< Nehum 1 >
1 Amụma banyere obodo Ninive. Akwụkwọ ọhụ Nehum, onye obodo Elkosh.
Umthwalo weNineve. Ugwalo lombono kaNahume umElikoshi.
2 Onyenwe anyị bụ onye ekworo, bụrụkwa Chineke na-abọ ọbọ. Onyenwe anyị na-aga ịbọ ọbọ, ọnụma jukwara ya obi. Onyenwe anyị na-abọ ọbọ nʼahụ ndị iro ya, oke ọnụma ya na-adịgidekwa megide ndị iro ya.
INkosi inguNkulunkulu olomona lophindiselayo; iNkosi ingumphindiseli, njalo ilolaka; iNkosi ingumphindiseli ezitheni zayo, igcinela izitha zayo ulaka.
3 Onyenwe anyị adịghị ewe iwe ọsịịsọ; ma ọ bụ onye ike ya dị ukwuu, Onyenwe anyị agaghị ahapụ onye ikpe mara ka ọ laa na-enweghị ntaramahụhụ. Ụzọ ya dị nʼoke ikuku, na nʼoke ifufe, igwe ojii bụ uzuzu nke ụkwụ ya.
INkosi iyaphuza ukuthukuthela, njalo yinkulu ngamandla, kayiyikumkhulula lokumkhulula olecala; iNkosi, indlela yayo isesivunguzaneni lesiphepheni, lamayezi aluthuli lwenyawo zayo.
4 Ọ na-abasiri oke osimiri mba ike, mee ka ọ taa, o mekwaala ka osimiri niile takọrọ. Bashan na Kamel na-akpọnwụ, otu a kwa, nʼosisi ndụ jupụtara Lebanọn na-achanwụsị.
Ikhuza ulwandle, ilwenze lome, yomise yonke imifula: IBashani iyabuna, leKharmeli, leluba leLebhanoni liyabuna.
5 Nʼihu ya, ugwu niile na-eme mkpọtụ, ugwu nta niile na-agbazekwa, elu ụwa niile na-amakwa jijiji nʼihu ya, ọ bụladị ụwa dum, na ndị niile bi nʼime ya.
Izintaba ziyanyikinyeka phambi kwayo, lamaqaqa ayancibilika; lelizwe liyaphakama phambi kwayo, lomhlaba, labo bonke abahlala kuwo.
6 Onye ga-eguzogide oke iwe ya? Ọ bụkwa onye ga-eguzosi ike nʼiwe ya dị ọkụ? A wụpụla ọnụma ya dịka ọkụ, e tipịasịala nkume niile ndị ahụ nʼihu ya.
Ngubani ongema phambi kwentukuthelo yayo? Njalo ngubani ongema ekuvutheni kolaka lwayo? Intukuthelo yayo iyathululeka njengomlilo, lamadwala adilizwe yiyo.
7 Onyenwe anyị dị mma. Ọ bụ ebe mgbaba nʼụbọchị nsogbu. Ọ na-elekọta ndị niile na-atụkwasị ya obi,
INkosi ilungile, iyinqaba ngosuku lwenhlupheko; iyabazi abathembela kuyo.
8 ma ọ ga-eji idee mmiri dị ukwuu gbuo ndị iro ya niile, ọ ga-achụba ndị iro ya nʼọchịchịrị.
Kodwa ngesikhukhula esiphuphumayo izaqeda indawo yakho, lobumnyama buxotshane lezitha zayo.
9 Kedụ izu ọjọọ unu na-agba megide Onyenwe anyị ọ ga-eweta ihe niile nʼisi njedebe; nsogbu agaghị abịakwa nke ugboro abụọ.
Lenza amacebo bani amelane leNkosi? Yona izakwenza isiphetho esipheleleyo; ukuhlupheka kakuyikuvuka ngokwesibili.
10 Ha ga-abụ ndị a tụhịkọtara nʼetiti ogwu, ndị mmanya ha ṅụbigara oke na-egbu, ha ga-ala nʼiyi dịka ahịhịa kpọrọ nkụ.
Ngoba besathandelene njengameva, bedakiwe njengezidakwa, bazaqedwa njengamabibi omileyo ngokugcweleyo.
11 Ọ bụ nʼime gị, Ninive, ka otu onye si pụta, bụ onye ahụ gbara izu ọjọọ megide Onyenwe anyị, na-echepụtakwa ajọ atụmatụ.
Kuphumile kuwe onakana okubi emelene leNkosi, umcebisi omubi.
12 Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru, “Ọ bụ ezie na ha siri ike, ma bakwaa ụba nʼọnụọgụgụ, ha ga-abụ ndị a ga-egbutu na ndị ga-agabiga. Ọ bụ ezie na m ataala gị bụ Juda ahụhụ, ma agaghị m atakwa gị ahụhụ ọzọ.
Itsho njalo iNkosi: Loba bevikelekile, langokunjalo bebanengi, kanti ngokunjalo bazaqunywa, lapho esedlula. Loba ngikuhluphile, kangisayikukuhlupha.
13 Ugbu a, aga m agbajipụ agbụ yoku ọ nyanyere unu nʼolu, tibikwaa ụdọ igwe e jiri kegide unu.”
Ngoba khathesi ngizakwephula ijogwe lakhe lisuke kuwe, ngiqamule izibopho zakho.
14 Onyenwe anyị enyela iwu ya banyere gị, Ninive: “Ị gaghị enwekwa ụmụ ụmụ ndị ga-aza aha gị. Aga m ala arụsị unu niile a pịrị apị na ndị a kpụrụ akpụ nʼiyi, bụ arụsị ndị ahụ dị nʼụlọnsọ nke chi unu niile. Aga m akwadokwa ili gị, nʼihi na ị bụrụla onye jọgburu onwe ya na njọ.”
Njalo iNkosi ilayile ngawe ukuthi kakusayikuhlanyelwa lutho lwebizo lakho; ngizaquma izithombe ezibaziweyo lezithombe ezibunjwe ngokuncibilikisa ziphume endlini yabonkulunkulu bakho; ngizakwenza ingcwaba lakho; ngoba udelelekile.
15 Lee, nʼelu ugwu niile ka ụkwụ onye ahụ na-eweta oziọma dị, bụ onye ahụ na-ekwusa na udo ga-adị! Mee mmemme gị niile gị Juda, mezukwaa nkwa niile i kwere. Nʼihi na ndị ajọ omume agakwaghị ebuso gị agha, nʼihi na a ga-ala ha nʼiyi kpamkpam.
Khangelani ezintabeni izinyawo zoletha izindaba ezinhle, omemezela ukuthula! Wena Juda, gubha imikhosi yakho, khokha izifungo zakho; ngoba omubi kasayikudabula kuwe futhi, uqunyiwe ngokupheleleyo.