< Abụ Ọma 57 >

1 Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Nke olu abụ “E bibikwala” Devid. Abụ miktam. Mgbe ọ gbapụrụ ga biri nʼime ọgba nkume nʼihi Sọl. Meere m ebere, O Chineke, meere m ebere, nʼihi na ọ bụ gị ka mkpụrụobi m ji mere ebe mgbaba. Ọ bụ na ndo nke nku gị abụọ ka m ga-agbaba tutuu ihe mbibi ndị a agafesịa.
Don mai bi da kaɗe-kaɗe. Da muryar “Kada Ka Hallaka.” Ta Dawuda. Wani miktam. Sa’ad da ya gudu daga Shawulu zuwa cikin kogo. Ka yi mini jinƙai, ya Allah, ka yi mini jinƙai, gama a gare ka raina yake samun mafaka. Zan sami mafaka a inuwar fikafikanka sai masifar ta wuce.
2 Aga m akpọku Chineke nke kachasị ihe niile elu, Chineke na-emezuru m ihe niile na-akpa m mkpa.
Na yi kuka ga Allah Mafi Ɗaukaka, ga Allah, wanda yake cika manufarsa gare ni.
3 Ọ na-esite nʼeluigwe zidata inyeaka ma zọpụta m na-abara ndị ahụ ji ike na-achụ m mba; (Sela) Chineke na-ezite ịhụnanya ya na ikwesi ntụkwasị obi ya.
Ya aika daga sama ya kuwa cece ni, yana tsawata wa waɗanda suke fafarata da zafi; (Sela) Allah yakan aika da ƙaunarsa da amincinsa.
4 Anọ m nʼetiti ọtụtụ ọdụm; amanyere m ka m dina nʼetiti ajọ anụ ọhịa, ụmụ mmadụ ndị eze ha dị nkọ dịka àkụ na ùbe, ire ha dịkwa nkọ dịka mma agha.
Ina tsakiyar zakoki; ina kwance a cikin namun jeji masu cin mutane, mutanen da haƙoransu masu ne da kuma kibiyoyi, waɗanda harshensu suna da kaifi kamar takobi.
5 O Chineke, ka e bulie gị elu karịa eluigwe niile; ka ebube gị dị nʼelu ụwa niile.
Bari a ɗaukaka ka, ya Allah, bisa sammai; bari ɗaukakarka ta kasance a dukan duniya.
6 Ha gbasaara ụkwụ m ụgbụ, ihe mgbu nyịturu m. Ha egwuola olulu nʼụzọ m si agafe, ma ha onwe ha adabala nʼime ya. (Sela)
Sun shimfiɗa raga don su kama ƙafafuna, damuwa ta sha ƙarfina. Sun haƙa rami a hanyata, amma su kansu suka fāɗa a cikinta. (Sela)
7 Obi m dị njikere, o Chineke, obi m dị njikere sikwaa ike; aga m abụ abụ, kụkwaa egwu.
Zuciyata tana nan daram, ya Allah, zuciyata tana nan daram; zan rera in kuma yi kaɗe-kaɗe.
8 Teta nʼụra mkpụrụobi m! Teta, ụbọ akwara na une! Aga m akpọte chi ọbụbọ.
Ka farka, raina! Ku farka, garaya da molo! Zan sa safe yă farka.
9 O Onyenwe anyị, aga m eto gị nʼetiti mba niile; aga m abụ abụ banyere gị nʼetiti ndị niile dị iche iche.
Zan yabe ka, ya Ubangiji, a cikin al’ummai; zan rera game da kai a cikin mutane.
10 Nʼihi na ịhụnanya gị dị ukwuu na-eru na mbara eluigwe; ikwesi ntụkwasị obi gị na-erukwa mbara eluigwe.
Gama ƙaunarka mai girma ce, tana kaiwa sammai; amincinka na kaiwa sarari.
11 O Chineke, ka e bulie gị elu karịa eluigwe; ka ebube gị dị nʼelu ụwa niile.
Bari a ɗaukaka ka, ya Allah, bisa sammai; bari ɗaukakarka ta kasance a dukan duniya.

< Abụ Ọma 57 >