< Ilu 18 >

1 Onye ihe mmadụ na-adịghị amasị na-agbaso naanị ọchịchọ nke ya onwe ya, na-alụsokwa ezi nzube niile ọzọ ọgụ.
与众寡合的,独自寻求心愿, 并恼恨一切真智慧。
2 Nghọta adịghị atọ onye nzuzu ụtọ. Naanị ihe ọ maara bụ ikwu uche ya.
愚昧人不喜爱明哲, 只喜爱显露心意。
3 Mgbe onye ajọ omume na-abata, ka nleda anya na-abata, otu a kwa nkọcha na-eweta ihere.
恶人来,藐视随来; 羞耻到,辱骂同到。
4 Okwu ọnụ niile bụ mmiri dị omimi, ma amamihe dị ka mmiri iyi na-asọ asọ.
人口中的言语如同深水; 智慧的泉源好像涌流的河水。
5 Ọ dịghị mma ime ka ikpe gara onye mere ihe ọjọọ, si otu a gbochie onye aka ya dị ọcha inweta ikpe ziri ezi.
瞻徇恶人的情面, 偏断义人的案件,都为不善。
6 Egbugbere ọnụ ndị nzuzu na-ebutere ha esemokwu, ọnụ ha na-ebutere ha ihe otiti.
愚昧人张嘴启争端, 开口招鞭打。
7 Ọnụ onye nzuzu na-etinye ya na nsogbu, egbugbere ọnụ ya bụ ọnya nye mkpụrụobi ya.
愚昧人的口自取败坏; 他的嘴是他生命的网罗。
8 Okwu niile nke onye na-agba asịrị na-ekwu dịka iberibe nri nʼatọ ezi ụtọ, ha na-agbadakwa nʼime ime ala afọ.
传舌人的言语如同美食, 深入人的心腹。
9 Onye dị umengwụ nʼọrụ ya bụ nwanne nke onye mbibi.
做工懈怠的, 与浪费人为弟兄。
10 Aha Onyenwe anyị bụ ụlọ elu e wusiri ike, ndị ezi omume na-agbaba nʼime ya izere ndụ.
耶和华的名是坚固台; 义人奔入便得安稳。
11 Akụ ndị ọgaranya bụrụ ha obodo e wusiri ike, ọ bụkwa mgbidi dị elu nke a na-apụghị ịmafe nʼechiche ha.
富足人的财物是他的坚城, 在他心想,犹如高墙。
12 Tupu mmadụ adaa obi ya na-ejupụta na nganga, ma inwe obi umeala na-eweta nsọpụrụ.
败坏之先,人心骄傲; 尊荣以前,必有谦卑。
13 Inye ọsịsa okwu tupu mmadụ ege ntị bụ enweghị uche na ihe ihere.
未曾听完先回答的, 便是他的愚昧和羞辱。
14 Ọ bụ mmụọ mmadụ na-akwado ya nʼoge nrịa nrịa, ma mmụọ e tipịara etipịa, onye pụrụ ibuli ya?
人有疾病,心能忍耐; 心灵忧伤,谁能承当呢?
15 Obi onye nwere nghọta na-enweta ihe ọmụma, nʼihi na ntị onye maara ihe na-achọpụta ya.
聪明人的心得知识; 智慧人的耳求知识。
16 Onyinye mmadụ na-akwara ya ụzọ sara mbara, ọ na-edubakwa ya nʼihu ndị dị elu.
人的礼物为他开路, 引他到高位的人面前。
17 Nʼikpe onye buru ụzọ kwuo ihe na-ese na-adị ka onye ikpe gaara, tutu ruo mgbe mmadụ bịara bido ịjụ ya ajụjụ.
先诉情由的,似乎有理; 但邻舍来到,就察出实情。
18 Ife nza na-akwụsị esemokwu na ndọrọndọrọ dị nʼetiti mmadụ abụọ ndị olu ha na-ala elu.
掣签能止息争竞, 也能解散强胜的人。
19 Ọ dị mfe ịlụgbụ obodo karịa ime ka obi nwanne e mehiere tụgharịa. Iwe ya na-adị ike dịka ọnụ ụzọ e jiri igodo tụchie.
弟兄结怨,劝他和好,比取坚固城还难; 这样的争竞如同坚寨的门闩。
20 Site na mkpụrụ nke okwu ọnụ mmadụ mịpụtara ka afọ ga-eji ju ya. Sitekwa nʼihe owuwe ubi nke egbugbere ọnụ ha ka ha ga-eji rijuo afọ.
人口中所结的果子,必充满肚腹; 他嘴所出的,必使他饱足。
21 Ike ọnwụ na ndụ dị ire nʼaka. Ndị hụrụ ya nʼanya ga-eri mkpụrụ ya.
生死在舌头的权下, 喜爱它的,必吃它所结的果子。
22 Nwoke ahụ chọtara nwunye chọtara ezi ihe. Ọ na-anatakwa ihuọma site nʼaka Onyenwe anyị.
得着贤妻的,是得着好处, 也是蒙了耶和华的恩惠。
23 Onye ogbenye na-arịọ arịrịọ maka ebere; ma ọgaranya na-asa okwu ike ike.
贫穷人说哀求的话; 富足人用威吓的话回答。
24 Onye nwere ọtụtụ ndị enyi ndị na-ekwesighị ga-abịa nʼịla nʼiyi mgbe na-adịghị anya, ma ọ dị enyi nke na-arapara nso karịa nwanne.
滥交朋友的,自取败坏; 但有一朋友比弟兄更亲密。

< Ilu 18 >