< Abụ Ọma 80 >

1 Abụ Ọma nke dịrị onyeisi Abụ. Ọ bụ olu abụ eji ekwe “Okoko lili nke Ọgbụgba Ndụ” Abụ Ọma nke Asaf. Nụrụ olu anyị, O Onye ọzụzụ atụrụ nke Izrel, gị onye na-edu Josef dịka igwe atụrụ. Gị onye na-anọdụ dịka eze, nʼetiti cherubim, nwupụta Ìhè
Give ear, O Shepherd of Israel, thou that leadest Joseph like a flock; thou that dwellest between the cherubims, shine forth.
2 nʼihu Ifrem, Benjamin na Manase. Kpọtee ịdị ike gị, bịa zọpụta anyị.
Before Ephraim and Benjamin and Manasseh stir up thy strength, and come and save us.
3 O Chineke, kpọghachi anyị azụ, mee ka ihu gị nwukwasị anyị, ka e nwee ike ịzọpụta anyị.
Turn us again, O God, and cause thy face to shine; and we shall be saved.
4 O Onyenwe anyị, Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile ruo ole mgbe ka iwe gị ga-adị ọkụ megide ekpere ndị gị?
O Yhwh God of Armies, how long wilt thou be angry against the prayer of thy people?
5 I jirila anya mmiri dịka a ga-asị na ọ bụ achịcha zụọ ha nri; i meela ka ha ṅụọ anya mmiri nʼihe ọtụtụ.
Thou feedest them with the bread of tears; and givest them tears to drink in great measure.
6 I meela ka anyị bụrụ ihe na-eweta esemokwu nʼetiti ndị agbataobi anyị, ndị iro anyị na-achịkwa anyị ọchị.
Thou makest us a strife unto our neighbours: and our enemies laugh among themselves.
7 O Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile, kpọghachi anyị azụ, mee ka ihu gị nwukwasị anyị, ka e nwee ike ịzọpụta anyị.
Turn us again, O God of Armies, and cause thy face to shine; and we shall be saved.
8 I sitere nʼala Ijipt wepụta osisi vaịnị; ị chụpụrụ mba ndị ọzọ, kụọ ya.
Thou hast brought a vine out of Egypt: thou hast cast out the heathen, and planted it.
9 Ị sụchaara ya ala, mgbọrọgwụ ya bara nʼime ala nke ọma, o jupụtakwara ala ahụ niile.
Thou preparedst room before it, and didst cause it to take deep root, and it filled the land.
10 Ndo ya kpuchiri ugwu niile, alaka ya gbasara kpuchie osisi sida ukwu sida.
The hills were covered with the shadow of it, and the boughs thereof were like the goodly cedars.
11 Ọ wasaala alaka ya ruo oke osimiri wasaakwa ume ya ruo osimiri.
She sent out her boughs unto the sea, and her branches unto the river.
12 Gịnị mere i ji tiwasịa mgbidi ya niile si otu a mee ka ndị niile na-agafe ghọrọ mkpụrụ ya?
Why hast thou then broken down her hedges, so that all they which pass by the way do pluck her?
13 Oke ezi si nʼoke ọhịa na-emebisi ya, ụmụ ahụhụ si nʼọhịa dị iche iche na-ejikwa ya emere ihe oriri.
The boar out of the wood doth waste it, and the wild beast of the field doth devour it.
14 Lọghachikwute anyị, O Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile. Si nʼeluigwe ledata anya ma hụ! Letakwa osisi vaịnị a,
Return, we beseech thee, O God of Armies: look down from heaven, and behold, and visit this vine;
15 mgbọrọgwụ nke aka nri gị kụrụ, ọkpara nke ị zụlitere nye onwe gị.
And the vineyard which thy right hand hath planted, and the branch that thou madest strong for thyself.
16 E gbutuola osisi vaịnị gị, e ji ọkụ repịa ya; mgbe ị bara mba, ndị gị na-ala nʼiyi.
It is burned with fire, it is cut down: they perish at the rebuke of thy countenance.
17 Ka aka gị dịkwasị nwoke ahụ nọ nʼaka nri gị, nwa nke mmadụ onye ị zụlitere nye onwe gị.
Let thy hand be upon the man of thy right hand, upon the son of man whom thou madest strong for thyself.
18 Mgbe ahụ, anyị agaghị esikwa nʼebe ị nọ laghachi azụ; tutee anyị, anyị ga-akpọkukwa aha gị.
So will not we go back from thee: quicken us, and we will call upon thy name.
19 Kpọghachi anyị azụ, O Onyenwe anyị, Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile mee ka ihu gị nwukwasị anyị, ka e nwee ike zọpụta anyị.
Turn us again, O Yhwh God of Armies, cause thy face to shine; and we shall be saved.

< Abụ Ọma 80 >