Preface
Read
+
Publisher
Nainoia, Inc.
PO Box 462, Bellefonte, PA 16823
(814) 470-8028
Nainoia Inc, Publisher
LinkedIn/NAINOIA-INC
Third Party Publisher Resources
Request Custom Formatted Verses
Please contact us below
Submit your proposed corrections
I understand that the Aionian Bible republishes public domain and Creative Commons Bible texts and that volunteers may be needed to present the original text accurately. I also understand that apocryphal text is removed and most variant verse numbering is mapped to the English standard. I have entered my corrections under the verse(s) below. Proposed corrections to the The Igbo Holy Bible for Everyone, Proverbs Chapter 18 https://www.AionianBible.org/Bibles/Igbo---Igbo-Bible/Proverbs/18 1) Onye ihe mmadụ na-adịghị amasị na-agbaso naanị ọchịchọ nke ya onwe ya, na-alụsokwa ezi nzube niile ọzọ ọgụ. 2) Nghọta adịghị atọ onye nzuzu ụtọ. Naanị ihe ọ maara bụ ikwu uche ya. 3) Mgbe onye ajọ omume na-abata, ka nleda anya na-abata, otu a kwa nkọcha na-eweta ihere. 4) Okwu ọnụ niile bụ mmiri dị omimi, ma amamihe dị ka mmiri iyi na-asọ asọ. 5) Ọ dịghị mma ime ka ikpe gara onye mere ihe ọjọọ, si otu a gbochie onye aka ya dị ọcha inweta ikpe ziri ezi. 6) Egbugbere ọnụ ndị nzuzu na-ebutere ha esemokwu, ọnụ ha na-ebutere ha ihe otiti. 7) Ọnụ onye nzuzu na-etinye ya na nsogbu, egbugbere ọnụ ya bụ ọnya nye mkpụrụobi ya. 8) Okwu niile nke onye na-agba asịrị na-ekwu dịka iberibe nri nʼatọ ezi ụtọ, ha na-agbadakwa nʼime ime ala afọ. 9) Onye dị umengwụ nʼọrụ ya bụ nwanne nke onye mbibi. 10) Aha Onyenwe anyị bụ ụlọ elu e wusiri ike, ndị ezi omume na-agbaba nʼime ya izere ndụ. 11) Akụ ndị ọgaranya bụrụ ha obodo e wusiri ike, ọ bụkwa mgbidi dị elu nke a na-apụghị ịmafe nʼechiche ha. 12) Tupu mmadụ adaa obi ya na-ejupụta na nganga, ma inwe obi umeala na-eweta nsọpụrụ. 13) Inye ọsịsa okwu tupu mmadụ ege ntị bụ enweghị uche na ihe ihere. 14) Ọ bụ mmụọ mmadụ na-akwado ya nʼoge nrịa nrịa, ma mmụọ e tipịara etipịa, onye pụrụ ibuli ya? 15) Obi onye nwere nghọta na-enweta ihe ọmụma, nʼihi na ntị onye maara ihe na-achọpụta ya. 16) Onyinye mmadụ na-akwara ya ụzọ sara mbara, ọ na-edubakwa ya nʼihu ndị dị elu. 17) Nʼikpe onye buru ụzọ kwuo ihe na-ese na-adị ka onye ikpe gaara, tutu ruo mgbe mmadụ bịara bido ịjụ ya ajụjụ. 18) Ife nza na-akwụsị esemokwu na ndọrọndọrọ dị nʼetiti mmadụ abụọ ndị olu ha na-ala elu. 19) Ọ dị mfe ịlụgbụ obodo karịa ime ka obi nwanne e mehiere tụgharịa. Iwe ya na-adị ike dịka ọnụ ụzọ e jiri igodo tụchie. 20) Site na mkpụrụ nke okwu ọnụ mmadụ mịpụtara ka afọ ga-eji ju ya. Sitekwa nʼihe owuwe ubi nke egbugbere ọnụ ha ka ha ga-eji rijuo afọ. 21) Ike ọnwụ na ndụ dị ire nʼaka. Ndị hụrụ ya nʼanya ga-eri mkpụrụ ya. 22) Nwoke ahụ chọtara nwunye chọtara ezi ihe. Ọ na-anatakwa ihuọma site nʼaka Onyenwe anyị. 23) Onye ogbenye na-arịọ arịrịọ maka ebere; ma ọgaranya na-asa okwu ike ike. 24) Onye nwere ọtụtụ ndị enyi ndị na-ekwesighị ga-abịa nʼịla nʼiyi mgbe na-adịghị anya, ma ọ dị enyi nke na-arapara nso karịa nwanne. Additional comments?
Refresh Captcha
The world's first Holy Bible un-translation!