Preface
Read
+
Publisher
Nainoia, Inc.
PO Box 462, Bellefonte, PA 16823
(814) 470-8028
Nainoia Inc, Publisher
LinkedIn/NAINOIA-INC
Third Party Publisher Resources
Request Custom Formatted Verses
Please contact us below
Submit your proposed corrections
I understand that the Aionian Bible republishes public domain and Creative Commons Bible texts and that volunteers may be needed to present the original text accurately. I also understand that apocryphal text is removed and most variant verse numbering is mapped to the English standard. I have entered my corrections under the verse(s) below. Proposed corrections to the The Igbo Holy Bible for Everyone, Psalms Chapter 57 https://www.AionianBible.org/Bibles/Igbo---Igbo-Bible/Psalms/57 1) Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Nke olu abụ “E bibikwala” Devid. Abụ miktam. Mgbe ọ gbapụrụ ga biri nʼime ọgba nkume nʼihi Sọl. Meere m ebere, O Chineke, meere m ebere, nʼihi na ọ bụ gị ka mkpụrụobi m ji mere ebe mgbaba. Ọ bụ na ndo nke nku gị abụọ ka m ga-agbaba tutuu ihe mbibi ndị a agafesịa. 2) Aga m akpọku Chineke nke kachasị ihe niile elu, Chineke na-emezuru m ihe niile na-akpa m mkpa. 3) Ọ na-esite nʼeluigwe zidata inyeaka ma zọpụta m na-abara ndị ahụ ji ike na-achụ m mba; (Sela) Chineke na-ezite ịhụnanya ya na ikwesi ntụkwasị obi ya. 4) Anọ m nʼetiti ọtụtụ ọdụm; amanyere m ka m dina nʼetiti ajọ anụ ọhịa, ụmụ mmadụ ndị eze ha dị nkọ dịka àkụ na ùbe, ire ha dịkwa nkọ dịka mma agha. 5) O Chineke, ka e bulie gị elu karịa eluigwe niile; ka ebube gị dị nʼelu ụwa niile. 6) Ha gbasaara ụkwụ m ụgbụ, ihe mgbu nyịturu m. Ha egwuola olulu nʼụzọ m si agafe, ma ha onwe ha adabala nʼime ya. (Sela) 7) Obi m dị njikere, o Chineke, obi m dị njikere sikwaa ike; aga m abụ abụ, kụkwaa egwu. 8) Teta nʼụra mkpụrụobi m! Teta, ụbọ akwara na une! Aga m akpọte chi ọbụbọ. 9) O Onyenwe anyị, aga m eto gị nʼetiti mba niile; aga m abụ abụ banyere gị nʼetiti ndị niile dị iche iche. 10) Nʼihi na ịhụnanya gị dị ukwuu na-eru na mbara eluigwe; ikwesi ntụkwasị obi gị na-erukwa mbara eluigwe. 11) O Chineke, ka e bulie gị elu karịa eluigwe; ka ebube gị dị nʼelu ụwa niile. Additional comments?
Refresh Captcha
The world's first Holy Bible un-translation!