< Abụ Ọma 124 >
1 Abụ nrigo. Nke Devid. A sị na Onyenwe anyị adịnyereghị anyị, ka Izrel kwuo,
Wimbo wa kwenda juu. Wa Daudi. Kama Bwana asingalikuwa upande wetu; Israeli na aseme sasa:
2 a sị na Onyenwe anyị adịnyereghị anyị, mgbe ndị mmadụ biliri imegide anyị,
kama Bwana asingalikuwa upande wetu, wakati watu walipotushambulia,
3 mgbe iwe ha rere dịka ọkụ megide anyị, ha gaara eloda anyị na ndụ;
wakati hasira yao ilipowaka dhidi yetu, wangalitumeza tungali hai,
4 idee mmiri gaara iri anyị, oke mmiri gaara ebufu anyị,
mafuriko yangalitugharikisha, maji mengi yangalitufunika,
5 ebili mmiri niile gaara ebufu anyị.
maji yaendayo kasi yangalituchukua.
6 Ma otuto dịrị Onyenwe anyị, onye na-ekweghị ka ha jiri eze ha dọrie anyị.
Bwana asifiwe, yeye ambaye hakuruhusu turaruliwe kwa meno yao.
7 Anyị agbanarịla ha dịka nwa nnụnụ si gbanarị ọnya osi ọnya chọrọ iji jide ya; ọnya ahụ agbajiela, anyị ewezugakwala onwe anyị, nwere onwe anyị.
Tumeponyoka kama ndege kutoka mtego wa mwindaji; mtego umevunjika, nasi tukaokoka.
8 Inyeaka anyị dị nʼaha Onyenwe anyị, onye kere eluigwe na ụwa.
Msaada wetu ni katika jina la Bwana, Muumba wa mbingu na dunia.