< Abụ Ọma 32 >

1 Abụ Ọma Devid. Abụ Maskil. Onye a gọziri agọzi ka mmadụ ahụ bụ, onye a gbaghaara ajọ omume ya niile, onye e kpuchikwaara mmehie ya niile.
Ta Dawuda. Maskil ne. Mai farin ciki ne shi wanda aka gafarta masa laifofinsa, wanda aka shafe zunubansa.
2 Ngọzị na-adịrị nwoke ahụ, onye Onyenwe anyị na-adịghị agụnyere mmehie ya, onye ahụ nke aghụghọ ọbụla na-adịghịkwa nʼime mmụọ ya.
Mai farin ciki ne mutumin da Ubangiji ba ya lissafin zunubinsa a kansa wanda kuma babu ruɗu a ruhunsa.
3 Mgbe m gbachiri nkịtị, ọkpụkpụ m rere ure site nʼịsụ ude m ogologo ụbọchị niile.
Sa’ad da na yi shiru, ƙasusuwana sun yi ta mutuwa cikin nishina dukan yini.
4 Ehihie niile na abalị niile, ị tara m ahụhụ, ume dị m nʼobi gwụchara, dịka mgbe okpomọkụ nke ọkọchị. (Sela)
Gama dare da rana hannunka yana da nauyi a kaina; an shanye ƙarfina ƙaf sai ka ce a zafin bazara. (Sela)
5 Mgbe ahụ, ekwupụtara m mmehie m niile nʼihu gị, kwụsịkwa izo ha ezo. Agwara m onwe m okwu sị, “Aga m ekwupụta mmehie m niile nʼihu Onyenwe anyị.” Ị gbaghakwaara m ikpe ọmụma nke mmehie m niile. (Sela)
Sa’an nan na furta zunubina a gare ka ban kuwa ɓoye laifina ba. Na ce, “Zan furta laifofina ga Ubangiji.” Ka kuwa gafarta laifin zunubina. (Sela)
6 Ya mere, ka ndị niile bụ ndị ezi omume kpọkuo gị nʼekpere mgbe e nwere ike ịchọta gị; nʼụzọ dị otu a, ọ bụrụ na uju mmiri abịa, ọ gaghị erute ha.
Saboda haka bari duk mai tsoron Allah yă yi addu’a gare ka yayinda kake samuwa; tabbatacce sa’ad da manyan ruwaye suka taso, ba za su kai wurinsa ba.
7 Gị onwe gị bụụrụ m ebe nzuzo; Ị ga-echebekwa m ka nsogbu ọbụla hapụ irute m nso. Ọ bụkwa abụ nzọpụta ka i ji gbaa m gburugburu. (Sela)
Kai ne wurin ɓuyata; za ka tsare ni daga wahala ka kewaye ni da waƙoƙin ceto. (Sela)
8 Aga m eme ka ị nwee uche, zikwa gị ụzọ i kwesiri ịgbaso; Aga m adụ gị ọdụ, anya m ga-adịkwasịkwa nʼahụ gị.
Zan umarce ka in kuma koyar da kai a hanyar da za ka bi; Zan ba ka shawara in kuma lura da kai.
9 Adịkwala ka ịnyịnya maọbụ ịnyịnya ibu nke na-enweghị akọnuche, nke a na-aghaghị iji mkpụmkpụ igwe na eriri kechie ọnụ ya, ijide ya, ma emeghị otu a, ọ gaghị abịakwute gị.
Kada ka zama kamar doki ko doki, wanda ba su da azanci wanda dole sai an bi da su da linzami da ragama in ba haka ba, ba za su zo wurinka ba.
10 Ọtụtụ ihe mgbu na-abịakwasị ndị na-eme ihe ọjọọ, ma ịhụnanya Onyenwe anyị nke na-enweghị ọgwụgwụ, na-agba onye ahụ tụkwasịrị ya obi gburugburu.
Azaban mugu da yawa suke, amma ƙaunar Ubangiji marar ƙarewa kan kewaye mutumin da ya dogara gare shi.
11 Ṅụrianụ ọṅụ nʼime Onyenwe anyị, nweekwanụ obi ụtọ, unu ndị ezi omume; bụọ abụ, unu ndị obi ha ziri ezi.
Ku yi farin ciki a cikin Ubangiji ku kuma yi murna, ku adalai; ku rera, dukanku waɗanda zuciyarku take daidai!

< Abụ Ọma 32 >