< Abụ Ọma 144 >

1 Abụ Ọma nke Devid. Otuto dịrị Onyenwe anyị, onye bụ oke nkume m, onye na-ezi aka m abụọ ibu agha, na mkpịsịaka m ịlụ ọgụ.
Kayibongwe iNkosi, idwala lami, efundisela izandla zami impi, iminwe yami ukulwa;
2 Ọ bụ Chineke m, onye jupụtara nʼịhụnanya, bụrụkwa ebe mgbaba m e wusiri ike, ebe m e wusiri ike na onye mgbapụta m, ọ bụ ọta m, onye m na-agbaba nʼime ya, onye ji aka ike mee ka ndị dị iche iche nọdụ nʼokpuru m.
umusa wami, lenqaba yami, umphotshongo wami ophakemeyo, lomkhululi wami, isihlangu sami, lengiphephela kuyo, ethobisa abantu bami ngaphansi kwami.
3 O Onyenwe anyị, gịnị ka mmadụ bụ i ji na-eche echiche banyere ya, gịnị ka nwa nke mmadụ bụ ihe banyere ya ji na-emetụ gị nʼobi?
Nkosi, umuntu uyini ukuthi umazi? Indodana yomuntu ukuthi uyinanze?
4 Mmadụ dị ka otu nkuume; ụbọchị ndụ ya niile na-agafe ngwangwa dịka onyinyo.
Umuntu unjengeze, insuku zakhe zinjengesithunzi esidlulayo.
5 O Onyenwe anyị, kewaa eluigwe rịdata; metụ ugwu niile aka ka ha kwụọ anwụrụ ọkụ.
Nkosi, khothamisa amazulu akho, wehle; thinta izintaba ukuze zithunqe.
6 Zipụ amụma ka o chụsasịa ndị iro niile; gbaa ha àkụ gị niile ma chụsasịa ha.
Phazimisa umbane, ubachithe, uthumele imitshoko yakho, ubahlakaze.
7 Site nʼelu setịpụ aka gị; gbapụta m, napụtakwa m site nʼoke osimiri, site nʼaka ndị si mba ọzọ,
Yelula isandla sakho uphezulu, ungikhulule, ungophule emanzini amanengi, esandleni sabantwana besizwe,
8 ndị ọnụ ha jupụtara nʼụgha, ndị aka nri ha jupụtakwara nʼaghụghọ.
abamlomo wabo ukhuluma amanga, lesandla sabo sokunene singesokunene senkohliso.
9 O Chineke, aga m abụku gị abụ ọhụrụ. Une e ji akwara iri mee ka m ga-eji kpọọrọ gị egwu;
Ngizahlabelela kuwe ingoma entsha, Nkulunkulu; ngizahlabelela indumiso kuwe ngogubhu olulentambo ezilitshumi.
10 gị onye na-enye ndị eze mmeri, onye na-agbapụta ohu ya Devid. Site na mma agha dị njọ
Wena onika amakhosi usindiso, okhulula uDavida inceku yakho enkembeni embi.
11 gbapụta m; napụtakwa m site nʼaka ndị si mba ọzọ ndị ọnụ ha jupụtara nʼụgha, ndị aka nri ha jupụtakwara nʼaghụghọ.
Ngophula, ungikhulule esandleni sabantwana besizwe, abamlomo wabo ukhuluma amanga, lesandla sabo sokunene singesokunene senkohliso.
12 Mgbe ahụ, ụmụ ndị ikom anyị, nʼoge okorobịa ha, ga-adị ka ihe a kụrụ nʼala e lekọtara anya nke ọma, ụmụ anyị ndị inyom ga-adị ka ogidi a pịrị apị e ji achọ ụlọeze mma.
Ukuthi amadodana ethu abe njengezilimo ezikhula ebutsheni bazo, amadodakazi ethu njengamatshe engonsi abazwe njengomfanekiso wesigodlo!
13 Ọba anyị niile ga-ejupụta nʼihe oriri dị iche iche si nʼubi anyị. Atụrụ anyị ga-amụba nʼọtụtụ puku nʼọnụọgụgụ, ha ga-adị iri puku kwụrụ puku nʼubi anyị;
Ukuthi iziphala zethu zigcwale ziveze uhlobo ngohlobo; izimvu zethu zizale izinkulungwane, yebo, izinkulungwane ezilitshumi emadlelweni ethu!
14 igwe ehi anyị ga-adọkpụ ibu dị arọ. A gaghị enwe ntipu na mgbidi anyị niile, a gaghị adọta anyị nʼagha gaa obodo ọzọ, akwa ihe mgbu agaghị adị nʼokporoụzọ anyị niile.
Ukuthi inkabi zethu zingathwaliswa, kungabi lokufohlela phakathi, njalo kungabi lokuphuma, kumbe kungabi lesililo ezitaladeni zethu!
15 Ndị a gọziri agọzi ka ndị ahụ bụ, ndị ihe ndị a dịịrị; ndị a gọziri agọzi ka ndị ahụ bụ, ndị Chineke bụ Onyenwe anyị ha.
Bayathaba abantu okunjalo kubo; bayathaba abantu abaNkulunkulu wabo yiNkosi.

< Abụ Ọma 144 >