Preface
Read
+
Publisher
Nainoia, Inc.
PO Box 462, Bellefonte, PA 16823
(814) 470-8028
Nainoia Inc, Publisher
LinkedIn/NAINOIA-INC
Third Party Publisher Resources
Request Custom Formatted Verses
Please contact us below
Submit your proposed corrections
I understand that the Aionian Bible republishes public domain and Creative Commons Bible texts and that volunteers may be needed to present the original text accurately. I also understand that apocryphal text is removed and most variant verse numbering is mapped to the English standard. I have entered my corrections under the verse(s) below. Proposed corrections to the The Igbo Holy Bible for Everyone, Proverbs Chapter 20 https://www.AionianBible.org/Bibles/Igbo---Igbo-Bible/Proverbs/20 1) Mmanya bụ onye na-akwa emo. Onye mkpọtụ ka ihe ọṅụṅụ na-aba nʼanya bụ. Onye ọbụla kwere ka ha duhie ya bụ onye nzuzu. 2) Ọnụma eze na-emenye oke ụjọ nʼahụ dịka mbigbọ nke ọdụm; ndị na-akpasu ya iwe ga-atụfu ndụ ha. 3) Ọ bụ ihe nsọpụrụ nye onye na-ezere okwu na ụka, ma onye nzuzu ọbụla na-eme ngwa ise okwu. 4) Onye umengwụ adịghị arụ ọrụ ubi nʼoge ya. Nʼoge owuwe ihe ubi ọ pụghị ịchọta ihe oriri. 5) Nzube niile nke dị mmadụ nʼobi bụ mmiri dị omimi, ma onye nwere nghọta na-adọpụta ha. 6) Ọtụtụ mmadụ na-asị na ha nwere ịhụnanya na-adịghị agharịpụ, ma onye kwesiri ntụkwasị obi, onye pụrụ ịchọta ya? 7) Onye ezi omume nke na-ejegharị nʼizuoke, ndị ihe na-agara nke ọma ka ụmụ ga-anọchi ya ga-abụ. 8) Mgbe eze na-anọkwasị nʼocheeze ya ikpe ikpe, ọ na-eji anya ya abụọ afụchapụ ihe ọjọọ niile. 9) Onye pụrụ ị sị, “Emeela m ka obi m dị ọcha; Abụ m onye dị ọcha, mmehie adịghịkwa nʼime m?” 10) Ihe ọtụtụ aghụghọ na ihe ọtụtụ nghọgbu, ha niile bụ ihe arụ nʼihu Onyenwe anyị. 11) Ọbụladị ụmụntakịrị ka a na-amata site nʼomume ha niile, nke a ọ pụtara nʼomume ha dị ọcha nʼezie a, bụrụkwa ihe ziri ezi? 12) Ntị nke na-anụ ihe na anya nke na-ahụ ụzọ, ọ bụ Onyenwe anyị mere ha abụọ. 13) Ahụla ịrahụ ụra nʼanya, ka ị ghara ịghọ onye ụkpa. Bilie, mụrụ anya, rụsie ọrụ ike, ka i nweekwa ihe oriri. 14) “Lee, ihe a jọrọ njọ, ọ baghị uru,” ka onye na-azụ ahịa na-asị, ma mgbe ọ pụrụ ọ na-anya isi nʼihi ihe ọ zụtara. 15) Ọlaedo dị, na ọtụtụ rubi nʼebe ọ bara ụba, ma egbugbere ọnụ nke na-ekwupụta ihe ọmụma bụ ọla dị oke ọnụahịa. 16) Chiri uwe onye ahụ naara onye mba ọzọ nʼaka mbe. Jichiekwa ihe mbe ahụ o nyere nʼihi onye mba ọzọ ọ nara na mbe. 17) Nri e nwetara nʼụzọ aghụghọ na-atọ mmadụ ụtọ. Ma nʼikpeazụ aja ga-eju ya ọnụ. 18) Buru ụzọ nata ndụmọdụ tupu i mee ihe ọbụla ị chọrọ ime; ebula agha ma i bubeghị ụzọ pịa ọpịpịa. 19) Agwala onye na-akpa asịrị ihe nzuzo gị, nʼihi na ọ ga-akụ ya nʼekwe nye ụwa niile. 20) Oriọna onye ahụ na-akọcha nne ya na nna ya ka Chineke na-afụnyụ. 21) Ihe nketa nke anatara nʼoke ọsịịsọ, agaghị agọzi ya nʼikpeazụ. 22) A sịkwala, “Aga m akwụghachi gị nʼihi ihe ọjọọ a.” Chere Onyenwe anyị, ọ ga-abọrọ gị ọbọ. 23) Onyenwe anyị kpọrọ ihe ọtụtụ gbara iche iche asị, ihe ọtụtụ aghụghọ adịghị atọ ya ụtọ. 24) Onyenwe anyị na-eduzi nzọ ụkwụ niile nke mmadụ. Olee otu onye ọbụla ga-esi ghọta ụzọ ha? 25) Ime ngwangwa doo ihe nsọ, bụ ịma nʼọnya ma mesie tụgharịwa uche banyere imezu nkwa ahụ. 26) Eze maara ihe na-afụchapụ ndị ajọ omume, ọ na-eji wịịlu ịfụcha mkpụrụ gaa nʼelu ha. 27) Akọnuche mmadụ bụ ọkụ Onyenwe anyị ji enyocha mmụọ ya, ọ na-egwupụta ala ala obi ya, igosi anyị ihe anyị bụ. 28) Ịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi na-echebe eze, site nʼịhụnanya ka ocheeze ya na-eguzo chịm. 29) Ugwu a na-akwanyere ụmụ okorobịa bụ nʼihi ịdị ike ha, ma isi awọ bụ nsọpụrụ ndị okenye. 30) Ọkpọ na mmerụ ahụ na-ehichapụ ihe ọjọọ, ụtarị na-asachapụ ime ime nke ahụ mmadụ. Additional comments?
Refresh Captcha
The world's first Holy Bible un-translation!