< Ilu 20 >

1 Mmanya bụ onye na-akwa emo. Onye mkpọtụ ka ihe ọṅụṅụ na-aba nʼanya bụ. Onye ọbụla kwere ka ha duhie ya bụ onye nzuzu.
Wine is a mocker, strong drink a brawler, and whoever errs thereby is not wise.
2 Ọnụma eze na-emenye oke ụjọ nʼahụ dịka mbigbọ nke ọdụm; ndị na-akpasu ya iwe ga-atụfu ndụ ha.
The terror of a king is as the roaring of a lion. He who provokes him to anger sins against his own life.
3 Ọ bụ ihe nsọpụrụ nye onye na-ezere okwu na ụka, ma onye nzuzu ọbụla na-eme ngwa ise okwu.
It is an honor for a man to keep aloof from strife, but every fool will be quarrelling.
4 Onye umengwụ adịghị arụ ọrụ ubi nʼoge ya. Nʼoge owuwe ihe ubi ọ pụghị ịchọta ihe oriri.
The sluggard will not plow because of the winter. Therefore he shall beg in harvest, and have nothing.
5 Nzube niile nke dị mmadụ nʼobi bụ mmiri dị omimi, ma onye nwere nghọta na-adọpụta ha.
Purpose in the heart of man is deep water, but a man of understanding will draw it out.
6 Ọtụtụ mmadụ na-asị na ha nwere ịhụnanya na-adịghị agharịpụ, ma onye kwesiri ntụkwasị obi, onye pụrụ ịchọta ya?
Most men will proclaim every one his own goodness, but a faithful man who can find?
7 Onye ezi omume nke na-ejegharị nʼizuoke, ndị ihe na-agara nke ọma ka ụmụ ga-anọchi ya ga-abụ.
A righteous man who walks in his integrity, blessed are his sons after him.
8 Mgbe eze na-anọkwasị nʼocheeze ya ikpe ikpe, ọ na-eji anya ya abụọ afụchapụ ihe ọjọọ niile.
A king who sits on the throne of judgment scatters away all evil with his eyes.
9 Onye pụrụ ị sị, “Emeela m ka obi m dị ọcha; Abụ m onye dị ọcha, mmehie adịghịkwa nʼime m?”
Who can say, I have made my heart clean. I am pure from my sin?
10 Ihe ọtụtụ aghụghọ na ihe ọtụtụ nghọgbu, ha niile bụ ihe arụ nʼihu Onyenwe anyị.
Diverse weights, and diverse measures, both of them alike are an abomination to Jehovah.
11 Ọbụladị ụmụntakịrị ka a na-amata site nʼomume ha niile, nke a ọ pụtara nʼomume ha dị ọcha nʼezie a, bụrụkwa ihe ziri ezi?
Even a child makes himself known by his doings, whether his work be pure, and whether it be right.
12 Ntị nke na-anụ ihe na anya nke na-ahụ ụzọ, ọ bụ Onyenwe anyị mere ha abụọ.
The hearing ear, and the seeing eye, Jehovah has made even both of them.
13 Ahụla ịrahụ ụra nʼanya, ka ị ghara ịghọ onye ụkpa. Bilie, mụrụ anya, rụsie ọrụ ike, ka i nweekwa ihe oriri.
Love not sleep, lest thou come to poverty. Open thine eyes, and thou shall be satisfied with bread.
14 “Lee, ihe a jọrọ njọ, ọ baghị uru,” ka onye na-azụ ahịa na-asị, ma mgbe ọ pụrụ ọ na-anya isi nʼihi ihe ọ zụtara.
It is bad, it is bad, says the buyer, but when he is gone his way, then he boasts.
15 Ọlaedo dị, na ọtụtụ rubi nʼebe ọ bara ụba, ma egbugbere ọnụ nke na-ekwupụta ihe ọmụma bụ ọla dị oke ọnụahịa.
There is gold, and abundance of rubies, but the lips of knowledge are a precious jewel.
16 Chiri uwe onye ahụ naara onye mba ọzọ nʼaka mbe. Jichiekwa ihe mbe ahụ o nyere nʼihi onye mba ọzọ ọ nara na mbe.
Take his garment who is surety for a stranger, and hold him in pledge for foreigners.
17 Nri e nwetara nʼụzọ aghụghọ na-atọ mmadụ ụtọ. Ma nʼikpeazụ aja ga-eju ya ọnụ.
Bread of falsehood is sweet to a man, but afterwards his mouth shall be filled with gravel.
18 Buru ụzọ nata ndụmọdụ tupu i mee ihe ọbụla ị chọrọ ime; ebula agha ma i bubeghị ụzọ pịa ọpịpịa.
Every purpose is established by counsel, and by wise guidance make thou war.
19 Agwala onye na-akpa asịrị ihe nzuzo gị, nʼihi na ọ ga-akụ ya nʼekwe nye ụwa niile.
He who goes about as a tale-bearer reveals secrets. Therefore do not associate with him who opens wide his lips.
20 Oriọna onye ahụ na-akọcha nne ya na nna ya ka Chineke na-afụnyụ.
He who curses his father or his mother, his lamp shall be put out in blackness of darkness.
21 Ihe nketa nke anatara nʼoke ọsịịsọ, agaghị agọzi ya nʼikpeazụ.
An inheritance gotten hastily at the beginning shall not be blessed in the end.
22 A sịkwala, “Aga m akwụghachi gị nʼihi ihe ọjọọ a.” Chere Onyenwe anyị, ọ ga-abọrọ gị ọbọ.
Say thou not, I will recompense evil. Wait for Jehovah, and he will save thee.
23 Onyenwe anyị kpọrọ ihe ọtụtụ gbara iche iche asị, ihe ọtụtụ aghụghọ adịghị atọ ya ụtọ.
Diverse weights are an abomination to Jehovah, and a false balance is not good.
24 Onyenwe anyị na-eduzi nzọ ụkwụ niile nke mmadụ. Olee otu onye ọbụla ga-esi ghọta ụzọ ha?
A man's goings are of Jehovah, how then can man understand his way?
25 Ime ngwangwa doo ihe nsọ, bụ ịma nʼọnya ma mesie tụgharịwa uche banyere imezu nkwa ahụ.
It is a snare to a man to say rashly, It is holy. And to make inquiry after vows.
26 Eze maara ihe na-afụchapụ ndị ajọ omume, ọ na-eji wịịlu ịfụcha mkpụrụ gaa nʼelu ha.
A wise king winnows the wicked, and brings the wheel over them.
27 Akọnuche mmadụ bụ ọkụ Onyenwe anyị ji enyocha mmụọ ya, ọ na-egwupụta ala ala obi ya, igosi anyị ihe anyị bụ.
The spirit of man is the lamp of Jehovah, searching all his innermost parts.
28 Ịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi na-echebe eze, site nʼịhụnanya ka ocheeze ya na-eguzo chịm.
Kindness and truth preserve the king, and his throne is upheld by kindness.
29 Ugwu a na-akwanyere ụmụ okorobịa bụ nʼihi ịdị ike ha, ma isi awọ bụ nsọpụrụ ndị okenye.
The glory of young men is their strength, and the beauty of old men is the hoary head.
30 Ọkpọ na mmerụ ahụ na-ehichapụ ihe ọjọọ, ụtarị na-asachapụ ime ime nke ahụ mmadụ.
Stripes that wound cleanse away evil, and strokes, the innermost parts.

< Ilu 20 >