< Zaburi 7 >

1 Ombolezo la Daudi kwa Bwana kwa sababu ya Kushi, Mbenyamini. Ee Bwana, Mungu wangu, ninakukimbilia wewe, uniokoe na kunikomboa na wote wanaonifuatia,
Abụ Shiggaion nke Devid, nke ọ bụkuru Onyenwe anyị banyere Kush, onye Benjamin. Onyenwe anyị Chineke m, nʼime gị ka m gbabara; zọpụta m, ma napụta m site nʼaka ndị niile na-achụ m ọsọ,
2 la sivyo watanirarua kama simba na kunichana vipande vipande, asiwepo wa kuniokoa.
ma ọ bụ ha adọkaa m dịka ọdụm, ha ga-adọsasịkwa m ebe mmadụ ọbụla enweghị ike ịnapụta m.
3 Ee Bwana, Mungu wangu, kama nimetenda haya na kuna hatia mikononi mwangu,
O Onyenwe anyị Chineke m, ọ bụrụ na m mere ihe dị otu a; ọ bụrụkwa na aka m adịghị ọcha.
4 au ikiwa nimemtenda uovu aliye na amani nami, au nimemnyangʼanya adui yangu pasipo sababu,
Ọ bụrụ na m jiri ihe ọjọọ kwụghachi onye mụ na ya nọ nʼudo ụgwọ, maọbụ site nʼụzọ na-ezighị ezi zuo ihe onye iro m.
5 basi adui anifuatie na kunipata, auponde uhai wangu ardhini na kunilaza mavumbini.
Mgbe ahụ, ka onye iro m chụọ m ọsọ, jide m; ka ọ tụọ m nʼala zọpịa ndụ m, mee ka m bụrụ onye a ga-ahapụ nʼuzuzu nʼọnọdụ ọdịndụ-ọnwụkamma. (Sela)
6 Amka kwa hasira yako, Ee Bwana, inuka dhidi ya ghadhabu ya adui zangu. Amka, Mungu wangu, uamue haki.
Bilie, Onyenwe anyị, nʼiwe gị, bilie megide oke iwe ndị iro m; teta Chineke m, kpee ikpe ziri ezi.
7 Kusanyiko la watu na likuzunguke. Watawale kutoka juu.
Ka nzukọ niile chịkọtara onwe ha ọnụ gbaa gị gburugburu, ebe ị na-anọkwasịkwa nʼebe dị elu na-achị ha.
8 Bwana na awahukumu kabila za watu. Nihukumu Ee Bwana, kwa kadiri ya haki yangu, kwa kadiri ya uadilifu wangu, Ewe Uliye Juu Sana.
Ka Onyenwe anyị kpee ụmụ mmadụ niile ikpe. Kpee m ikpe, O Onyenwe anyị, dịka ezi omume m si dị, na dịka izuoke m si dị, gị Onye kachasị ihe niile elu.
9 Ee Mungu mwenye haki, uchunguzaye mawazo na mioyo, komesha ghasia za waovu na ufanye wenye haki waishi kwa amani.
O Chineke onye ezi omume, onye na-enyochapụta echiche na obi mmadụ, mee ka ihe ike ndị ajọ omume bịa na njedebe meekwa ka ndị ezi omume guzosie ike.
10 Ngao langu ni Mungu Aliye Juu Sana, awaokoaye wanyofu wa moyo.
Chineke nke kachasị ihe niile elu, bụ ọta m, ọ na-azọpụta ndị niile obi ha ziri ezi.
11 Mungu ni mwamuzi mwenye haki, Mungu aghadhibikaye kila siku.
Chineke bụ onye na-ekpe ikpe ziri ezi, Chineke, onye na-ezipụta oke iwe ya kwa ụbọchị.
12 Kama hakutuhurumia, atanoa upanga wake, ataupinda na kuufunga uzi upinde wake.
Ọ bụrụ na onye ahụ echegharịghị, ọ ga-amụ mma agha ya ka ọ dịrị nkọ, ọ ga-arọgọ ụta ya, kwadokwa ịgba ya.
13 Ameandaa silaha zake kali, ameweka tayari mishale yake ya moto.
Ọ kwadoola ngwa agha niile nke ọnwụ; ọ na-eme ka àkụ ya bụrụ nke na-ere ọkụ.
14 Yeye aliye na mimba ya uovu na achukuaye mimba ya ghasia huzaa uongo.
Onye ọbụla dị ime ajọ ihe, na-atụrụ ime okwu na ụka mụpụtakwa ngharịpụ nke ụgha na-eweta.
15 Yeye achimbaye shimo na kulifukua hutumbukia katika shimo alilochimba mwenyewe.
Ma onye ahụ na-egwu olulu na-adaba nʼime olulu ahụ o gwuru.
16 Ghasia azianzishazo humrudia mwenyewe, ukatili wake humrudia kichwani.
Nsogbu ahụ ọ kpaliri na-abịakwasị ya ihe ike ahụ ọ kwadooro na-alaghachikwa azụ dakwasị ya nʼisi.
17 Nitamshukuru Bwana kwa ajili ya haki yake, na nitaliimbia sifa jina la Bwana Aliye Juu Sana.
Aga m enye Onyenwe anyị ekele nʼihi ezi omume ya, aga m abụku aha Onyenwe anyị, Onye kachasị ihe niile elu abụ otuto.

< Zaburi 7 >