< Ilu 20 >

1 Mmanya bụ onye na-akwa emo. Onye mkpọtụ ka ihe ọṅụṅụ na-aba nʼanya bụ. Onye ọbụla kwere ka ha duhie ya bụ onye nzuzu.
HE mea henehene ka waina, he walaau nui hoi ka mea e ona'i; O na mea a pau i puni malaila, aole i naauao.
2 Ọnụma eze na-emenye oke ụjọ nʼahụ dịka mbigbọ nke ọdụm; ndị na-akpasu ya iwe ga-atụfu ndụ ha.
He uwo ana me he liona la, ka weliweli i ke alii; O ka mea hoonaukiuki ia ia, hoeha no oia i kona uhane iho.
3 Ọ bụ ihe nsọpụrụ nye onye na-ezere okwu na ụka, ma onye nzuzu ọbụla na-eme ngwa ise okwu.
He mea nani no ke kanaka, ke hooki i ka hoopaapaa: Aka, e huhu no na mea lapuwale a pau.
4 Onye umengwụ adịghị arụ ọrụ ubi nʼoge ya. Nʼoge owuwe ihe ubi ọ pụghị ịchọta ihe oriri.
Aole e mahiai ka mea palaualelo no ke anu; A e makilo oia i ka wa e ohi ai, aole e loaa.
5 Nzube niile nke dị mmadụ nʼobi bụ mmiri dị omimi, ma onye nwere nghọta na-adọpụta ha.
He wai hohonu, ka oleloao iloko o ko kanaka naau; Na ke kanaka naauao e uhuki ae.
6 Ọtụtụ mmadụ na-asị na ha nwere ịhụnanya na-adịghị agharịpụ, ma onye kwesiri ntụkwasị obi, onye pụrụ ịchọta ya?
E hai aku ka nui o na kanaka i ko lakou pono iho; O ke kanaka hana oiaio, ia wai la i loaa'i ia?
7 Onye ezi omume nke na-ejegharị nʼizuoke, ndị ihe na-agara nke ọma ka ụmụ ga-anọchi ya ga-abụ.
O ka mea hele ma kona pololei, he mea pono oia; E hoomaikaiia hoi kana poe keiki mahope ona.
8 Mgbe eze na-anọkwasị nʼocheeze ya ikpe ikpe, ọ na-eji anya ya abụọ afụchapụ ihe ọjọọ niile.
O ke alii e noho ana ma ka noho hookolokolo, Hooauhee oia i na hewa a pau me kona mau maka.
9 Onye pụrụ ị sị, “Emeela m ka obi m dị ọcha; Abụ m onye dị ọcha, mmehie adịghịkwa nʼime m?”
Owai la ke hiki e olelo aku, Ua hoomaemae au i ko'u naau? Ua kaawale au i ko'u hewa?
10 Ihe ọtụtụ aghụghọ na ihe ọtụtụ nghọgbu, ha niile bụ ihe arụ nʼihu Onyenwe anyị.
He ana paona palua a he ana palua no na mea e ae, He hoopailua ia Iehova ia mau mea elua.
11 Ọbụladị ụmụntakịrị ka a na-amata site nʼomume ha niile, nke a ọ pụtara nʼomume ha dị ọcha nʼezie a, bụrụkwa ihe ziri ezi?
Ua ikeia ke keiki ma ka hana ana, Ina paha he maemae, a he pololei kana hana.
12 Ntị nke na-anụ ihe na anya nke na-ahụ ụzọ, ọ bụ Onyenwe anyị mere ha abụọ.
O ka pepeiao lohe, a o ka maka nana, Na Iehova no i hana ia mau mea elua.
13 Ahụla ịrahụ ụra nʼanya, ka ị ghara ịghọ onye ụkpa. Bilie, mụrụ anya, rụsie ọrụ ike, ka i nweekwa ihe oriri.
Mai makemake oe i ka hiamoe o lilo oe i mea nele; E wehe ae i kou mau maka, a e maona i ka ai.
14 “Lee, ihe a jọrọ njọ, ọ baghị uru,” ka onye na-azụ ahịa na-asị, ma mgbe ọ pụrụ ọ na-anya isi nʼihi ihe ọ zụtara.
He ino, he ino, wahi a ka mea kuai mai; A i kona hele ana aku, alaila, haanui oia.
15 Ọlaedo dị, na ọtụtụ rubi nʼebe ọ bara ụba, ma egbugbere ọnụ nke na-ekwupụta ihe ọmụma bụ ọla dị oke ọnụahịa.
Aia he gula a me na pohaku maikai he nui wale; Aka, o ka mea nani loa, oia ka lehelehe ike.
16 Chiri uwe onye ahụ naara onye mba ọzọ nʼaka mbe. Jichiekwa ihe mbe ahụ o nyere nʼihi onye mba ọzọ ọ nara na mbe.
E lawe oe i ke kapa o kekahi ke panai oia no ka malihini, A no na malihini hoi i lawe i kekahi waiwai ana.
17 Nri e nwetara nʼụzọ aghụghọ na-atọ mmadụ ụtọ. Ma nʼikpeazụ aja ga-eju ya ọnụ.
Ua ono i ke kanaka ka ai no ka wahahee; A mahope iho, e piha kona waha i ke one.
18 Buru ụzọ nata ndụmọdụ tupu i mee ihe ọbụla ị chọrọ ime; ebula agha ma i bubeghị ụzọ pịa ọpịpịa.
Ua paa ka manao ma ke kukakuka pu ana; Ma ka noonoo pololei hoi e kaua aku ai.
19 Agwala onye na-akpa asịrị ihe nzuzo gị, nʼihi na ọ ga-akụ ya nʼekwe nye ụwa niile.
O ka mea holoholo olelo, hoike aku oia i na mea i hunaia; Mai launa aku me ka mea hoomalimali me koua mau lehelehe.
20 Oriọna onye ahụ na-akọcha nne ya na nna ya ka Chineke na-afụnyụ.
O ka mea hailiili aku i kona makuakane a me kona makuwahine, E pio kona kukui i ke onohi o ka pouli.
21 Ihe nketa nke anatara nʼoke ọsịịsọ, agaghị agọzi ya nʼikpeazụ.
O ka hooilina i loaa mua ma ke kaili wale, O kona hopena, aole e pomaikai ia.
22 A sịkwala, “Aga m akwụghachi gị nʼihi ihe ọjọọ a.” Chere Onyenwe anyị, ọ ga-abọrọ gị ọbọ.
Mai olelo ae oe, E hoopai aku au i ka hewa; E kakali oe ia Iehova, nana no oe o kokua mai.
23 Onyenwe anyị kpọrọ ihe ọtụtụ gbara iche iche asị, ihe ọtụtụ aghụghọ adịghị atọ ya ụtọ.
He hoopailua ia Iehova na ana paona papalua; O ke kaupaona hoopunipuni aole i pono ia.
24 Onyenwe anyị na-eduzi nzọ ụkwụ niile nke mmadụ. Olee otu onye ọbụla ga-esi ghọta ụzọ ha?
Na Iehova mai ka hele ana o ke kanaka; Pehea hoi e hiki ai i ke kanaka ko ike i kona aoao iho?
25 Ime ngwangwa doo ihe nsọ, bụ ịma nʼọnya ma mesie tụgharịwa uche banyere imezu nkwa ahụ.
He mea hihia i ke kanaka, ke hoohiki naaupo i ka mea hemolele; A mahope iho o ka hoohiki ana, alaila noonoo.
26 Eze maara ihe na-afụchapụ ndị ajọ omume, ọ na-eji wịịlu ịfụcha mkpụrụ gaa nʼelu ha.
Hoopuehu ae ke alii akamai i ka poe hewa, Hookaa oia i ke kaa maluna o lakou.
27 Akọnuche mmadụ bụ ọkụ Onyenwe anyị ji enyocha mmụọ ya, ọ na-egwupụta ala ala obi ya, igosi anyị ihe anyị bụ.
O ke kukui o Iehova, o ka hanu ia o ke kanaka, E komo ana ma na wahi a pau o ka opu.
28 Ịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi na-echebe eze, site nʼịhụnanya ka ocheeze ya na-eguzo chịm.
Na ka lokomaikai a me ka oiaio e malama mai i ke alii; Ua paa hoi kona nohoalii i ka lokomaikai.
29 Ugwu a na-akwanyere ụmụ okorobịa bụ nʼihi ịdị ike ha, ma isi awọ bụ nsọpụrụ ndị okenye.
O ka ikaika ka mea e kaulana'i na kanaka ui; O ke poohina ka mea e nani ai ka elemakule.
30 Ọkpọ na mmerụ ahụ na-ehichapụ ihe ọjọọ, ụtarị na-asachapụ ime ime nke ahụ mmadụ.
O ka pahu ana o ka mai he mea hoomaemae i ka ino; O ka haua hoi, i koloko o ka opu.

< Ilu 20 >