< Abụ Ọma 57 >

1 Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Nke olu abụ “E bibikwala” Devid. Abụ miktam. Mgbe ọ gbapụrụ ga biri nʼime ọgba nkume nʼihi Sọl. Meere m ebere, O Chineke, meere m ebere, nʼihi na ọ bụ gị ka mkpụrụobi m ji mere ebe mgbaba. Ọ bụ na ndo nke nku gị abụọ ka m ga-agbaba tutuu ihe mbibi ndị a agafesịa.
למנצח אל תשחת לדוד מכתם בברחו מפני שאול במערה חנני אלהים חנני כי בך חסיה נפשי ובצל כנפיך אחסה עד יעבר הוות׃
2 Aga m akpọku Chineke nke kachasị ihe niile elu, Chineke na-emezuru m ihe niile na-akpa m mkpa.
אקרא לאלהים עליון לאל גמר עלי׃
3 Ọ na-esite nʼeluigwe zidata inyeaka ma zọpụta m na-abara ndị ahụ ji ike na-achụ m mba; (Sela) Chineke na-ezite ịhụnanya ya na ikwesi ntụkwasị obi ya.
ישלח משמים ויושיעני חרף שאפי סלה ישלח אלהים חסדו ואמתו׃
4 Anọ m nʼetiti ọtụtụ ọdụm; amanyere m ka m dina nʼetiti ajọ anụ ọhịa, ụmụ mmadụ ndị eze ha dị nkọ dịka àkụ na ùbe, ire ha dịkwa nkọ dịka mma agha.
נפשי בתוך לבאם אשכבה להטים בני אדם שניהם חנית וחצים ולשונם חרב חדה׃
5 O Chineke, ka e bulie gị elu karịa eluigwe niile; ka ebube gị dị nʼelu ụwa niile.
רומה על השמים אלהים על כל הארץ כבודך׃
6 Ha gbasaara ụkwụ m ụgbụ, ihe mgbu nyịturu m. Ha egwuola olulu nʼụzọ m si agafe, ma ha onwe ha adabala nʼime ya. (Sela)
רשת הכינו לפעמי כפף נפשי כרו לפני שיחה נפלו בתוכה סלה׃
7 Obi m dị njikere, o Chineke, obi m dị njikere sikwaa ike; aga m abụ abụ, kụkwaa egwu.
נכון לבי אלהים נכון לבי אשירה ואזמרה׃
8 Teta nʼụra mkpụrụobi m! Teta, ụbọ akwara na une! Aga m akpọte chi ọbụbọ.
עורה כבודי עורה הנבל וכנור אעירה שחר׃
9 O Onyenwe anyị, aga m eto gị nʼetiti mba niile; aga m abụ abụ banyere gị nʼetiti ndị niile dị iche iche.
אודך בעמים אדני אזמרך בל אמים׃
10 Nʼihi na ịhụnanya gị dị ukwuu na-eru na mbara eluigwe; ikwesi ntụkwasị obi gị na-erukwa mbara eluigwe.
כי גדל עד שמים חסדך ועד שחקים אמתך׃
11 O Chineke, ka e bulie gị elu karịa eluigwe; ka ebube gị dị nʼelu ụwa niile.
רומה על שמים אלהים על כל הארץ כבודך׃

< Abụ Ọma 57 >