< Ndị Filipai 1 >

1 Pọl na Timoti, ndị bụ ohu Kraịst Jisọs, Na-edegara unu ndị ụkọchukwu, ndị okenye na ndị nsọ niile nọ nʼụlọ nzukọ Kraịst Jisọs dị nʼobodo Filipai.
To all Christ’s People at Philippi, with the Presiding Officers and Assistants, from Paul and Timothy, servants of Christ Jesus.
2 Ka amara na udo nke sitere na Chineke Nna anyị, na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịrị unu.
May God, our Father, and the Lord Jesus Christ bless you, and give you peace.
3 Ana m ekele Chineke m ekele mgbe ọbụla m chetara unu.
Every recollection that I have of you is a cause of thankfulness to God,
4 Nʼime arịrịọ niile m na-arịọ ya mgbe niile nʼekpere m nʼihi unu, obi m na-ejupụta nʼọṅụ.
always, in every prayer that I offer for you all — my prayers are full of joy —
5 Nʼihi inyeaka niile unu na-enye, ime ka izisa oziọma na-aga nʼihu ọ bụladị ruo ugbu a.
Because of the share that you have had in spreading the Good News, from the first day that you received it until now.
6 Amaara m nʼezie, na onye ahụ malitere ọrụ ọma nʼime unu, ga-aga nʼihu ịrụzu ya ruo ụbọchị Kraịst Jisọs.
For of this I am confident, that he who began a good work in you will complete it in readiness for the Day of Jesus Christ.
7 Ọ bụ ihe ziri ezi nʼebe m nọ iche ụdị echiche dị otu a banyere unu niile, nʼihi na unu dị m nʼobi. Ma m nọ nʼagbụ maọbụ na m na-echekwa oziọma, na mgbe m na-eme ka o guzosie ike, unu niile esorola m keta oke nʼamara ahụ.
And, indeed, I am justified in feeling thus about you all; because you have a warm place in my heart — you who all, both in my imprisonment and in the work of defending and establishing the Good News, shared my privilege with me.
8 Chineke bụ onye akaebe m, otu agụụ unu niile si agụsi m ike site nʼịhụnanya nke Kraịst Jisọs.
God will bear me witness how I yearn over you all with the tenderness of Christ Jesus.
9 Nke a bụkwa ekpere m, ka ịhụnanya unu na-ahụrịta onwe unu na-ababiga ụba oke. Ka unu nwee ike ito eto, ruo nʼinwe mmazu na nghọta ihe niile.
And what I pray for is this — that your love may grow yet stronger and stronger, with increasing knowledge and all discernment,
10 Ka unu nwee ike nwapụta ihe nke kachasị mma. Mgbe ahụ, unu ga-adị ọcha nʼenweghị ịta ụta ọbụla maka ụbọchị nke Kraịst.
until you are able to appreciate all moral distinctions. And I pray, too, that you may be kept pure and blameless against the Day of Christ,
11 Ebe e mejupụtara unu na mkpụrụ nke ezi omume nke sitere na Jisọs Kraịst iji bulie Chineke elu ma nyekwa ya otuto.
bearing a rich harvest of that righteousness which comes through Jesus Christ, to the glory and praise of God.
12 Ugbu a ụmụnna m, nke a bụ ihe m chọrọ ime ka unu ghọta, na nsogbu niile dakwasịrị m emeela ka ọrụ ikwusa oziọma na-aga nʼihu.
Brothers, I want you to realise that what has happened to me has actually served to forward the Good News.
13 Nʼihi na ọ pụtala ihe nye ndị nche nke ụlọeze ahụ na onye ọbụla ọzọ, na ọ bụ naanị nʼihi na m bụ onye na-eso Kraịst ka e ji tụọ m mkpọrọ.
It has even become evident, not only to all the Imperial Guard, but to every one else, that it is for Christ’s sake that I am in chains.
14 Site na mkpọrọ a a tụrụ m, e meela ka ọtụtụ ụmụnna anyị bụrụ ndị nwere ezi ntụkwasị obi nʼime Onyenwe anyị, nwekwa oke nkwuwa okwu, izisa oziọma ahụ na-atụghị egwu ọbụla.
And besides this, most of our Brothers have gained confidence in the Lord through my chains, and now venture with far greater freedom to speak of God’s Message fearlessly.
15 Ọ bụ eziokwu na ụfọdụ ji ekworo na anya ụfụ na-ekwusa Kraịst, ma ụfọdụ kwa na-ezisa ya site nʼọchịchọ obi ziri ezi.
It is true that some do proclaim the Christ out of Jealousy and opposition; but there are others who proclaim him from good-will.
16 Ndị ahụ ji ọchịchọ obi ziri ezi na-eme nke a nʼịhụnanya ebe ha matara na e tinyere m ebe a nʼihi izisa oziọma.
The latter do it from love for me, knowing that I have been appointed to plead the cause of the Good News.
17 Ndị mbụ ahụ na-ekwusa Kraịst site nʼọchịchọ obi nke onwe ha, ọ bụghị site nʼezi obi, ebe ha na-eche na ha ga-akpalị nsogbu nye m nʼime mkpọrọ.
The former spread the news of the Christ in a factious spirit, and not sincerely, thinking to add to the pain of my chains.
18 Gịnịkwa ka ogbochiri? Otu ọ dị, maọbụ nʼụzọ aghụghọ maọbụ nʼeziokwu, ihe dị mkpa bụ nʼụzọ ọbụla a na-ekwusa oziọma Kraịst, nʼihi nke a ka m na-aṅụrị ọṅụ. E, m ga-aṅụrịkwa ọṅụ mgbe niile.
But what of that? Only that in some way or other, either with assumed or with real earnestness, Christ is being made known; and at that I rejoice.
19 Nʼihi na-amaara m na site nʼekpere unu, ya na ịgbaume nke Mmụọ Jisọs Kraịst ihe ndị a niile dakwasịrị m ga-emesi ghọọrọ m nzọpụta.
Yes, and I will rejoice, for I know that, through your prayers and through a rich supply of the Spirit of Jesus Christ, ‘all this will make for my Salvation.’
20 Nʼihi na olileanya m na ntụkwasị obi m bụ na ihere agaghị eme m nʼụzọ ọbụla, kama, aga m enwe ezi agbamume nke ga-eme ka e bulie Kraịst elu nʼahụ m, ma ugbu a ma mgbe niile, maọbụ na ndụ, ma ọ bụkwanụ nʼọnwụ.
And this will fulfil my earnest expectation and hope that I shall have no cause for shame, but that, with unfailing courage, now as hitherto, Christ will be honoured in my body, whether by my life or by my death,
21 Nʼihi na nʼebe m nọ, ịdị ndụ bụ Kraịst, ịnwụ ọnwụ bụkwa uru.
for to me life is Christ, and death is gain.
22 Ma ọ bụrụ na ịdị ndụ nʼanụ ahụ, nke a buuru m ịrụpụta ọrụ bara uru, enweghị m ike ikwu nke m ga-ahọrọ.
But what if the life here in the body — if this brings me fruit from my labours? Then which to choose I cannot tell! I am sorely perplexed either way!
23 Ụzọ ihe abụọ a na-eche m ihu: Ma ọchịchọ obi m bụ ịlakwuru Kraịst, nʼihi na ọ bụ nke kachasị mma.
My own desire is to depart and be with Christ, for this would be far better.
24 Ma ọ pụtara ihe na ọ dị mkpa nye unu ma ọ bụrụ na m adịrị ndụ nʼanụ ahụ.
But, for your sakes, it may be more needful that I should still remain here in the body.
25 Ebe nke a doro m anya, amara m na mụ na unu niile ga-aga nʼihu ịnọ maka ọganihu na ọṅụ nke unu nʼime okwukwe.
Yes, I am confident that this is so, and therefore I am sure that I shall stay, and stay near you all, to promote your progress and joy in the Faith;
26 Ka mgbe m ga-abịakwute unu ọzọ, unu ga-enwebiga ọṅụ oke nʼime Kraịst Jisọs nʼihi m.
so that, when you once more have me among you, you, in your union with Christ Jesus, may find in me fresh cause for exultation.
27 Ma nʼọnọdụ ọbụla, na-ebinụ ndụ kwesiri oziọma nke Kraịst, ma abịara m leta unu maọbụ na abịaghị m, ka a mata na unu guzosiri ike nʼotu mmụọ, werekwa otu obi na-agba mgba nʼokwukwe nke ikwusa oziọma,
Under all circumstances let your lives be worthy of the Good News of the Christ: so that, whether I come and see you, or whether I hear of your affairs at a distance, I may know that you are standing firm, animated by one spirit, and joining with one heart in a common struggle for the Faith taught by the Good News,
28 na-atụghị ụjọ ihe ndị na-emegide unu ga-eme. Iguzosi ike unu ga-agbara ha ezi ama banyere ịla nʼiyi nke ga-abịakwasị ha. Ma nʼebe unu nọ, ọ ga-abụrụ unu nzọpụta pụtara ihe nke sikwa nʼebe Chineke nọ bịa.
without ever shrinking from your opponents. To them this will be a sign of their Destruction and of your Salvation — a sign from God.
29 Nʼihi na ohere ahụ e nyere unu, abụghị naanị ikwere na Kraịst, kama ọ bụkwa ịhụ ahụhụ nʼihi ya.
For, on behalf of Christ, you have had the privilege granted you, not only of trusting in him, but also of suffering on his behalf.
30 Unu nọ na-agabiga ụdị ibu agha ahụ unu hụrụ na m gabigara, nke unu na-anụkwa na m ka nọ nʼime ya ugbu a.
You will be engaged in the same hard struggle as that which you once saw me waging, and which you hear that I am waging still.

< Ndị Filipai 1 >