< Abụ Ọma 44 >

1 Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ maskil nke ụmụ Kora. O Chineke, anyị anụla; nna anyị ha agwakwala anyị ihe ndị i mere nʼoge ha, nʼoge gara aga.
Al Músico principal: de los hijos de Coré: Masquil. OH Dios, con nuestros oídos hemos oído, nuestros padres nos han contado, la obra que hiciste en sus días, en los tiempos antiguos.
2 I ji aka gị chụpụ ndị mba ọzọ, ma kụnye nna nna anyị ha dịka osisi. I gwepịara ndị ahụ ma mee ka ndị nna anyị na-eto na-awasa.
Tú con tu mano echaste las gentes, y los plantaste á ellos; afligiste los pueblos, y los arrojaste.
3 Ọ bụghị site na mma agha ha ka ha ji merie nweta ala a, ha emerighị site nʼike nke aka ha; ọ bụ aka nri gị, aka gị, na ìhè nke ihu gị nyere ha mmeri, nʼihi na ị hụrụ ha nʼanya.
Porque no se apoderaron de la tierra por su espada, ni su brazo los libró; sino tu diestra, y tu brazo, y la luz de tu rostro, porque te complaciste en ellos.
4 Ị bụ eze m na Chineke m, onye na-ekpebi na Jekọb aghaghị inwe mmeri.
Tú, oh Dios, eres mi rey: manda saludes á Jacob.
5 Nʼihi ọ bụ naanị site nʼike gị, ya na aha gị, ka anyị ji zọda ndị iro anyị nʼokpuru ụkwụ anyị.
Por medio de ti sacudiremos á nuestros enemigos: en tu nombre atropellaremos á nuestros adversarios.
6 Atụkwasịghị m obi m nʼụta m, mma agha m anaghị enye m mmeri;
Porque no confiaré en mi arco, ni mi espada me salvará.
7 ma i na-enye anyị mmeri nʼebe ndị iro anyị nọ, ị na-eme ka ihere mee ndị na-eguzogide anyị.
Pues tú nos has guardado de nuestros enemigos, y has avergonzado á los que nos aborrecían.
8 Nʼime Chineke ka ịnya isi anyị dị ogologo ụbọchị niile, anyị ga-eto aha gị ruo mgbe ebighị ebi. (Sela)
En Dios nos gloriaremos todo tiempo, y para siempre loaremos tu nombre. (Selah)
9 Ma ugbu a, ị jụla anyị ma weda anyị nʼala; ị naghị esokwa ndị agha anyị apụ ọzọ.
Empero [nos] has desechado, y nos has hecho avergonzar; y no sales en nuestros ejércitos.
10 I mere ka anyị site nʼihu ndị iro anyị gbalaga, i meela ka ndị na-emegide anyị were aka ike napụ anyị ihe bụ nke anyị.
Nos hiciste retroceder del enemigo, y saqueáron[nos] para sí los que nos aborrecían.
11 Ị gbakụtara anyị azụ ka e ripịa anyị dịka atụrụ, ma chụsasịa anyị nʼetiti mba niile.
Pusístenos como á ovejas para comida, y esparcístenos entre las gentes.
12 I rere ndị gị ọnụ ala, ihe i retara ha abaghị uru nye gị.
Has vendido tu pueblo de balde, y no pujaste en sus precios.
13 I meela ka anyị bụrụ nkọcha nye ndị agbataobi anyị, anyị bụ ihe ịkwa emo na ihe ọchị nye ndị gbara anyị gburugburu.
Pusístenos por vergüenza á nuestros vecinos, por escarnio y por burla á los que nos rodean.
14 I meela anyị ka anyị bụrụ ihe ịmaatụ ọchị nʼetiti mba niile, ndị ọbụla hụrụ anyị na-efufe isi na mkparị.
Pusístenos por proverbio entre las gentes, por movimiento de cabeza en los pueblos.
15 Ogologo ụbọchị niile, ihere m dị m nʼihu, ihere m na-ekpuchikwa m ihu,
Cada día mi vergüenza está delante de mí, y cúbreme la confusión de mi rostro,
16 mgbe ndị nkwulu na ndị nkọcha na-eji m eme ihe ọchị, nʼihi onye iro, onye kpebiri ịbọ ọbọ.
Por la voz del que [me] vitupera y deshonra, por razón del enemigo y del que se venga.
17 Ọ bụ ezie na ihe ndị a adakwasịla anyị, ma anyị echefubeghị gị. Anyị enupubeghị isi nʼọgbụgba ndụ anyị na gị.
Todo esto nos ha venido, y no nos hemos olvidado de ti; y no hemos faltado á tu pacto.
18 Obi anyị ahapụbeghị gị! Anyị ahapụbekwaghị iso ụzọ gị.
No se ha vuelto atrás nuestro corazón, ni tampoco se han apartado nuestros pasos de tus caminos.
19 Ma i gwepịara anyị mee ka anyị bụrụ ebe nkịta ọhịa na-akpagharị, jirikwa oke ọchịchịrị kpuchie anyị.
Cuando nos quebrantaste en el lugar de los dragones, y nos cubriste con sombra de muerte,
20 Ọ bụrụ na anyị chefuru aha Chineke anyị, maọbụ na anyị gbasaara chi mba ọzọ aka anyị,
Si nos hubiésemos olvidado del nombre de nuestro Dios, ó alzado nuestras manos á dios ajeno,
21 ọ bụ na Chineke agaraghị achọpụta ya, ebe ọ maara ihe nzuzo niile dị nʼobi?
¿No demandaría Dios esto? porque él conoce los secretos del corazón.
22 Ọ bụ nʼihi gị ka anyị na ọnwụ ji agba mgba, ogologo ụbọchị niile. A na-ele anyị anya dịka atụrụ a gaje igbu egbu.
Empero por tu causa nos matan cada día; somos tenidos como ovejas para el matadero.
23 O, Onyenwe m teta! Gịnị mere i ji arahụ ụra? Kpọtee onwe gị! Ajụkwala anyị ruo mgbe ebighị ebi.
Despierta; ¿por qué duermes, Señor? Despierta, no te alejes para siempre.
24 Gịnị mere i ji ezopụ ihu gị, ma chefuo mmegbu na ịta ahụhụ anyị?
¿Por qué escondes tu rostro, y te olvidas de nuestra aflicción, y de la opresión nuestra?
25 E tidala anyị nʼala, nʼuzuzu, ahụ anyị rapara nʼaja
Porque nuestra alma está agobiada hasta el polvo: nuestro vientre está pegado con la tierra.
26 Bilie ma nyere anyị aka; gbapụta anyị maka ịhụnanya gị nke na-adịghị agwụ agwụ.
Levántate para ayudarnos, y redímenos por tu misericordia.

< Abụ Ọma 44 >