< Abụ Ọma 89 >

1 Abụ maskil nke Etan, onye Ezra. Aga m abụ abụ banyere oke ịhụnanya Onyenwe anyị ruo mgbe ebighị ebi; aga m eji ọnụ m mee ka ọgbọ niile mara maka ikwesi ntụkwasị obi gị.
A maschil of Ethan the Ezrahite. I will sing of Yahweh's acts of covenant faithfulness forever. I will proclaim your truthfulness to future generations.
2 Aga m ekwupụta na ịhụnanya gị na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi; na i mere ka ikwesi ntụkwasị obi gị, guzosie ike nʼeluigwe.
For I have said, “Covenant faithfulness has been established forever; your truthfulness you have established in the heavens.”
3 Onyenwe anyị sịrị, “Mụ na onye m họpụtara agbaala ndụ. Aṅụọkwala m iyi nye ohu m Devid sị,
“I have made a covenant with my chosen one, I have made an oath to David my servant.
4 ‘Aga m eme ka agbụrụ gị guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi meekwa ka ocheeze gị dịgide ruo ọgbọ niile.’” (Sela)
I will establish your descendants forever, and I will establish your throne through all generations.” (Selah)
5 O Onyenwe anyị, eluigwe na-eto ọrụ ebube gị niile, na ikwesi ntụkwasị obi gị, nʼetiti nzukọ ndị dị nsọ.
The heavens praise your wonders, Yahweh; your truthfulness is praised in the assembly of the holy ones.
6 Nʼihi, ọ bụ onye nʼeluigwe niile, ka a ga-eji tụnyere Onyenwe anyị? Onye yiri Onyenwe anyị nʼetiti ndị mmụọ ozi niile?
For who in the skies can be compared to Yahweh? Who among the sons of the gods is like Yahweh?
7 Na nzukọ ndị nsọ, Chineke bụ onye a na-atụ oke egwu; ọ dị oke egwu karịa ndị niile gbara ya gburugburu.
He is a God who is greatly honored in the council of the holy ones and is awesome among all who surround him.
8 O Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile, onye dịka gị? Gị, O Onyenwe anyị, dị ike nke ukwuu, ikwesi ntụkwasị obi gị na-agba gị gburugburu.
Yahweh God of hosts, who is strong like you, Yahweh? Your truthfulness surrounds you.
9 Ị na-achị osimiri nke ji ike na-asọ; mgbe ebili mmiri ya na-amali elu; i na-eme ka ha dajụọ.
You rule the raging sea; when the waves surge, you calm them.
10 Ị zọpịara Rehab dịka otu nʼime ndị ahụ e gburu egbu; jiri aka gị dị ike chụsasịa ndị iro gị.
You crushed Rahab as one who is killed. You scattered your enemies with your strong arm.
11 Ọ bụ gị nwe eluigwe; gị nwekwa ụwa, ọ bụ gị tọrọ ntọala elu ụwa dum, na ihe niile dị nʼime ya.
The heavens belong to you, and the earth also. You made the world and all it contains.
12 Ọ bụ gị kere ugwu na ndịda; Taboa na Hemon na-abụ abụ ọṅụ nʼihi aha gị.
You created the north and the south. Tabor and Hermon rejoice in your name.
13 Aka gị ka e mejupụtara nʼike; aka gị dị ike, a na-ebuli aka nri gị elu.
You have a mighty arm and a strong hand, and your right hand is high.
14 Ezi omume na ikpe ziri ezi, bụ ntọala ocheeze gị; ịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi, na-aga nʼihu gị.
Righteousness and justice are the foundation of your throne. Covenant faithfulness and trustworthiness come before you.
15 Ndị a gọziri agọzi ka ndị ahụ bụ ndị na-eji olu iti mkpu ọṅụ na-abụku gị abụ, ndị na-ejegharịkwa nʼìhè nke ihu gị, O Onyenwe anyị.
Blessed are the people who worship you! Yahweh, they walk in the light of your face.
16 Ha na-aṅụrị ọṅụ nʼaha gị ogologo ụbọchị niile; ha na-aṅụrị nʼezi omume gị.
They rejoice in your name all day long, and in your righteousness they exalt you.
17 Nʼihi na ị bụ ebube na ike ha, site nʼihuọma gị, ị na-ebuli mpi anyị elu.
You are their majestic strength, and by your favor we are victorious.
18 Nʼezie, ọta anyị bụ nke Onyenwe anyị, eze anyị bụkwa nke Onye nsọ Izrel.
For our shield belongs to Yahweh; our king belongs to the Holy One of Israel.
19 I kwuru okwu otu mgbe site nʼọhụ, nye ndị gị kwesiri ntụkwasị obi sị: “Enyela m otu onye dị ike agha ike; Ebuliela m otu nwa okorobịa elu site nʼetiti ndị m.
Long ago you spoke in a vision to your faithful ones; you said, “I have set a crown on a mighty one.” I have raised up one chosen from among the people.
20 Achọtala m Devid ohu m, were mmanụ nsọ m tee ya.
I have chosen David my servant; with my holy oil have I anointed him.
21 Aka m ga-agba ya ume; nʼezie, aka m ga-eme ka ọ dị ike.
My hand will support him; my arm will strengthen him.
22 Ọ dịghị onye iro ga-abịakwasị ya, na mberede; ọ dịghị onye ajọ omume ga-emegbu ya.
No enemy will deceive him; no son of wickedness will oppress him.
23 Aga m etigbu ndị iro ya niile nʼihu ya. Aga m emekwa ka ndị niile na-akpọ ya asị laa nʼiyi.
I will crush his enemies before him; I will kill those who hate him.
24 Ịhụnanya m kwesiri ntụkwasị obi ga-adịnyere ya, site nʼaha m, a ga-ebuli mpi ya elu.
My truth and my covenant faithfulness will be with him; by my name he will be victorious.
25 M ga-edo aka ya nʼoke osimiri, dokwaa aka nri ya nʼosimiri niile.
I will place his hand over the sea and his right hand over the rivers.
26 Ọ ga-akpọ m sị m, ‘Ị bụ Nna m, bụrụkwa Chineke m, na oke Nkume nzọpụta m.’
He will call out to me, 'You are my Father, my God, and the rock of my salvation.'
27 Aga m eme ya nwa mbụ m, onye kachasị dị elu nʼebe eze niile nke ụwa nọ.
I also will place him as my firstborn son, the most exalted of the kings of the earth.
28 Aga m eme ka ịhụnanya m nwere nʼebe ọ nọ dịgide ruo ebighị ebi, ọgbụgba ndụ mụ na ya ga-adịgidekwa.
I will extend my covenant faithfulness to him forever; and my covenant with him will be secure.
29 Aga m eme ka agbụrụ ya guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi, ocheeze ya ga-adịgidekwa dịka eluigwe na-adịgide.
I will make his descendants endure forever and his throne as enduring as the skies above.
30 “Ọ bụrụ na ụmụ ya elefuo iwu m niile anya, gharakwa ijegharị nʼụzọ m niile,
If his children forsake my law and do not walk in my regulations,
31 ọ bụrụ na ha elelịa ụkpụrụ m niile anya, hapụkwa idebe ihe m nyere ha nʼiwu,
if they break my rules and do not keep my commands,
32 aga m eji mkpọrọ taa ha ahụhụ maka mmehie ha, tikwaa ha ụtarị maka njehie ha;
then will I punish their rebellion with a rod and their iniquity with blows.
33 ma agaghị m ewezuga ịhụnanya m, nʼebe ha nọ. Ma ọ bụ laa azụ nʼikwesị ntụkwasị obi m.
But I will not remove my steadfast love from him or be unfaithful to my promise.
34 Agaghị m emerụ ọgbụgba ndụ m. Agakwaghị m agbanwe ihe ọbụla siterela nʼọnụ m pụta.
I will not break my covenant or change the words of my lips.
35 Ejirila m ịdị nsọ m ṅụọ iyi, kpebie na m apụghị ịghara Devid ụgha,
Once and for all I have sworn by my holiness— I will not lie to David:
36 na agbụrụ ya ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi, ocheeze ya ga-adịgidekwa nʼihu m ka anyanwụ na-adịgide.
his descendants will continue forever and his throne as long as the sun before me.
37 Ọ ga-adịgide ruo ebighị ebi dịka ọnwa. E, dịka ọnwa ahụ, onye akaebe m kwesiri ntụkwasị obi na mbara eluigwe.” (Sela)
It will be established forever like the moon, the faithful witness in the sky.” (Selah)
38 Ma ị jụla, i werela nlelị jụkwa, i na-ewe iwe dị ukwu megide onye gị e tere mmanụ.
But you have refused and rejected; you have been angry with your anointed king.
39 Ị jụla ọgbụgba ndụ gị na ohu gị gbara i merụọla okpueze ya nʼime ntụ dị nʼala.
You have renounced the covenant of your servant. You have desecrated his crown on the ground.
40 Ị kụtuola mgbidi gbara ya gburugburu, i meela ka ebe ya niile e wusiri ike bụrụ ihe dapịara adapịa.
You have broken down all his walls. You have ruined his strongholds.
41 Ndị niile si ụzọ ahụ na-agafe, ezuruchaala ihe niile o nwere. Ndị agbataobi ya na-akwakwa ya emo.
All who pass by have robbed him. He has become an object of disgust to his neighbors.
42 I meela ka aka nri ndị iro ya dị elu; mekwaa ka ndị iro ya ṅụrịa ọṅụ.
You have raised the right hand of his enemies; you have made all his enemies rejoice.
43 I meela ka aka o ji jide mma agha ya sụọ ngọngọ, i nyereghị ya aka mgbe agha dara.
You turn back the edge of his sword and have not made him stand when in battle.
44 I meela ka ịma mma ya gwụsịa. Ị tụdakwala ocheeze ya nʼala.
You have brought his splendor to an end; you have brought down his throne to the ground.
45 I meela ka ụbọchị ndụ nke okorobịa ya dị mkpụmkpụ. I ji ihere dịka akwa kpuchie ya.
You have shortened the days of his youth. You have covered him with shame. (Selah)
46 Ruo ole mgbe Onyenwe anyị, ka ị ga-ezonarị onwe gị? Ruo ole mgbe ka iwe gị dị ukwuu ga-eregide dịka ọkụ?
How long, Yahweh? Will you hide yourself, forever? How long will your anger burn like fire?
47 Cheta, na ndụ m bụ ihe na-agafe ngwangwa. Nʼihi ihe efu gịnị ka i ji kee mmadụ niile!
Oh, think about how short my time is, and for what uselessness you have created all the children of mankind!
48 Olee onye ahụ nwere ike ịdị ndụ ghara ịhụ ọnwụ anya, maọbụ zọpụta onwe ya site nʼike nke ili? (Sela) (Sheol h7585)
Who can live and not die, or rescue his own life from the hand of Sheol? (Selah) (Sheol h7585)
49 O Onyenwe anyị, olee ebe oke ịhụnanya mbụ dị, nke i sitere nʼikwesị ntụkwasị obi gị ṅụọrọ Devid nʼiyi?
Lord, where are your former acts of covenant faithfulness that you swore to David in your truthfulness?
50 Onyenwe m, cheta otu e si leda ndị ohu gị anya, otu m si anagide nʼime obi m ịchị ọchị niile nke ndị mba niile.
Call to mind, Lord, the mocking directed against your servants and how I bear in my heart so many insults from the nations.
51 O Onyenwe anyị, ịchị ọchị nke ndị iro gị ji akwa m emo, nke ha ji lelịa nzọ ụkwụ niile nke onye gị i tere mmanụ.
Your enemies hurl insults, Yahweh; they mock the footsteps of your anointed one.
52 Otuto dịrị Onyenwe anyị ruo mgbe ebighị ebi.
Blessed be Yahweh forever. Amen and Amen.

< Abụ Ọma 89 >