< 2 Petro 3 >
1 Ssa, ninakuandikia wewe, mpendwa hii barua ya pili ili kukuamsha katika akili,
Ndị enyi m, nke a bụ akwụkwọ nke abụọ m na-edetara unu. Nʼime ha abụọ, ihe m mere bụ ichetara unu ihe ndị ahụ niile unu maara na itute uche unu banyere echiche zuruoke.
2 ili kwamba uweze kukumbuka maneno yaliyosemwa kabla na manabii watakatifu na kuhusu amri ya Bwana wetu na mwokozi kwa kutumia mitume.
Achọrọ m ka unu cheta okwu ndị amụma dị nsọ kwuru mgbe ochie na iwu nke Onyenwe anyị na Onye nzọpụta anyị nyere site na ndị ozi ya.
3 Ujue ili kwanza, kwamba wasaliti watakuja katika siku za mwisho kuwasaliti ninyi, wakienenda sawasawa na matakwa yao.
Na mbụ, unu ga-amata nke a, na nʼoge ikpeazụ, ndị na-akwa emo ga-apụta, site nʼịkwa emo gbaso agụ ihe ọjọọ niile nke anụ ahụ ha chọrọ
4 Na wakisema “Iko wapi ahadi ya kurudi? Baba zetu walikufa, Lakini vitu vyote vilikuwa hivyo tangu mwanzo wa uumbaji.
na-asị, “O kwere unu nkwa na ọ ga-abịa, gịnị mere na ọ bịabeghị? Kemgbe nna nna anyị ha nwụrụ, ihe niile ka dị otu ha dị na mbụ, site nʼokike ụwa.”
5 Wakajifanya kusahau kwamba nchi na mbingu vilianza kutokana na maji na kupitia maji zamani za kale, kwa neno la Mungu,
Ha kpachaara anya chefuo na site nʼogologo oge gara aga, e sitere nʼokwu ọnụ Chineke kee eluigwe ma meekwa ka ụwa dịrị site na mmiri nke gbara ụwa gburugburu.
6 na kwamba kupitia neno lake na maji yakawa ulimwengu kwa kipindi hicho, ikiwa imejaa maji, iliharibiwa.
Ọ bụkwa site na mmiri ndị a ka e ji bibie ma laa nʼiyi ụwa nke dị nʼoge ahụ.
7 Lakini sasa mbingu na dunia zimetunzwa kwa neno hilo hilo kwa ajili ya moto. Vimehifadhiwa kwa ajili ya siku ya hukumu na maangamizi ya watu wasio wa Mungu
Ọ bụkwa otu okwu ahụ ka e ji nye iwu ka e chebe eluigwe na ụwa tutu ruo ụbọchị ahụ, mgbe a ga-eji ọkụ laa ha nʼiyi nʼụbọchị ahụ a ga-ekpe ndị niile na-amaghị Chineke ikpe, laakwa ha nʼiyi.
8 Hii haiwezi kuchenga ujumbe wako, wapendwa, kwamba siku moja kwa bwana ni kama miaka elfu moja. Na miaka elfu moja ni kama siku moja.
Ndị enyi m, unu echefula otu okwu a, nʼanya Chineke, otu ụbọchị dịka puku afọ, puku afọ dịkwa ka otu ụbọchị.
9 Si kwamba Bwana anafanya pole pole kutimiza ahadi, kama inavyofikiriwa kuwa, Lakini yeye ni mvumilivu kwa ajili yenu, yeye hatamani hata mmoja aangamie, Lakini hutamani kutoa muda ili wote wapate kutubu.
Onyenwe anyị anaghị anọ ọdụ nʼimezu nkwa ya, dịka ndị ụfọdụ nʼahụta ya na ọ bụ ịnọ ọdụ. Kama o nwere ntachiobi nʼebe unu nọ, nʼihi na ọ chọghị ka onye ọbụla laa nʼiyi, kama ọ chọrọ ka onye ọbụla bịaruo na nchegharị.
10 Ingawa, siku ya Bwana itakuja kama mwizi, mbingu itapita kwa kupaza kelele. Vitu vitateketezwa kwa moto. Nchi na vitu vyote vilivyomo vitafunuliwa wazi.
Ma ụbọchị Onyenwe anyị ga-abịa dịka onye ohi. Nʼụbọchị ahụ, eluigwe ga-eji oke ụzụ gafee. Ihe niile dị nʼeluigwe ga-agba ọkụ, laa nʼiyi. Ụwa na ọrụ niile a rụrụ nʼime ya ga-erepịakwa ọkụ nʼotu ntabi anya.
11 Kwa kuwa vitu vyote vutateketezwa kwa njia hii. Je utakuwa mtu wa aina gani? Uishi kitakatifu na maisha ya kimungu.
Ebe ọ bụ na ihe niile gbara anyị gburugburu ga-esi otu a laa nʼiyi, ụdị ndị dị aṅaa ka unu kwesiri ịbụ? Unu kwesiri ị na-ebi ndụ dị nsọ na nke ịsọpụrụ Chineke,
12 Inakupasa kujua na kutambua haraka ujio wa siku ya Mungu. Siku hiyo mbingu itateketezwa kwa moto. Na vitu vitayeyushwa katika joto kali.
dịka unu na-ele anya ọbịbịa ụbọchị nke Chineke, na-echesikwa ya ike ka ọ bịa ngwangwa. Nʼihi na ọ bụ ụbọchị a ga-amụnye eluigwe niile ọkụ, mee ka ihe niile dị na ya gbaze bụrụ ihe na-agaghị adịkwa.
13 Lakini kutokana na ahadi yake, tunasubiri mbingu mpya na nchi mpya, ambapo wenye haki wataishi
Ma anyị na-ele anya mmezu nkwa ahụ o kwere, nkwa inye anyị eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ ebe ezi omume naanị ga-adị.
14 Hivyo wapendwa kwa kuwa tunatarajia vitu hivi, jitahidi kuwa makini na kutolaumika na kuwa na amani pamoja naye.
Bikonu ndị m hụrụ nʼanya, mgbe unu nọ na-ele anya ihe ndị a, jisienụ ike hụ na aka unu dị ọcha, ndị na-enweghị ịta ụta na ndị ha na ya dị nʼudo.
15 Na zingatia uvumilivu wa Bwana wetu katika wokovu, kama mpendwa kaka yetu Paulo, alivyowaandikia ninyi, kutokana na hekima ambayo alipewa.
Chetakwanụ na ntachiobi Onyenwe anyị pụtara nzọpụta, dịka ezi nwanna anyị Pọl jiri amamihe Chineke nyere ya deere unu ihe banyere ya.
16 Paulo anaongelea hayo yote katika barua zake, kuna vitu ambavyo ni vigumu kuvielewa. Watu wasio na adabu na uimara wameviharibu vitu hivyo, Na kama wanavyofanya kwa maandiko. Kuelekea maangamizi yao.
O na-ede otu ihe ahụ nʼakwụkwọ ozi ya niile, na-ekwu ihe banyere ihe ndị a nʼime ha. E nwere ụfọdụ ihe o kwuru nke siri ike ịghọta nke ndị nzuzu na ndị na-amaghị ihe na-akọwa dịka ha si chepụta nʼobi ha. Ha asụgharịala ihe o dere dịka ha na-emekwa mpaghara akwụkwọ nsọ ụfọdụ, si otu a wetara onwe ha ịla nʼiyi.
17 Hivyo, wapendwa kwa kuwa mnayafahamu hayo. Jilindeni wenyewe ili kwamba msipotoshwe na udanganyifu wa walaghai na kupoteza uaminifu.
Ya mere, ezi ndị enyi m, ebe unu matara nke a, nọrọnụ na nche ka a ghara isite na njehie ndị na-emebi iwu duhie unu, ime ka unu si nʼọnọdụ unu daa.
18 Lakini mkue katika neema na ufahamu wa Bwana na mwokozi Yesu Kristo. Na sasa utukufu una yeye sasa na milele. Amina. (aiōn )
Bụrụnụ ndị na-eto eto nʼime amara. Bụrụkwanụ ndị na-aga nʼihu ịmụta ihe banyere Onyenwe anyị na Onye nzọpụta anyị Jisọs Kraịst nke ọma. Ka otuto dịrị ya ugbu a na mgbe niile ebighị ebi. Amen. (aiōn )