< Abụ Ọma 10 >
1 Onyenwe anyị, gịnị mere i ji na-eguzoro onwe gị nʼebe dị anya? Gịnị mere ị na-ezo onwe gị nʼoge nsogbu?
Why standest thou afar off, O LORD? Why hidest thou thyself in times of trouble?
2 Site na mpako, onye ajọ omume na-emegbu ndị na-adịghị ike, ndị mpịa mpịa aghụghọ ya mara dịka ọnya.
Through the haughtiness of the wicked the poor are in distress; They are caught in the wiles which are contrived for them.
3 Ọ na-anya isi banyere ọchịchọ niile nke obi ya, ọ na-elelị Onyenwe anyị anya ma na-agọzi ndị oke ọchịchọ.
The wicked boasteth of his heart's desire; The rapacious renounceth and contemneth Jehovah.
4 Nʼọnọdụ mpako ya, onye ajọ omume anaghị achọ Chineke, nʼechiche ya niile, ọ naghị eche banyere ya.
The wicked [[saith]] in his haughtiness, “He careth not!” All his thoughts are, “There is no God.”
5 Ma ihe niile ọ na-eme na-agara ya nke ọma; ọ bụ onye na-ebuli onwe ya elu, iwu gị niile dịkwa anya site nʼebe ọ nọ; ọ na-elelị ndị iro ya niile.
His course is always prosperous; Far in the heights are thy judgments from him; As for all his enemies, he puffeth at them.
6 Nʼime obi ya, ọ na-asị, “Ọ dịghị ihe ga-emetụta m. Aga m anọ nʼọnọdụ ọṅụ mgbe niile. Nsogbu ọbụla agaghị adakwasị m.”
He saith in his heart, “I shall never fall; I shall never be in adversity.”
7 Ọnụ ya jupụtara nʼokwu ụgha na ịba mba ime ihe ọjọọ, nʼokpuru ire ya ka nsogbu na ajọ ihe dịkwa.
His mouth is full of perjury, deceit, and oppression; Mischief and injustice are upon his tongue.
8 Ha na-ezo onwe ha nʼobodo nta dị iche iche, nʼebe zooro ezo ka ha na-anọ, na-eche itigbu ndị aka ha dị ọcha.
He sitteth in the lurking-places of the villages; In secret places doth he murder the innocent; His eyes are secretly fixed upon the poor.
9 Dịka ọdụm, ha anaghị eme mkpọtụ ọbụla, ọ na-eche ịdakwasị ụmụ ogbenye. Dịka ndị bụ dinta si ejide ụmụ anụmanụ nʼọnya ha siri, otu a ka ha si ejide ụmụ ogbenye.
He secretly lieth in wait, like a lion in a thicket; He lieth in wait to seize upon the helpless; He catcheth the poor, drawing him into his net.
10 Ụmụ ogbenye ndị a na-ada nʼala nʼihi ịdị ike ya, ọ na-azọpịakwa ha.
He croucheth, and lowereth himself, And the wretched fall into his paws.
11 Nʼime obi ya, ọ na-asị, “Chineke echefuola. O zofuola ihu ya, ọ dịghị mgbe ọ hụrụ ya.”
He saith in his heart, “God doth forget; He hideth his face; he doth never see it.”
12 Bilie O Onyenwe anyị! O Chineke welie aka gị, echefukwala ndị na-enweghị onye inyeaka.
Arise, O LORD! O God, lift up thine hand: Forget not the distressed!
13 Gịnị mere onye ajọ omume ji na-eleda Chineke anya? Gịnị mere o ji na-asị nʼime obi ya, “Ọ gaghị akpọ m ka m zaa ajụjụ banyere omume m”?
Wherefore doth the wicked contemn God, And say in his heart, “He careth not for it”?
14 Ma gị, O Chineke, ị na-ahụ nsogbu na ihe mwute, ị na-atule ihe ị ga-eme banyere ha. Ndị a na-emegbu na-atụkwasị gị obi, nʼihi na ị bụ onye inyeaka ndị na-enweghị nna.
Thou dost see it; yea, thou beholdest malice and oppression, And markest it upon thy hand! The poor committeth himself to thee; Thou art the helper of the fatherless.
15 Gbajie aka onye ajọ omume a na-eme ihe ọjọọ, kpọọ ya ka ọ zaa ajụjụ banyere ajọ omume ya niile nke a na-apụghị ịchọpụta.
Break thou the arm of the unjust and wicked man; Seek out his wickedness, till thou canst find none!
16 Onyenwe anyị bụ eze ruo mgbe ebighị ebi. Ọ ga-esite nʼala ya kpochapụ mba niile.
Jehovah is king for ever and ever; The gentiles shall perish out of his land.
17 O Onyenwe anyị, ị maara ọchịchọ obi ndị niile a na-akpagbu; ị na-ege ntị na mkpu akwa ha ma kasịekwa ha obi,
Thou, O LORD! wilt hear the desires of the distressed; Thou wilt strengthen their hearts; Thou wilt lend a listening ear!
18 Ị na-echedo ndị na-enweghị nna na ndị niile a na-emegbu emegbu, ka mmadụ efu, onye e kere eke, ghara imenye ha egwu ọzọ.
Thou wilt maintain the cause of the fatherless and the oppressed, That henceforth none may be driven from the land.