Preface
Read
+
Publisher
Nainoia, Inc.
PO Box 462, Bellefonte, PA 16823
(814) 470-8028
Nainoia Inc, Publisher
LinkedIn/NAINOIA-INC
Third Party Publisher Resources
Request Custom Formatted Verses
Please contact us below
Submit your proposed corrections
I understand that the Aionian Bible republishes public domain and Creative Commons Bible texts and that volunteers may be needed to present the original text accurately. I also understand that apocryphal text is removed and most variant verse numbering is mapped to the English standard. I have entered my corrections under the verse(s) below. Proposed corrections to the The Igbo Holy Bible for Everyone, Psalms Chapter 10 https://www.AionianBible.org/Bibles/Igbo---Igbo-Bible/Psalms/10 1) Onyenwe anyị, gịnị mere i ji na-eguzoro onwe gị nʼebe dị anya? Gịnị mere ị na-ezo onwe gị nʼoge nsogbu? 2) Site na mpako, onye ajọ omume na-emegbu ndị na-adịghị ike, ndị mpịa mpịa aghụghọ ya mara dịka ọnya. 3) Ọ na-anya isi banyere ọchịchọ niile nke obi ya, ọ na-elelị Onyenwe anyị anya ma na-agọzi ndị oke ọchịchọ. 4) Nʼọnọdụ mpako ya, onye ajọ omume anaghị achọ Chineke, nʼechiche ya niile, ọ naghị eche banyere ya. 5) Ma ihe niile ọ na-eme na-agara ya nke ọma; ọ bụ onye na-ebuli onwe ya elu, iwu gị niile dịkwa anya site nʼebe ọ nọ; ọ na-elelị ndị iro ya niile. 6) Nʼime obi ya, ọ na-asị, “Ọ dịghị ihe ga-emetụta m. Aga m anọ nʼọnọdụ ọṅụ mgbe niile. Nsogbu ọbụla agaghị adakwasị m.” 7) Ọnụ ya jupụtara nʼokwu ụgha na ịba mba ime ihe ọjọọ, nʼokpuru ire ya ka nsogbu na ajọ ihe dịkwa. 8) Ha na-ezo onwe ha nʼobodo nta dị iche iche, nʼebe zooro ezo ka ha na-anọ, na-eche itigbu ndị aka ha dị ọcha. 9) Dịka ọdụm, ha anaghị eme mkpọtụ ọbụla, ọ na-eche ịdakwasị ụmụ ogbenye. Dịka ndị bụ dinta si ejide ụmụ anụmanụ nʼọnya ha siri, otu a ka ha si ejide ụmụ ogbenye. 10) Ụmụ ogbenye ndị a na-ada nʼala nʼihi ịdị ike ya, ọ na-azọpịakwa ha. 11) Nʼime obi ya, ọ na-asị, “Chineke echefuola. O zofuola ihu ya, ọ dịghị mgbe ọ hụrụ ya.” 12) Bilie O Onyenwe anyị! O Chineke welie aka gị, echefukwala ndị na-enweghị onye inyeaka. 13) Gịnị mere onye ajọ omume ji na-eleda Chineke anya? Gịnị mere o ji na-asị nʼime obi ya, “Ọ gaghị akpọ m ka m zaa ajụjụ banyere omume m”? 14) Ma gị, O Chineke, ị na-ahụ nsogbu na ihe mwute, ị na-atule ihe ị ga-eme banyere ha. Ndị a na-emegbu na-atụkwasị gị obi, nʼihi na ị bụ onye inyeaka ndị na-enweghị nna. 15) Gbajie aka onye ajọ omume a na-eme ihe ọjọọ, kpọọ ya ka ọ zaa ajụjụ banyere ajọ omume ya niile nke a na-apụghị ịchọpụta. 16) Onyenwe anyị bụ eze ruo mgbe ebighị ebi. Ọ ga-esite nʼala ya kpochapụ mba niile. 17) O Onyenwe anyị, ị maara ọchịchọ obi ndị niile a na-akpagbu; ị na-ege ntị na mkpu akwa ha ma kasịekwa ha obi, 18) Ị na-echedo ndị na-enweghị nna na ndị niile a na-emegbu emegbu, ka mmadụ efu, onye e kere eke, ghara imenye ha egwu ọzọ. Additional comments?
Refresh Captcha
The world's first Holy Bible un-translation!