Preface
Read
+
Publisher
Nainoia, Inc.
PO Box 462, Bellefonte, PA 16823
(814) 470-8028
Nainoia Inc, Publisher
LinkedIn/NAINOIA-INC
Third Party Publisher Resources
Request Custom Formatted Verses
Please contact us below
Submit your proposed corrections
I understand that the Aionian Bible republishes public domain and Creative Commons Bible texts and that volunteers may be needed to present the original text accurately. I also understand that apocryphal text is removed and most variant verse numbering is mapped to the English standard. I have entered my corrections under the verse(s) below. Proposed corrections to the The Igbo Holy Bible for Everyone, Psalms Chapter 89 https://www.AionianBible.org/Bibles/Igbo---Igbo-Bible/Psalms/89 1) Abụ maskil nke Etan, onye Ezra. Aga m abụ abụ banyere oke ịhụnanya Onyenwe anyị ruo mgbe ebighị ebi; aga m eji ọnụ m mee ka ọgbọ niile mara maka ikwesi ntụkwasị obi gị. 2) Aga m ekwupụta na ịhụnanya gị na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi; na i mere ka ikwesi ntụkwasị obi gị, guzosie ike nʼeluigwe. 3) Onyenwe anyị sịrị, “Mụ na onye m họpụtara agbaala ndụ. Aṅụọkwala m iyi nye ohu m Devid sị, 4) ‘Aga m eme ka agbụrụ gị guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi meekwa ka ocheeze gị dịgide ruo ọgbọ niile.’” (Sela) 5) O Onyenwe anyị, eluigwe na-eto ọrụ ebube gị niile, na ikwesi ntụkwasị obi gị, nʼetiti nzukọ ndị dị nsọ. 6) Nʼihi, ọ bụ onye nʼeluigwe niile, ka a ga-eji tụnyere Onyenwe anyị? Onye yiri Onyenwe anyị nʼetiti ndị mmụọ ozi niile? 7) Na nzukọ ndị nsọ, Chineke bụ onye a na-atụ oke egwu; ọ dị oke egwu karịa ndị niile gbara ya gburugburu. 8) O Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile, onye dịka gị? Gị, O Onyenwe anyị, dị ike nke ukwuu, ikwesi ntụkwasị obi gị na-agba gị gburugburu. 9) Ị na-achị osimiri nke ji ike na-asọ; mgbe ebili mmiri ya na-amali elu; i na-eme ka ha dajụọ. 10) Ị zọpịara Rehab dịka otu nʼime ndị ahụ e gburu egbu; jiri aka gị dị ike chụsasịa ndị iro gị. 11) Ọ bụ gị nwe eluigwe; gị nwekwa ụwa, ọ bụ gị tọrọ ntọala elu ụwa dum, na ihe niile dị nʼime ya. 12) Ọ bụ gị kere ugwu na ndịda; Taboa na Hemon na-abụ abụ ọṅụ nʼihi aha gị. 13) Aka gị ka e mejupụtara nʼike; aka gị dị ike, a na-ebuli aka nri gị elu. 14) Ezi omume na ikpe ziri ezi, bụ ntọala ocheeze gị; ịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi, na-aga nʼihu gị. 15) Ndị a gọziri agọzi ka ndị ahụ bụ ndị na-eji olu iti mkpu ọṅụ na-abụku gị abụ, ndị na-ejegharịkwa nʼìhè nke ihu gị, O Onyenwe anyị. 16) Ha na-aṅụrị ọṅụ nʼaha gị ogologo ụbọchị niile; ha na-aṅụrị nʼezi omume gị. 17) Nʼihi na ị bụ ebube na ike ha, site nʼihuọma gị, ị na-ebuli mpi anyị elu. 18) Nʼezie, ọta anyị bụ nke Onyenwe anyị, eze anyị bụkwa nke Onye nsọ Izrel. 19) I kwuru okwu otu mgbe site nʼọhụ, nye ndị gị kwesiri ntụkwasị obi sị: “Enyela m otu onye dị ike agha ike; Ebuliela m otu nwa okorobịa elu site nʼetiti ndị m. 20) Achọtala m Devid ohu m, were mmanụ nsọ m tee ya. 21) Aka m ga-agba ya ume; nʼezie, aka m ga-eme ka ọ dị ike. 22) Ọ dịghị onye iro ga-abịakwasị ya, na mberede; ọ dịghị onye ajọ omume ga-emegbu ya. 23) Aga m etigbu ndị iro ya niile nʼihu ya. Aga m emekwa ka ndị niile na-akpọ ya asị laa nʼiyi. 24) Ịhụnanya m kwesiri ntụkwasị obi ga-adịnyere ya, site nʼaha m, a ga-ebuli mpi ya elu. 25) M ga-edo aka ya nʼoke osimiri, dokwaa aka nri ya nʼosimiri niile. 26) Ọ ga-akpọ m sị m, ‘Ị bụ Nna m, bụrụkwa Chineke m, na oke Nkume nzọpụta m.’ 27) Aga m eme ya nwa mbụ m, onye kachasị dị elu nʼebe eze niile nke ụwa nọ. 28) Aga m eme ka ịhụnanya m nwere nʼebe ọ nọ dịgide ruo ebighị ebi, ọgbụgba ndụ mụ na ya ga-adịgidekwa. 29) Aga m eme ka agbụrụ ya guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi, ocheeze ya ga-adịgidekwa dịka eluigwe na-adịgide. 30) “Ọ bụrụ na ụmụ ya elefuo iwu m niile anya, gharakwa ijegharị nʼụzọ m niile, 31) ọ bụrụ na ha elelịa ụkpụrụ m niile anya, hapụkwa idebe ihe m nyere ha nʼiwu, 32) aga m eji mkpọrọ taa ha ahụhụ maka mmehie ha, tikwaa ha ụtarị maka njehie ha; 33) ma agaghị m ewezuga ịhụnanya m, nʼebe ha nọ. Ma ọ bụ laa azụ nʼikwesị ntụkwasị obi m. 34) Agaghị m emerụ ọgbụgba ndụ m. Agakwaghị m agbanwe ihe ọbụla siterela nʼọnụ m pụta. 35) Ejirila m ịdị nsọ m ṅụọ iyi, kpebie na m apụghị ịghara Devid ụgha, 36) na agbụrụ ya ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi, ocheeze ya ga-adịgidekwa nʼihu m ka anyanwụ na-adịgide. 37) Ọ ga-adịgide ruo ebighị ebi dịka ọnwa. E, dịka ọnwa ahụ, onye akaebe m kwesiri ntụkwasị obi na mbara eluigwe.” (Sela) 38) Ma ị jụla, i werela nlelị jụkwa, i na-ewe iwe dị ukwu megide onye gị e tere mmanụ. 39) Ị jụla ọgbụgba ndụ gị na ohu gị gbara i merụọla okpueze ya nʼime ntụ dị nʼala. 40) Ị kụtuola mgbidi gbara ya gburugburu, i meela ka ebe ya niile e wusiri ike bụrụ ihe dapịara adapịa. 41) Ndị niile si ụzọ ahụ na-agafe, ezuruchaala ihe niile o nwere. Ndị agbataobi ya na-akwakwa ya emo. 42) I meela ka aka nri ndị iro ya dị elu; mekwaa ka ndị iro ya ṅụrịa ọṅụ. 43) I meela ka aka o ji jide mma agha ya sụọ ngọngọ, i nyereghị ya aka mgbe agha dara. 44) I meela ka ịma mma ya gwụsịa. Ị tụdakwala ocheeze ya nʼala. 45) I meela ka ụbọchị ndụ nke okorobịa ya dị mkpụmkpụ. I ji ihere dịka akwa kpuchie ya. 46) Ruo ole mgbe Onyenwe anyị, ka ị ga-ezonarị onwe gị? Ruo ole mgbe ka iwe gị dị ukwuu ga-eregide dịka ọkụ? 47) Cheta, na ndụ m bụ ihe na-agafe ngwangwa. Nʼihi ihe efu gịnị ka i ji kee mmadụ niile! 48) Olee onye ahụ nwere ike ịdị ndụ ghara ịhụ ọnwụ anya, maọbụ zọpụta onwe ya site nʼike nke ili? (Sela) (Sheol h7585) 49) O Onyenwe anyị, olee ebe oke ịhụnanya mbụ dị, nke i sitere nʼikwesị ntụkwasị obi gị ṅụọrọ Devid nʼiyi? 50) Onyenwe m, cheta otu e si leda ndị ohu gị anya, otu m si anagide nʼime obi m ịchị ọchị niile nke ndị mba niile. 51) O Onyenwe anyị, ịchị ọchị nke ndị iro gị ji akwa m emo, nke ha ji lelịa nzọ ụkwụ niile nke onye gị i tere mmanụ. 52) Otuto dịrị Onyenwe anyị ruo mgbe ebighị ebi. Additional comments?
Refresh Captcha
The world's first Holy Bible un-translation!