Preface
Read
+
Publisher
Nainoia, Inc.
PO Box 462, Bellefonte, PA 16823
(814) 470-8028
Nainoia Inc, Publisher
LinkedIn/NAINOIA-INC
Third Party Publisher Resources
Request Custom Formatted Verses
Please contact us below
Submit your proposed corrections
I understand that the Aionian Bible republishes public domain and Creative Commons Bible texts and that volunteers may be needed to present the original text accurately. I also understand that apocryphal text is removed and most variant verse numbering is mapped to the English standard. I have entered my corrections under the verse(s) below. Proposed corrections to the The Igbo Holy Bible for Everyone, Psalms Chapter 80 https://www.AionianBible.org/Bibles/Igbo---Igbo-Bible/Psalms/80 1) Abụ Ọma nke dịrị onyeisi Abụ. Ọ bụ olu abụ eji ekwe “Okoko lili nke Ọgbụgba Ndụ” Abụ Ọma nke Asaf. Nụrụ olu anyị, O Onye ọzụzụ atụrụ nke Izrel, gị onye na-edu Josef dịka igwe atụrụ. Gị onye na-anọdụ dịka eze, nʼetiti cherubim, nwupụta Ìhè 2) nʼihu Ifrem, Benjamin na Manase. Kpọtee ịdị ike gị, bịa zọpụta anyị. 3) O Chineke, kpọghachi anyị azụ, mee ka ihu gị nwukwasị anyị, ka e nwee ike ịzọpụta anyị. 4) O Onyenwe anyị, Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile ruo ole mgbe ka iwe gị ga-adị ọkụ megide ekpere ndị gị? 5) I jirila anya mmiri dịka a ga-asị na ọ bụ achịcha zụọ ha nri; i meela ka ha ṅụọ anya mmiri nʼihe ọtụtụ. 6) I meela ka anyị bụrụ ihe na-eweta esemokwu nʼetiti ndị agbataobi anyị, ndị iro anyị na-achịkwa anyị ọchị. 7) O Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile, kpọghachi anyị azụ, mee ka ihu gị nwukwasị anyị, ka e nwee ike ịzọpụta anyị. 8) I sitere nʼala Ijipt wepụta osisi vaịnị; ị chụpụrụ mba ndị ọzọ, kụọ ya. 9) Ị sụchaara ya ala, mgbọrọgwụ ya bara nʼime ala nke ọma, o jupụtakwara ala ahụ niile. 10) Ndo ya kpuchiri ugwu niile, alaka ya gbasara kpuchie osisi sida ukwu sida. 11) Ọ wasaala alaka ya ruo oke osimiri wasaakwa ume ya ruo osimiri. 12) Gịnị mere i ji tiwasịa mgbidi ya niile si otu a mee ka ndị niile na-agafe ghọrọ mkpụrụ ya? 13) Oke ezi si nʼoke ọhịa na-emebisi ya, ụmụ ahụhụ si nʼọhịa dị iche iche na-ejikwa ya emere ihe oriri. 14) Lọghachikwute anyị, O Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile. Si nʼeluigwe ledata anya ma hụ! Letakwa osisi vaịnị a, 15) mgbọrọgwụ nke aka nri gị kụrụ, ọkpara nke ị zụlitere nye onwe gị. 16) E gbutuola osisi vaịnị gị, e ji ọkụ repịa ya; mgbe ị bara mba, ndị gị na-ala nʼiyi. 17) Ka aka gị dịkwasị nwoke ahụ nọ nʼaka nri gị, nwa nke mmadụ onye ị zụlitere nye onwe gị. 18) Mgbe ahụ, anyị agaghị esikwa nʼebe ị nọ laghachi azụ; tutee anyị, anyị ga-akpọkukwa aha gị. 19) Kpọghachi anyị azụ, O Onyenwe anyị, Chineke, Onye pụrụ ime ihe niile mee ka ihu gị nwukwasị anyị, ka e nwee ike zọpụta anyị. Additional comments?
Refresh Captcha
The world's first Holy Bible un-translation!