< Abụ Ọma 124 >

1 Abụ nrigo. Nke Devid. A sị na Onyenwe anyị adịnyereghị anyị, ka Izrel kwuo,
A Song of Degrees. If it had not been that the Lord was amongst us, let Israel now say;
2 a sị na Onyenwe anyị adịnyereghị anyị, mgbe ndị mmadụ biliri imegide anyị,
if it had not been that the Lord was amongst us, when men rose up against us;
3 mgbe iwe ha rere dịka ọkụ megide anyị, ha gaara eloda anyị na ndụ;
verily they would have swallowed us up alive, when their wrath was kindled against us:
4 idee mmiri gaara iri anyị, oke mmiri gaara ebufu anyị,
verily the water would have drowned us, our soul would have gone under the torrent.
5 ebili mmiri niile gaara ebufu anyị.
Yes, our soul would have gone under the overwhelming water.
6 Ma otuto dịrị Onyenwe anyị, onye na-ekweghị ka ha jiri eze ha dọrie anyị.
Blessed be the Lord, who has not given us for a prey to their teeth.
7 Anyị agbanarịla ha dịka nwa nnụnụ si gbanarị ọnya osi ọnya chọrọ iji jide ya; ọnya ahụ agbajiela, anyị ewezugakwala onwe anyị, nwere onwe anyị.
Our soul has been delivered as a sparrow from the snare of the fowlers: the snare is broken, and we are delivered.
8 Inyeaka anyị dị nʼaha Onyenwe anyị, onye kere eluigwe na ụwa.
Our help is in the name of the Lord, who made heaven and earth.

< Abụ Ọma 124 >