala ụwa a. (aiōnios g166)
Kwa hiyo, navumilia mambo yote kwa ajili ya wale ambao Mungu amekwishawachagua, ili kwamba nao pia waupate wokovu ulio katika Kristo Yesu pamoja na utukufu wa milele. (aiōnios g166)
Ya mere, ana m anagide ihe niile nʼihi ndị a họpụtara, ka ha bụrụkwa ndị ga-anata nzọpụta dị nʼime Kraịst Jisọs, na ebube ebighị ebi. (aiōnios g166)
Kwa kuwa Dema ameniacha. Anaupenda ulimwengu wa sasa na amekwenda Thesalonike, Kreseni alikwenda Galatia, na Tito alikwenda Dalmatia. (aiōn g165)
nʼihi na Dimas onye hụrụ ihe ndụ a nʼanya ahapụla m gaa Tesalonaịka. Kresens agaala Galeshịa, Taịtọs agakwaala Dalmetia. (aiōn g165)
Bwana ataniepusha na matendo yote maovu na kuniokoa kwa ajili ya ufalme wake wa mbinguni. Utukufu uwe kwake milele na milele. Amen (aiōn g165)
Onyenwe anyị ga-azọpụtakwa m site nʼihe ọjọọ niile ọbụla, kpọbata m nʼudo baa nʼalaeze eluigwe ya. Ọ bụ ya ka otuto dịrị ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen. (aiōn g165)
Wapo katika tumaini la uzima wa milele ambao Mungu asiyeweza kusema uongo aliuahidi tangu milele. (aiōnios g166)
nke a dabere nʼolileanya maka ndụ ebighị ebi, nke Chineke onye na-adịghị agha ụgha kwerelarị na nkwa tupu mmalite nke oge. (aiōnios g166)
Inatufundisha kukataa mambo yasiyo ya kimungu na tamaa za kidunia. Inatufundisha kuishi kwa busara, kwa haki, na katika njia za kimungu kwa wakati huu. (aiōn g165)
Ọ bụkwa amara a na-akụziri anyị ka anyị jụ ndụ asọpụrụghị Chineke na nke ịgbaso ọchịchọ ọjọọ dị nʼụwa, kama ka anyị bie ndụ dị ka ndịisi zuruoke na ndụ ezi omume, nakwa ịtụ egwu Chineke nʼọgbọ nke oge a. (aiōn g165)
Alifanya hivi ili kwamba, tukiwa tumehesabiwa haki kwa neema yake, tuwe washirika katika uhakika wa maisha ya milele. (aiōnios g166)
ka ọ bụrụ na ebe e sitere nʼamara gụọ anyị dịka ndị ezi omume, anyị ga-abụ ndị nketa, ndị nwere olileanya ndụ ebighị ebi. (aiōnios g166)
Labda ni sababu alitengwa nawe kwa muda, ilikuwa hivyo ili uwe pamoja naye milele. (aiōnios g166)
Ma eleghị anya, ọ bụ nʼihi nke a ka eji kewapụ ya nwa oge nta site nʼebe ị nọ, bụ ka i mesịa nweghachi ya ebighị ebi. (aiōnios g166)
Lakini katika siku hizi tulizonazo, Mungu ameongea nasi kupitia Mwana, ambaye alimweka kuwa mrithi wa vitu vyote, na ambaye kupitia yeye pia aliumba ulimwengu. (aiōn g165)
Ma nʼoge ikpeazụ ndị a, ọ gwala anyị okwu site nʼọnụ Ọkpara ya, onye o nyefere ihe niile nʼaka. Ọ bụ site nʼaka ya ka o siri kee ụwa niile na ihe dị nʼime ya. (aiōn g165)
Lakini kuhusu Mwana husema, “Kiti chako cha enzi, Mungu, ni cha milele na milele. Fimbo ya ufalme wako ni fimbo ya haki. (aiōn g165)
Ma banyere Ọkpara ahụ, ọ sịrị, “Ocheeze gị, O Chineke, ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Mkpara omume ziri ezi ka mkpara alaeze gị ga-abụ. (aiōn g165)
Ni kama asemavyo pia sehemu nyingine, “Wewe ni kuhani milele baada ya mfumo wa Melkizedeki.” (aiōn g165)
Nʼebe ọzọ, o kwuru, “Dị ka usoro Melkizedek si dị, ị bụ onye nchụaja ruo mgbe ebighị ebi.” (aiōn g165)
Alikamilishwa na kwa njia hii alifanyika kwa kila mtu amwaminiye kuwa sababu ya wokovu wa milele, (aiōnios g166)
Ma mgbe e mere ka o zuo oke, ọ ghọrọ isi nke nzọpụta ebighị ebi nye ndị niile na-erubere ya isi. (aiōnios g166)
wala misingi ya mafundisho ya ubatizo, na kuwawekea mikono, ufufuo wa wafu, na hukumu ya milele. (aiōnios g166)
na-akụzi banyere ime baptizim na ibikwasị aka nʼisi na onyinye nke Mmụọ Nsọ, na mbilite nʼọnwụ na ikpe ebighị ebi. (aiōnios g166)
na ambao walionja uzuri wa neno la Mungu na kwa nguvu za wakati ujao, (aiōn g165)
ndị detụkwara ịdị mma nke okwu Chineke ahụ ire na ike nke ụwa na-abịa, (aiōn g165)
Yesu aliingia sehemu ile kama mtangulizi wetu, akisha kufanyika kuhani mkuu hata milele baada ya utaratibu wa Melkizedeki. (aiōn g165)
ebe Jisọs onye buru anyị ụzọ, abanyela nʼihi anyị; ọ ghọlara anyị onyeisi nchụaja ruo mgbe ebighị ebi dị ka usoro Melkizedek si dị. (aiōn g165)
Hivyo maandiko yanashuhudia kuhusu yeye: “Wewe ni kuhani milele baada ya mfumo wa Melkizedeki.” (aiōn g165)
Nʼihi na-agbara akaebe banyere ya, sị, “Gị onwe gị, bụ onye nchụaja ruo mgbe ebighị ebi, dị ka usoro Melkizedek si dị.” (aiōn g165)
Lakini Mungu alichukua kiapo wakati aliposema kuhusu Yesu, “Bwana ameapa na hatabadilisha mawazo yake.' wewe ni kuhani milele.” (aiōn g165)
Ma onye nke a ghọrọ onye nchụaja site nʼịṅụ iyi mgbe onye ahụ gwara ya, “Onyenwe anyị aṅụọla iyi, ọ gaghị agbanwe obi ya, ‘Ị bụ onye nchụaja ruo mgbe ebighị ebi.’” (aiōn g165)
Lakini kwa sababu Yesu anaishi milele, ukuhani wake haubadiliki. (aiōn g165)
Ya mere, ebe ọ na-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi, ọ na-abụkwa onyeisi nchụaja mgbe niile. (aiōn g165)
Kwa sheria huwateua watu dhaifu kuwa makuhani wakuu, lakini neno la kiapo, lililokuja baada ya sheria, alimteua Mwana, aliyefanywa kuwa mkamilifu milele. (aiōn g165)
Nʼihi na iwu na-ahọpụta dị ka ndịisi nchụaja ndị mmadụ na-adịghị ike. Ma okwu nke ịṅụ iyi ahụ, nke na-eso iwu nʼazụ, họpụtara Ọkpara, onye e mere ka o zuo oke ruo mgbe ebighị ebi. (aiōn g165)
Ilikuwa si kwa damu ya mbuzi na ndama, bali kwa damu yake mwenyewe kwamba Kristo aliingia mahali patakatifu zaidi mara moja kwa kila mmoja na kutuhakikishia ukombozi wetu wa milele. (aiōnios g166)
o jighị ọbara ụmụ ewu na nke ụmụ ehi banye nʼebe ahụ, kama o ji ọbara nke ya onwe ya banye nʼEbe ahụ Kachasị Nsọ naanị otu mgbe, jiri ya wetara anyị niile mgbapụta ebighị ebi. (aiōnios g166)
Je si zaidi sana damu ya Kristo ambaye kupitia Roho wa milele alijitoa mwenyewe bila mawaa kwa Mungu, kuosha dhamiri zetu kutoka matendo mafu kumtumikia Mungu aliye hai? (aiōnios g166)
Ọbara Kraịst onye sitere na Mmụọ dị ebighị ebi were onwe ya chụọrọ Chineke aja nʼenweghị ntụpọ ọbụla, ọ ga-esi aṅaa ghara ịsachapụ omume ruru unyi nke akọnuche anyị, ka anyị nwee ike ife Chineke dị ndụ. (aiōnios g166)
Kwa sababu hiyo, Kristo ni mjumbe wa agano jipya. Hii ndiyo sababu mauti imewaacha huru wote walio wa agano la kwanza kutoka katika hatia ya dhambi zao, ili kwamba wote walioitwa na Mungu waweze kupokea ahadi ya urithi wao wa milele. (aiōnios g166)
Nʼihi nke a, ọ bụ onye ogbugbo nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ, ka ndị a kpọrọ site na ya nata ihe nketa ebighị ebi ahụ bụ nke e kwere ha na nkwa. A pụrụ ime nke a nʼihi ọ nwụọla ọnwụ gbapụta ụmụ mmadụ site nʼikpe ọmụma nke mmehie ha mere nʼokpuru ọgbụgba ndụ nke mbụ ahụ. (aiōnios g166)
kama hiyo ilikuwa kweli, basi ingekuwa lazima kwake kuteswa mara nyingi zaidi tangu mwanzo wa ulimwengu. Lakini sasa ni mara moja hadi mwisho wa miaka aliyojifunua kuiondoa dhambi kwa dhabihu yake mwenyewe. (aiōn g165)
Ọ bụrụ na o si otu a dịrị, ọ gaara abụ onye na-ahụ ahụhụ mgbe kemgbe e kere ụwa. Ma, dị ka o si dị, ọ bịara naanị otu ugboro nʼọgwụgwụ oge ndị a, iwezuga mmehie site nʼiji onwe ya chụọ aja. (aiōn g165)
Kwa imani tunafahamu kwamba ulimwengu uliumbwa kwa amri ya Mungu, ili kwamba kile kinachoonekana hakikutengenezwa kutokana na vitu ambavyo vilikuwa vinaonekana. (aiōn g165)
Ọ bụ site nʼokwukwe ka anyị ji ghọta na e mere ụwa na ihe niile anyị na-ahụ anya site nʼokwu Chineke. Nʼihi nke a, ihe anyị na-ahụ anya ugbu a bụ ihe e mere site nʼihe anyị na-adịghị ahụ anya. (aiōn g165)
Yesu Kristo ni yeye jana, leo, na ata milele. (aiōn g165)
Otu Jisọs Kraịst dị ụnyaahụ, ka ọ dị taa, otu a ka ọ ga-adịgidekwa ruo mgbe ebighị ebi. (aiōn g165)
Sasa Mungu wa amani, ambaye aliwaleta tena kutoka kwa wafu mchungaji mkuu wa kondoo, Bwana wetu Yesu, kwa damu ya agano la milele, (aiōnios g166)
Ugbu a ka Chineke nke udo, onye ahụ sitere nʼọbara ọgbụgba ndụ ebighị ebi ahụ kpọghachite Onyenwe anyị Jisọs, Onye ọzụzụ atụrụ ukwuu ahụ, site nʼọnwụ, (aiōnios g166)
Atawapa uwezo kwa kila jambo zuri kufanya mapenzi yake, akifanya kazi ndani yetu iliyo njema ya kupendeza machoni pake, kupitia Yesu Kristo, kwake uwe utukufu milele na milele. Amina. (aiōn g165)
mee ka unu zuo oke nʼezi ihe ọma niile ọbụla, nke ga-enyere unu aka ime ihe ọ na-achọ. Ka ọ rụpụta nʼetiti anyị ihe ndị ahụ niile na-atọ ya ụtọ site na Jisọs Kraịst, onye otuto niile dịrị ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen. (aiōn g165)
Ulimi pia ni moto, ni ulimwengu wa uovu, umewekwa miongoni mwa viungo vya mwili wetu, ambao hunajisi mwili wote na huiweka juu ya moto njia ya maisha, na wenyewe kuchomwa moto wa kuzimu. (Geenna g1067)
Ire anyị bụ ọkụ. E debere ire nʼetiti akụkụ anụ ahụ ndị ọzọ dịka ụwa ajọ omume. Ọ na-emerụ ahụ niile, na-amụnye ọkụ nʼusoro ndụ mmadụ. Ya onwe ya bụkwa ihe ọkụ ala mmụọ na-amụnye ọkụ. (Geenna g1067)
Mmekwisha zaliwa mara ya pili, si kwa mbegu iharibikayo, lakini kutoka katika mbegu isiyoharibika, kupitia uzima na neno la Mungu lililosalia. (aiōn g165)
Nʼihi na amụọla unu ọzọ ugbu a, ọ bụghị site na mkpụrụ nke na-emebi emebi, kama site na nke na-apụghị imebi emebi, site nʼokwu Chineke nke dị ndụ ma na-adịgidekwa. (aiōn g165)
lakini neno la Bwana hubakia milele.” Huu ni ujumbe ambao ulitangazwa kama injili kwenu. (aiōn g165)
ma okwu Onyenwe anyị na-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.” Okwu ahụ bụkwa oziọma ahụ e zisaara unu. (aiōn g165)
Kama mtu akiongea, na iwe kama mausia ya Mungu, na kama mtu akihudumu, na iwe kama uwezo aliopewa na Mungu, ili kwamba kwa kila jambo Mungu apate kutukuzwa kupitia Yesu Kristo. Utukufu na uweza vina Yeye milele na milele. Amina. (aiōn g165)
Onye na-ekwu okwu ya kwuo ya dị ka ọ bụ nnọọ okwu Chineke ka ọ na-ekwu. Onye na-eje ozi ya jee ya site nʼike ahụ Chineke na-enye. Nʼime ihe niile ka otuto dịrị Chineke site na Jisọs Kraịst. Ọ bụ ya ka otuto niile na ike niile dịrị ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen. (aiōn g165)
Baada ya kuteseka kwa muda kitambo, Mungu wa neema yote, aliyewaita katika utukufu wa milele ndani ya Kristo, atawakamilisha, atawaimarisha na kuwatia nguvu. (aiōnios g166)
Chineke onye nwe amara niile, onye kpọbatara unu na ebube ebighị ebi ya nʼime Kraịst, mgbe unu hụrụ ahụhụ ndị a nwa oge, ya onwe ya ga-eweghachi unu nʼọnọdụ unu, mee ka unu dị nnọọ ike, ndị guzo chịm ma kwesikwa ntụkwasị obi. (aiōnios g166)
Enzi iwe kwake milele na milele. Amina. (aiōn g165)
Ọ bụ ya nwe ike niile ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen. (aiōn g165)
Hivyo mtajipatia wingi wa lango la kuingilia katika ufalme wa milele wa Bwana wetu na mwokozi Yesu Kristo. (aiōnios g166)
Nʼụzọ dị otu a, a ga-enye unu ohere dị ukwuu iji bata nʼalaeze ebighị ebi nke Onyenwe anyị na Onye nzọpụta anyị Jisọs Kraịst. (aiōnios g166)
Maana Mungu hakuwaacha malaika waliokengeuka. Bali aliwatupa kuzimu ili wafungwe minyororo mpaka hukumu itakapowajilia. (Tartaroō g5020)
Ọ bụrụ na Chineke ahapụghị ndị mmụọ ozi ahụ mgbe ha mehiere, kama o weere ha kpọchie nʼime ala mmụọ, ebe e kere ha agbụ na-eche ụbọchị ikpe ahụ. (Tartaroō g5020)
Lakini mkue katika neema na ufahamu wa Bwana na mwokozi Yesu Kristo. Na sasa utukufu una yeye sasa na milele. Amina. (aiōn g165)
Bụrụnụ ndị na-eto eto nʼime amara. Bụrụkwanụ ndị na-aga nʼihu ịmụta ihe banyere Onyenwe anyị na Onye nzọpụta anyị Jisọs Kraịst nke ọma. Ka otuto dịrị ya ugbu a na mgbe niile ebighị ebi. Amen. (aiōn g165)
Na ule uzima ulifanywa kujulikana wazi, na tumeuona, na kuushuhudia, na kuwatangazia uzima wa milele, ambao ulikuwa kwa Baba na ulifanywa kujulikana kwetu. (aiōnios g166)
Ndụ ahụ pụtara ihe. Anyị ahụla ya ma gbaakwa ama banyere ya. Ya mere, ihe anyị na-ekwu okwu ya, na ihe anyị na-akọrọ unu bụ banyere ndụ ebighị ebi ahụ nke ya na Nna nọ na mbụ; nke e mere ka ọ pụta ìhè nye anyị. (aiōnios g166)
Dunia na tamaa zake zinapita. Bali yeye afanyaye mapenzi ya Mungu huyo adumu milele. (aiōn g165)
Ụwa na ọchịchọ ọjọọ ya niile na-agafe agafe, ma onye ahụ na-eme uche Chineke ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. (aiōn g165)
Na hii ni ahadi aliyotupatia sisi: uzima wa milele. (aiōnios g166)
Ihe o kwere anyị na nkwa bụ nke a, ndụ ebighị ebi. (aiōnios g166)
Mtu yeyote anaye mchukia ndugu yake ni muuaji. Na mnajua kuwa uzima wa milele haukai ndani ya muuaji. (aiōnios g166)
Onye ọbụla na-akpọ nwanna ya asị bụ ogbu mmadụ, unu matakwara na o nweghị onye ọbụla bụ ogbu mmadụ nwere ndụ ebighị ebi nʼime ya. (aiōnios g166)
Na ushuhuda ndio huu — kwamba Mungu alitupa uzima wa milele, na uzima huu umo ndani ya Mwanawe. (aiōnios g166)
Ama ahụ bụkwa nke a, na Chineke enyela anyị ndụ ebighị ebi, ndụ a dịkwa nʼime Ọkpara ya. (aiōnios g166)
Nimewaandikia haya mweze kujua kwamba mnao uzima wa milele — ninyi mnaoamini katika jina la Mwana wa Mungu. (aiōnios g166)
Ana m edere unu ihe ndị a unu ndị kweere nʼaha Ọkpara Chineke, ime ka unu mata na unu nwere ndụ ebighị ebi. (aiōnios g166)
Lakini twajua kwamba Mwana wa Mungu amekuja na ametupatia ujuzi, kwamba tunamjua yeye aliye kweli na kwamba tumo ndani yake yeye aliye kweli, hata katika Mwanawe Yesu Kristo. Ni Mungu wa kweli na uzima wa milele. (aiōnios g166)
Anyị matakwara na Ọkpara Chineke abịala, nyekwa anyị nghọta ka anyị mara ya, onye bụ eziokwu. Anyị nọ nʼime onye ahụ bụ eziokwu, ọ bụladị nʼime Ọkpara ya, bụ Jisọs Kraịst. Ya onwe ya bụ ezi Chineke bụrụkwa ndụ ebighị ebi. (aiōnios g166)
kwa sababu ya kweli iliyomo ndani yetu na itakayodumu pamoja nasi milele. (aiōn g165)
Nʼihi eziokwu ahụ nke dị nʼime anyị, nke ga-adịgidekwa nʼime anyị ruo mgbe ebighị ebi: (aiōn g165)
Na malaika ambao hawakuilinda enzi yao wenyewe lakini wakaacha makao yao maalum Mungu amewaweka katika minyororo ya milele, ndani ya giza, kwa ajili ya hukumu ya siku ile kuu. (aïdios g126)
Ndị mmụọ ozi nupuru isi, ndị na-anọgideghị nʼọnọdụ e nyere ha, kama ha si nʼebe obibi ha gbapụ. O jirila igwe kee ha agbụ ebighị ebi, debe ha nʼọchịchịrị nʼime ala, ebe ha ga-anọ ruo ụbọchị ikpe ahụ dị egwu. (aïdios g126)
Kama vile Sodoma na Gomora na miji iliyoizunguka, ambayo pia ilijiingiza yenyewe katika uasherati na wakafuata tamaa isiyo ya asili. Walioneshwa kama mifano ya wale ambao huteseka katika hukumu ya moto wa milele. (aiōnios g166)
Otu a kwa, Sọdọm na Gọmọra na obodo niile gbara ha gburugburu, bụ ndị nyefere onwe ha na ndụ ịkwa iko nakwa omume ibi ndụ ọjọọ dị iche iche nke anụ ahụ, bụ ihe ịdọ aka na ntị nye ndị mmadụ site nʼahụhụ ha tara nʼihi mmehie nʼime ọkụ ebighị ebi. (aiōnios g166)
Ni mawimbi ya bahari yenye kelele yakitoa aibu yao wenyewe, Ni nyota zinazorandaranda ambazo weusi wa giza umetunzwa kwa ajili yao milele. (aiōn g165)
Ha bụ ebili mmiri na-amagharị nʼosimiri, nke na-asọpụta ihere ha dịka ụfụfụ, kpakpando na-awagharị awagharị, bụ ndị nke a kwadooro ebe kachasị ịgba ọchịchịrị ruo ebighị ebi. (aiōn g165)
jitunzeni katika upendo wa Mungu, na msubiri rehema ya Bwana wetu Yesu Kristo ambayo huwapatia uzima wa milele. (aiōnios g166)
Doonụ onwe unu nʼokpuru ịhụnanya Chineke, dịka unu na-echere ebere Onyenwe anyị Jisọs Kraịst nke na-eduba na ndụ ebighị ebi. (aiōnios g166)
kwake Mungu pekee mwokozi kupitia Yesu Kristo Bwana wetu, utukufu uwe kwake, ukuu, uwezo na nguvu kabla ya nyakati zote, na sasa na hata milele. Amina. (aiōn g165)
ka otuto, na ịdị ukwuu, na ike, na ikike ọchịchị; dịrị Onye naanị ya bụ Chineke, Onye nzọpụta anyị, site na Jisọs Kraịst Onyenwe anyị, tupu nʼọgbọ niile ebido, ka ọ dịrị ya ugbu a, na mgbe niile ebighị ebi. Amen. (aiōn g165)
ametufanya kuwa ufalme, makuhani wa Mungu na Baba yake - kwake kuwa utukufu na nguvu milele daima. Amina. (aiōn g165)
O mere ka anyị bụrụ alaeze, ndị nchụaja nye Nna ya bụ Chineke. Ọ bụ ya ka otuto niile na ike niile dịịrị ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen. (aiōn g165)
na ambaye ninaishi. Nalikuwa nimekufa, lakini tazama, ninaishi milele! Na ninazo funguo za mauti na kuzimu. (aiōn g165, Hadēs g86)
Abụ m onye ahụ na-adị ndụ. Anwụrụ m anwụ, ma lee, ana m adị ndụ ruo mgbe niile ebighị ebi. Ọ bụkwa m ji ọtụghe igodo nke ọnwụ na nke ọkụ ala mmụọ. (aiōn g165, Hadēs g86)
Kila wakati viumbe wenye uhai walipotoa utukufu, heshima, na kushukuru mbele za aliyekuwa ameketi kwenye hicho kiti cha enzi, yeye aishiye milele na daima, (aiōn g165)
Mgbe ọbụla anụ ndị ahụ dị ndụ na-enye onye ahụ na-anọkwasị nʼelu ocheeze ahụ na-adị ndụ ruo mgbe niile ebighị ebi otuto na nsọpụrụ na ekele, (aiōn g165)
wazee ishirini na wanne walisujudu wenyewe mbele yake aliyekikalia kiti cha enzi. Waliinama chini kwake aishiye milele na daima na kutupa chini taji zao mbele ya kiti cha enzi wakisema, (aiōn g165)
iri ndị okenye abụọ na anọ ahụ na-adakwa nʼala nʼihu onye ahụ nọ nʼocheeze na-efe ya ofufe, bụ onye ahụ na-adị ndụ ruo mgbe niile ebighị ebi. Ha niile nʼotu nʼotu na-atụda okpueze ha nʼihu ya na-abụ abụ na-asị, (aiōn g165)
Nikasikia kila kilichoumbwa kilichokuwa mbinguni na duniani na chini ya nchi na juu ya bahari, kila kitu ndani yake kikisema, “Kwake yeye aketiye juu ya kiti cha enzi na kwa mwanakondoo, kuwe sifa, heshima, utukufu na nguvu ya kutawala milele na milele.” (aiōn g165)
Mgbe ahụ, anụrụ m ka ihe niile nọ nʼeluigwe na ndị nọ nʼụwa na ndị nọ nʼokpuru ụwa, na ndị nọ nʼokpuru oke osimiri na-eti mkpu abụ na-asị, “Ka ngọzị, na nsọpụrụ niile, na otuto niile, na ike niile dịrị onye ahụ na-anọkwasị nʼocheeze ahụ, na Nwa Atụrụ ahụ (aiōn g165)
Kisha nikaona farasi wa kijivu. Aliye mpanda aliitwa jina lake mauti, na kuzimu ilikuwa ikimfuata. Walipewa mamlaka juu ya robo ya nchi, kuua kwa upanga, kwa njaa na kwa ugonjwa, na kwa wanyama wa mwitu katika nchi. (Hadēs g86)
Elere m anya ma hụ ịnyịnya na-acha ntụntụ nʼihu m. Aha onye nọkwasịrị nʼelu ya bụ Ọnwụ na Ọkụ ala mmụọ na-esokwa ya nʼazụ. E nyere ha ike nʼebe otu ụzọ nʼụzọ anọ nke ụwa dị ka ha jiri mma agha na ụnwụ, na ọrịa ọjọọ na anụ ọhịa gbuchapụ ndị bi nʼime ha. (Hadēs g86)
wakisema, “Amina! Sifa, utukufu, hekima, shukurani, heshima, uwezo na nguvu viwe kwa Mungu wetu milele na milele! Amina!” (aiōn g165)
na-asị, “Amen! Ngọzị niile na otuto niile, na amamihe niile na ekele niile na nsọpụrụ niile na ike niile na ume niile, dịrị Chineke anyị ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen.” (aiōn g165)
Kisha malaika wa tano alipiga tarumbeta yake. Niliona nyota kutoka mbinguni iliyokuwa imeanguka kwenye dunia. Nyota ilipewa ufunguo wa shimo linaloelekea kwenye shimo lisilo na mwisho. (Abyssos g12)
Mgbe mmụọ ozi nke ise ahụ fụrụ opi ike ya, ahụrụ m otu kpakpando si nʼeluigwe daa nʼala. E nyere ya ihe ọtụghe igodo nke e ji atụghe olulu nke Abis ahụ. (Abyssos g12)
Alifungua shimo lisilo na kikomo, na moshi ukapanda juu kwa safu kutoka ndani ya shimo kama moshi kutoka katika tanuru kubwa. Jua na anga vilibadilika vikawa giza kwa sababu ya moshi uliotoka shimoni. (Abyssos g12)
Mgbe o meghere olulu Abis ahụ, anwụrụ ọkụ dị ukwu sitere nʼime ya pụta dịka anwụrụ ọkụ si nʼọkụ icheku ọkụ ya dị ukwuu, mee ka oke ọchịchịrị kpuchie ihu anyanwụ na mbara eluigwe. (Abyssos g12)
Walikuwa naye kama mfalme juu yao malaika wa shimo lisilokuwa na mwisho. Jina lake katika Kiebrania ni Abadoni, na katika Kiyunani ana jina Apolioni. (Abyssos g12)
Ha nwere mmụọ ozi nke Abis, onye na-achịkọta ha dịka eze. Aha ya nʼasụsụ Hibru bụ Abadọn, ma nʼasụsụ Griik ọ bụ Apolion. (Abyssos g12)
na kuapa kwa yule aishiye milele na milele —aliyeumba mbingu na vyote vilivyomo, dunia na vyote vilivyomo, na bahari na vyote vilivyomo: “Hakutakuwepo kuchelewa tena. (aiōn g165)
were onye ahụ na-adị ndụ mgbe niile ebighị ebi ṅụọ iyi. Ya bụ onye ahụ kere eluigwe na ụwa, na ihe niile dị nʼime ha, na oke osimiri, na ndị niile bi nʼime ha, sị na oge ezuola. Na o kwesikwaghị ka a tufuo oge ọbụla. (aiōn g165)
Wakati watakapokuwa wamemaliza ushuhuda wao, yule mnyama anayetoka kwenye shimo lisilo na mwisho atafanya vita dhidi yao. Atawashinda na kuwaua. (Abyssos g12)
Mgbe ha gbazuru ama ha, anụ ọhịa ahụ, nke na-esite nʼime olulu Abis ahụ ga-ebuso ha agha merie ha, gbukwaa ha. (Abyssos g12)
Kisha malaika wa saba alipiga tarumbeta yake, na sauti kubwa zilinena mbinguni na kusema, “Ufalme wa dunia umeshakuwa ufalme wa Bwana wetu na wa Kristo wake. Atatawala milele na milele.” (aiōn g165)
Ka mmụọ ozi nke asaa fụrụ opi ike ya, oke olu dị iche iche dara ike ike nʼeluigwe, na-asị, “Alaeze niile nke ụwa abụrụla alaeze Onyenwe anyị, na nke Kraịst ya. Ya onwe ya ga-achịkwa ruo mgbe niile ebighị ebi.” (aiōn g165)
Nikaona malaika mwingine akiruka katikati ya mbingu, ambaye mwenye ujumbe wa mbinguni wa habari njema kwa kuwatangazia wenye kuishi duniani kwa kila taifa, kabila, lugha, na watu. (aiōnios g166)
Ahụkwara m mmụọ ozi ọzọ ka ọ na-efegharị nʼetiti mbara eluigwe. O ji oziọma nke ebighị ebi ahụ nʼaka, nke ọ na-aga ikwusara mba niile, na ebo niile, na asụsụ niile na mmadụ niile nọ nʼụwa. (aiōnios g166)
Na moshi wa maumivu yao ukaenda milele na milele, na hawakuwa na mapumziko mchana au usiku - hao waabuduo mnyama na sanamu yake, na kila mtu aliyepokea alama ya jina lake. (aiōn g165)
Anwụrụ ọkụ si nʼebe a na-emekpa ha ahụ apụta na-arịgo elu ruo mgbe niile ebighị ebi. Izuike agaghị adịrị ha ehihie na abalị bụ ndị ahụ kpọrọ isiala nye anụ ọhịa ahụ na oyiyi ya a kpụrụ akpụ, kwerekwa ka a kakwasị ha akara nke aha ya. (aiōn g165)
Mmoja wa wale wenye uhai wanne akatoa kwa malaika saba mabakuli saba ya dhahabu yaliyojaa ghadhabu ya Mungu mwenye kuishi milele na milele. (aiōn g165)
Otu nʼime anụ anọ ndị ahụ dị ndụ bunyere mmụọ ozi asaa ndị ahụ efere ọlaedo asaa a gbajuru ọnụma Chineke, bụ onye ahụ na-adị ndụ mgbe niile ebighị ebi. (aiōn g165)
Mnyama uliyemwona alikuwepo, hayupo tena sasa, lakini yuko tayari kupanda kutoka katika shimo lisilo na mwisho. Kisha ataendelea na uharibifu. Wale wakaao juu ya nchi, wale ambao majina yao hayakuandikwa kwenye kitabu cha uzima tangu kuwekwa misingi ya ulimwengu - watashangaa wamwonapo mnyama aliyekuwepo, kwamba hayupo sasa, lakini yupo karibu kuja. (Abyssos g12)
Anụ ọhịa ahụ ị hụrụ, nwere mgbe ọ dịịrị, ma ugbu a, ọ dịkwaghị. Ma ọ ga-esi nʼolulu Abis ahụ pụta banye na mbibi. Ma nlọghachi ya ga-eju ndị ahụ a na-edeghị aha ha nʼime akwụkwọ ndụ ahụ site nʼoge e kere ụwa anya. Nʼihi na e nwere mgbe ọ dịịrị, ma ugbu a, ọ dịkwaghị, ma ọ ga-emesi bịa. (Abyssos g12)
Kwa mara ya pili walisema, “Haleluya! Moshi hutoka kwake milele na milele.” (aiōn g165)
Ọzọkwa, ha tiri mkpu, “Haleluya! Anwụrụ ọkụ si nʼime ya na-arịgo elu ruo mgbe ebighị ebi.” (aiōn g165)
Mnyama alikamatwa na nabii wake wa uongo aliyezifanya ishara katika uwepo wake. Kwa ishara hizi aliwadanganya wale walioipokea chapa ya mnyama na walioisujudia sanamu yake. Wote wawili walitupwa wangali hai katika ziwa la moto liwakalo kwa kiberiti. (Limnē Pyr g3041 g4442)
Ma e jidere anụ ọhịa ahụ, ya na onye amụma ụgha ahụ onye nke nọọrọ nʼihu ya gosi ihe ịrịbama nke o jiri duhie ndị niile natara akara nke anụ ọhịa ahụ, ya na ndị kpọọrọ ihe oyiyi ya isiala. A tụnyere anụ ọhịa ahụ na onye amụma ụgha ya na ndụ nʼime ọdọ ọkụ e ji nkume na-enwu ọkụ kwanye. (Limnē Pyr g3041 g4442)
Kisha niliona malaika akishuka kutoka mbinguni, akiwa na ufunguo wa shimo lisilo na mwisho na mnyororo mkubwa mkononi mwake. (Abyssos g12)
Mgbe ahụ kwa, ahụrụ m otu mmụọ ozi ka o si nʼeluigwe na-arịdata, o ji mkpisi igodo e ji atụghe olulu Abis ahụ. O jikwa eriri igwe dị ukwuu nʼaka ya. (Abyssos g12)
Alimtupa kwenye shimo lisilo na mwisho, akalifunga na kulitia mhuri juu yake. Hii ilikuwa hivyo ili kwamba asiwadanganye mataifa tena mpaka miaka elfu itakapoisha. Baada ya hapo, ataachiwa huru kwa muda mchache. (Abyssos g12)
Emesịa, a tụnyere ya nʼime olulu Abis ahụ, tụchie ụzọ ya. Ọ kakwara akara nʼelu ya ka agwọ ochie ahụ hapụ inwekwa ike iduhie mba niile dị nʼụwa ọzọ tutu ruo mgbe puku afọ gasịrị. Mgbe afọ ndị a zuru, a ga-atọghepụ ya ka ọ gagharịa nwantịntị oge. (Abyssos g12)
Shetani, ambaye aliwadanganya, alitupwa ndani ya ziwa liwakalo kiberiti, ambamo mnyama na nabii wa uongo walikuwa wameshatupwa. Watateswa mchana na usiku milele na milele. (aiōn g165, Limnē Pyr g3041 g4442)
Mgbe ahụ, ekwensu ahụ dufuru ha ka a ga-atụnye nʼọdọ ọkụ e ji nkume na-enwu ọkụ kwanye. Ebe ahụ ka ọ ga-anọ, ya na anụ ọhịa ọjọọ ahụ, na onye amụma ụgha ya. Ha ga-anọkwa nʼọnọdụ ahụ mgbu ehihie na abalị ruo mgbe ebighị ebi. (aiōn g165, Limnē Pyr g3041 g4442)
Bahari iliwatoa wafu ambao walikuwa ndani yake. Kifo na kuzimu viliwatoa wafu ambao walikuwa ndani yake, na wafu walihukumiwa kulingana na walichofanya. (Hadēs g86)
Oke osimiri niile nyeghachiri ndị niile nwụrụ nọ nʼime ha. Otu a kwa, ọnwụ na ala mmụọ nyeghachikwara ndị nwụrụ anwụ dị nʼime ha. E kpekwara onye ọbụla ikpe dịka ọrụ ya si dị. (Hadēs g86)
Kifo na kuzimu zilitupwa ndani ya ziwa la moto. Hii ni mauti ya pili - ziwa la moto. (Hadēs g86, Limnē Pyr g3041 g4442)
Emesịa, a tụnyere ọnwụ na ọkụ ala mmụọ nʼime ọdọ ọkụ ahụ. Nke a bụ ọnwụ nke ugboro abụọ nke bụ ọdọ ọkụ. (Hadēs g86, Limnē Pyr g3041 g4442)
Kama jina la yeyote halikupatikana limeandikwa ndani ya Kitabu cha Uzima, alitupwa ndani ya ziwa la moto. (Limnē Pyr g3041 g4442)
Onye ọbụla a na-achọtaghị ebe e dere aha ya nʼakwụkwọ nke ndụ ahụ, ka a tụnyere nʼime ọdọ ọkụ ahụ. (Limnē Pyr g3041 g4442)
Lakini kama ilivyo kwa waoga, wasioamini, wachukizao, wauaji, wazinzi, wachawi, waabudu sanamu, na waongo wote, sehemu yao itakuwa katika ziwa la moto wa kiberiti uunguzao. Hiyo ndiyo mauti ya pili.” (Limnē Pyr g3041 g4442)
Ma ndị na-atụ ụjọ, ndị na-ekweghị ekwe, na ndị na-emetọ onwe ha, na ndị ogbu mmadụ, na ndị na-akwa iko, na ndị ha na mmụọ ọjọọ na-akparịta ụka, na ndị na-ekpere arụsị, na ndị ụgha niile, ihe ha ga-eketa bụ ikpe ọmụma nke ịbanye nʼime olulu ahụ e ji nkume na-enwu ọkụ kwanye ọkụ. Nke bụ ọnwụ nke ugboro abụọ.” (Limnē Pyr g3041 g4442)
Hapatakuwa na usiku tena; wala hapatakuwa na hitaji la mwanga wa taa au jua kwa sababu Bwana Mungu ataangaza juu yao. Nao watatawala milele na milele. (aiōn g165)
Abalị agaghị adịkwa ọzọ, ịmụnye oriọna agaghị adịkwa mkpa. Mkpa ìhè anwụ na-enye agaghị adịkwa nʼihi na Onyenwe anyị Chineke ga-abụ ìhè ha, ha ga-achịkwa achị dịka eze ruo mgbe ebighị ebi. (aiōn g165)

SWN > Aionian Verses: 264
IGB > Aionian Verses: 264