Preface
Read
+
Publisher
Nainoia, Inc.
PO Box 462, Bellefonte, PA 16823
(814) 470-8028
Nainoia Inc, Publisher
LinkedIn/NAINOIA-INC
Third Party Publisher Resources
Request Custom Formatted Verses
Please contact us below
Submit your proposed corrections
I understand that the Aionian Bible republishes public domain and Creative Commons Bible texts and that volunteers may be needed to present the original text accurately. I also understand that apocryphal text is removed and most variant verse numbering is mapped to the English standard. I have entered my corrections under the verse(s) below. Proposed corrections to the The Igbo Holy Bible for Everyone, Psalms Chapter 32 https://www.AionianBible.org/Bibles/Igbo---Igbo-Bible/Psalms/32 1) Abụ Ọma Devid. Abụ Maskil. Onye a gọziri agọzi ka mmadụ ahụ bụ, onye a gbaghaara ajọ omume ya niile, onye e kpuchikwaara mmehie ya niile. 2) Ngọzị na-adịrị nwoke ahụ, onye Onyenwe anyị na-adịghị agụnyere mmehie ya, onye ahụ nke aghụghọ ọbụla na-adịghịkwa nʼime mmụọ ya. 3) Mgbe m gbachiri nkịtị, ọkpụkpụ m rere ure site nʼịsụ ude m ogologo ụbọchị niile. 4) Ehihie niile na abalị niile, ị tara m ahụhụ, ume dị m nʼobi gwụchara, dịka mgbe okpomọkụ nke ọkọchị. (Sela) 5) Mgbe ahụ, ekwupụtara m mmehie m niile nʼihu gị, kwụsịkwa izo ha ezo. Agwara m onwe m okwu sị, “Aga m ekwupụta mmehie m niile nʼihu Onyenwe anyị.” Ị gbaghakwaara m ikpe ọmụma nke mmehie m niile. (Sela) 6) Ya mere, ka ndị niile bụ ndị ezi omume kpọkuo gị nʼekpere mgbe e nwere ike ịchọta gị; nʼụzọ dị otu a, ọ bụrụ na uju mmiri abịa, ọ gaghị erute ha. 7) Gị onwe gị bụụrụ m ebe nzuzo; Ị ga-echebekwa m ka nsogbu ọbụla hapụ irute m nso. Ọ bụkwa abụ nzọpụta ka i ji gbaa m gburugburu. (Sela) 8) Aga m eme ka ị nwee uche, zikwa gị ụzọ i kwesiri ịgbaso; Aga m adụ gị ọdụ, anya m ga-adịkwasịkwa nʼahụ gị. 9) Adịkwala ka ịnyịnya maọbụ ịnyịnya ibu nke na-enweghị akọnuche, nke a na-aghaghị iji mkpụmkpụ igwe na eriri kechie ọnụ ya, ijide ya, ma emeghị otu a, ọ gaghị abịakwute gị. 10) Ọtụtụ ihe mgbu na-abịakwasị ndị na-eme ihe ọjọọ, ma ịhụnanya Onyenwe anyị nke na-enweghị ọgwụgwụ, na-agba onye ahụ tụkwasịrị ya obi gburugburu. 11) Ṅụrianụ ọṅụ nʼime Onyenwe anyị, nweekwanụ obi ụtọ, unu ndị ezi omume; bụọ abụ, unu ndị obi ha ziri ezi. Additional comments?
Refresh Captcha
The world's first Holy Bible un-translation!