Preface
Read
+
Publisher
Nainoia, Inc.
PO Box 462, Bellefonte, PA 16823
(814) 470-8028
Nainoia Inc, Publisher
LinkedIn/NAINOIA-INC
Third Party Publisher Resources
Request Custom Formatted Verses
Please contact us below
Submit your proposed corrections
I understand that the Aionian Bible republishes public domain and Creative Commons Bible texts and that volunteers may be needed to present the original text accurately. I also understand that apocryphal text is removed and most variant verse numbering is mapped to the English standard. I have entered my corrections under the verse(s) below. Proposed corrections to the The Igbo Holy Bible for Everyone, Psalms Chapter 144 https://www.AionianBible.org/Bibles/Igbo---Igbo-Bible/Psalms/144 1) Abụ Ọma nke Devid. Otuto dịrị Onyenwe anyị, onye bụ oke nkume m, onye na-ezi aka m abụọ ibu agha, na mkpịsịaka m ịlụ ọgụ. 2) Ọ bụ Chineke m, onye jupụtara nʼịhụnanya, bụrụkwa ebe mgbaba m e wusiri ike, ebe m e wusiri ike na onye mgbapụta m, ọ bụ ọta m, onye m na-agbaba nʼime ya, onye ji aka ike mee ka ndị dị iche iche nọdụ nʼokpuru m. 3) O Onyenwe anyị, gịnị ka mmadụ bụ i ji na-eche echiche banyere ya, gịnị ka nwa nke mmadụ bụ ihe banyere ya ji na-emetụ gị nʼobi? 4) Mmadụ dị ka otu nkuume; ụbọchị ndụ ya niile na-agafe ngwangwa dịka onyinyo. 5) O Onyenwe anyị, kewaa eluigwe rịdata; metụ ugwu niile aka ka ha kwụọ anwụrụ ọkụ. 6) Zipụ amụma ka o chụsasịa ndị iro niile; gbaa ha àkụ gị niile ma chụsasịa ha. 7) Site nʼelu setịpụ aka gị; gbapụta m, napụtakwa m site nʼoke osimiri, site nʼaka ndị si mba ọzọ, 8) ndị ọnụ ha jupụtara nʼụgha, ndị aka nri ha jupụtakwara nʼaghụghọ. 9) O Chineke, aga m abụku gị abụ ọhụrụ. Une e ji akwara iri mee ka m ga-eji kpọọrọ gị egwu; 10) gị onye na-enye ndị eze mmeri, onye na-agbapụta ohu ya Devid. Site na mma agha dị njọ 11) gbapụta m; napụtakwa m site nʼaka ndị si mba ọzọ ndị ọnụ ha jupụtara nʼụgha, ndị aka nri ha jupụtakwara nʼaghụghọ. 12) Mgbe ahụ, ụmụ ndị ikom anyị, nʼoge okorobịa ha, ga-adị ka ihe a kụrụ nʼala e lekọtara anya nke ọma, ụmụ anyị ndị inyom ga-adị ka ogidi a pịrị apị e ji achọ ụlọeze mma. 13) Ọba anyị niile ga-ejupụta nʼihe oriri dị iche iche si nʼubi anyị. Atụrụ anyị ga-amụba nʼọtụtụ puku nʼọnụọgụgụ, ha ga-adị iri puku kwụrụ puku nʼubi anyị; 14) igwe ehi anyị ga-adọkpụ ibu dị arọ. A gaghị enwe ntipu na mgbidi anyị niile, a gaghị adọta anyị nʼagha gaa obodo ọzọ, akwa ihe mgbu agaghị adị nʼokporoụzọ anyị niile. 15) Ndị a gọziri agọzi ka ndị ahụ bụ, ndị ihe ndị a dịịrị; ndị a gọziri agọzi ka ndị ahụ bụ, ndị Chineke bụ Onyenwe anyị ha. Additional comments?
Refresh Captcha
The world's first Holy Bible un-translation!