Preface
Read
+
Publisher
Nainoia, Inc.
PO Box 462, Bellefonte, PA 16823
(814) 470-8028
Nainoia Inc, Publisher
LinkedIn/NAINOIA-INC
Third Party Publisher Resources
Request Custom Formatted Verses
Please contact us below
Submit your proposed corrections
I understand that the Aionian Bible republishes public domain and Creative Commons Bible texts and that volunteers may be needed to present the original text accurately. I also understand that apocryphal text is removed and most variant verse numbering is mapped to the English standard. I have entered my corrections under the verse(s) below. Proposed corrections to the The Igbo Holy Bible for Everyone, Psalms Chapter 44 https://www.AionianBible.org/Bibles/Igbo---Igbo-Bible/Psalms/44 1) Abụ Ọma nke dịrị onyeisi abụ. Abụ maskil nke ụmụ Kora. O Chineke, anyị anụla; nna anyị ha agwakwala anyị ihe ndị i mere nʼoge ha, nʼoge gara aga. 2) I ji aka gị chụpụ ndị mba ọzọ, ma kụnye nna nna anyị ha dịka osisi. I gwepịara ndị ahụ ma mee ka ndị nna anyị na-eto na-awasa. 3) Ọ bụghị site na mma agha ha ka ha ji merie nweta ala a, ha emerighị site nʼike nke aka ha; ọ bụ aka nri gị, aka gị, na ìhè nke ihu gị nyere ha mmeri, nʼihi na ị hụrụ ha nʼanya. 4) Ị bụ eze m na Chineke m, onye na-ekpebi na Jekọb aghaghị inwe mmeri. 5) Nʼihi ọ bụ naanị site nʼike gị, ya na aha gị, ka anyị ji zọda ndị iro anyị nʼokpuru ụkwụ anyị. 6) Atụkwasịghị m obi m nʼụta m, mma agha m anaghị enye m mmeri; 7) ma i na-enye anyị mmeri nʼebe ndị iro anyị nọ, ị na-eme ka ihere mee ndị na-eguzogide anyị. 8) Nʼime Chineke ka ịnya isi anyị dị ogologo ụbọchị niile, anyị ga-eto aha gị ruo mgbe ebighị ebi. (Sela) 9) Ma ugbu a, ị jụla anyị ma weda anyị nʼala; ị naghị esokwa ndị agha anyị apụ ọzọ. 10) I mere ka anyị site nʼihu ndị iro anyị gbalaga, i meela ka ndị na-emegide anyị were aka ike napụ anyị ihe bụ nke anyị. 11) Ị gbakụtara anyị azụ ka e ripịa anyị dịka atụrụ, ma chụsasịa anyị nʼetiti mba niile. 12) I rere ndị gị ọnụ ala, ihe i retara ha abaghị uru nye gị. 13) I meela ka anyị bụrụ nkọcha nye ndị agbataobi anyị, anyị bụ ihe ịkwa emo na ihe ọchị nye ndị gbara anyị gburugburu. 14) I meela anyị ka anyị bụrụ ihe ịmaatụ ọchị nʼetiti mba niile, ndị ọbụla hụrụ anyị na-efufe isi na mkparị. 15) Ogologo ụbọchị niile, ihere m dị m nʼihu, ihere m na-ekpuchikwa m ihu, 16) mgbe ndị nkwulu na ndị nkọcha na-eji m eme ihe ọchị, nʼihi onye iro, onye kpebiri ịbọ ọbọ. 17) Ọ bụ ezie na ihe ndị a adakwasịla anyị, ma anyị echefubeghị gị. Anyị enupubeghị isi nʼọgbụgba ndụ anyị na gị. 18) Obi anyị ahapụbeghị gị! Anyị ahapụbekwaghị iso ụzọ gị. 19) Ma i gwepịara anyị mee ka anyị bụrụ ebe nkịta ọhịa na-akpagharị, jirikwa oke ọchịchịrị kpuchie anyị. 20) Ọ bụrụ na anyị chefuru aha Chineke anyị, maọbụ na anyị gbasaara chi mba ọzọ aka anyị, 21) ọ bụ na Chineke agaraghị achọpụta ya, ebe ọ maara ihe nzuzo niile dị nʼobi? 22) Ọ bụ nʼihi gị ka anyị na ọnwụ ji agba mgba, ogologo ụbọchị niile. A na-ele anyị anya dịka atụrụ a gaje igbu egbu. 23) O, Onyenwe m teta! Gịnị mere i ji arahụ ụra? Kpọtee onwe gị! Ajụkwala anyị ruo mgbe ebighị ebi. 24) Gịnị mere i ji ezopụ ihu gị, ma chefuo mmegbu na ịta ahụhụ anyị? 25) E tidala anyị nʼala, nʼuzuzu, ahụ anyị rapara nʼaja 26) Bilie ma nyere anyị aka; gbapụta anyị maka ịhụnanya gị nke na-adịghị agwụ agwụ. Additional comments?
Refresh Captcha
The world's first Holy Bible un-translation!