< Maika 7 >
1 Ahụhụ dịrị m! Adị m ka onye na-achịkọta mkpụrụ osisi vaịnị nʼọkọchị, mgbe a ghọkọtachara mkpụrụ dị nʼubi vaịnị. O nweghị ụyọkọ mkpụrụ vaịnị ọbụla fọdụrụ nke e nwere ike ịta, o nwekwaghị mkpụrụ fiig buru ụzọ chaa nke agụ ya na-agụsị m ike
Maye kimi! Ngoba nginjengokuvunwa kwezithelo zasehlobo, njengokukhothozwa kwesivini; kakulahlukuzo lokudliwa; umphefumulo wami uloyisa isithelo sokuqala esivuthiweyo.
2 Ndị ezi omume agwụla nʼụwa, ọ dịkwaghị otu onye na-eme ihe ziri ezi fọdụrụ. Ha niile na-echere oghere ịkwafu ọbara, ha ji ụgbụ na-achụta nta, onye ọbụla na-achụ ụmụnne ya.
Olungileyo ubhubhile esuka emhlabeni; njalo kakho oqotho phakathi kwabantu; bonke bacathamele igazi, bayazingela ngulowo lalowo umfowabo ngembule.
3 Ọrụ nke aka ha abụọ na-arụpụta nke ọma bụ ajọ omume. Onyeisi na-ana onyinye, onye ọkaikpe na-eri ngarị, ndị dị ike na-atụpụta ihe masịrị ha, si otu a na-akpagbu eziokwu.
Ukuze benze okubi ngezandla zombili ngokutshiseka, isiphathamandla siyacela, lomahluleli uyacela umvuzo; lomkhulu ukhuluma inkanuko yomphefumulo wakhe, bayakwelukanisa.
4 Onye nke kachasị ibe ya ịdị mma nʼime ha dịka uke. Onye nke na-eme ihe ziri ezi nʼime ha jọrọ njọ karịa ogige ogwu. Ma ugbu a, ụbọchị Chineke na-eleta gị abịala, ụbọchị ahụ ndị nche gị na-akụ ekwe ịdọ aka na ntị. Ugbu a bụ oge ihe ịgba gharịị nye ha.
Ongcono wabo unjengameva; oqotho kubo mubi kulothango; usuku lwabalindi bakho, ukuhanjelwa kwakho sekufikile; khathesi kuzakuba khona ukudideka kwabo.
5 Ekwenyerela onye agbataobi gị, atụkwasịla onye bụ ezi enyi gị obi. Kpachara anya gị, nʼihe gbasara okwu ọnụ gị, ọbụla dị nʼebe nwunye gị nọ.
Lingabeki ithemba kumngane, lingakholwa umhlobo; gcina iminyango yomlomo wakho kuye umfazi olala esifubeni sakho.
6 Nʼihi na nwa na-elelị nna ya anya. Nwa nwanyị na-ebili megide nne ya. Nwunye nwa megidekwa nne di ya, ndị iro mmadụ bụ ndị ezinaụlọ ya.
Ngoba indodana idelela uyise, indodakazi ivukela unina, umalokazana avukele uninazala; izitha zomuntu ngabantu bendlu yakhe.
7 Ma mụ onwe m, ana m ele Onyenwe anyị anya nʼihi inyeaka ya. Eji m olileanya na-echere Chineke Onye nzọpụta m. Chineke m ga-anụ olu m.
Ngakho mina ngizakhangela eNkosini, ngilindele uNkulunkulu wosindiso lwami; uNkulunkulu wami uzangizwa.
8 Achịkwala m ọchị gị onye iro m. Mgbe m dara, aga m ebilitekwa. Mgbe m nọ nʼime ọchịchịrị, Onyenwe anyị nʼonwe ya ga-abụ ihe m.
Ungathokozi ngami, sithakazi sami; lapho ngisiwa, ngizavuka; lapho ngihlezi emnyameni, iNkosi izakuba yikukhanya kimi.
9 Nʼihi na m emehiela megide ya, aga m anabatara onwe m ahụhụ nke ọnụma Onyenwe anyị, tutu ruo mgbe ọ ga-ekpe ikpe m, mee ka m guzosie ike. Ọ ga-akpọpụta m nʼìhè; aga m elekwasịkwa ezi omume ya anya.
Ngizaluthwala ulaka lweNkosi, ngoba ngonile kuyo, ize imele udaba lwami, ingenzele isahlulelo. Izangikhuphela ekukhanyeni, ngibone ukulunga kwayo.
10 Mgbe ahụ, ndị iro m ga-ahụ, ihere ga-ekpuchi onye ahụ sịrị m, “Olee ebe Onyenwe anyị Chineke gị ahụ nọ.” Aga m eji anya m hụ mgbe ọ ga-ada, ọ bụladị dịka e si na-azọ ya ụkwụ, dịka apịtị dị nʼokporoụzọ.
Ngakho isithakazi sami sizabona, lehlazo limembese yena owathi kimi: Ingaphi iNkosi uNkulunkulu wakho? Amehlo ami azambona; khathesi uzanyathelelwa phansi njengodaka lwezitalada.
11 Ụbọchị a ga-ewugharị mgbidi gị niile na-abịa; ụbọchị a ga-eme ka oke ala gị saa mbara.
Ngosuku imiduli yakho ezakwakhiwa ngalo, ngalolosuku isimiso sizakuba khatshana.
12 Nʼụbọchị ahụ, ha ga-abịakwute gị, site na Asịrịa ruo na obodo niile nke Ijipt, sitekwa nʼIjipt ruo Yufretis, site nʼosimiri ruo osimiri, sitekwa nʼugwu ruo nʼugwu.
Ngalolosuku uzafika lakuwe evela eAsiriya, lemizini ebiyelweyo; njalo kusukela ezinqabeni kuze kube semfuleni, kusukela elwandle kusiya elwandle, kusukela entabeni kusiya entabeni.
13 Ma ụwa ga-aghọ ebe tọgbọrọ nʼefu nʼihi ndị bi nʼime ya, iji kwụọ ha ụgwọ ihe ọjọọ niile ha mere.
Lanxa kunjalo ilizwe lizakuba yincithakalo ngenxa yabahlali balo, ngenxa yesithelo sezenzo zabo.
14 Were mkpanaka gị zụọ ndị gị, bụ igwe ewu na atụrụ nke ihe nketa gị, ndị bi naanị ha nʼoke ọhịa, nʼebe ịta nri nke ahịhịa ndụ jupụtara. Kwere ka ha taa ahịhịa ndụ nke Bashan, na nke Gilead, dịka na mgbe ochie.
Yelusa abantu bakho ngentonga yakho, umhlambi welifa lakho, ohlala wodwaehlathini, phakathi kweKharmeli. Kabadle eBashani leGileyadi, njengensukwini zasendulo.
15 “Dịka nʼụbọchị ahụ unu sitere nʼIjipt pụta, aga m egosi ha ọrụ ịtụnanya m niile.”
Njengezinsukwini zokuphuma kwakho elizweni leGibhithe, ngizamtshengisa izimangaliso.
16 Mba dị iche iche ga-ahụ ya, ihere ga-emekwa ha, nʼime ịdị ike ha niile. Ha ga-ekpuchi aka nʼọnụ ha, ntị ga-echikwa ha.
Izizwe zizabona ziyangeke ngamandla azo wonke; zizabeka isandla phezu komlomo; indlebe zazo zibe yizacuthe.
17 Ha ga-aracha aja dịka agwọ, na dịka anụ dị iche iche, nke na-akpụ akpụ nʼala. Ha ga-eji ịma jijiji si nʼebe ha e wusiri ike pụta. Nʼihi egwu ha, ha ga-abịakwute Onyenwe anyị bụ Chineke anyị. Ha ga-atụkwa egwu gị.
Zizakhotha uthuli njengenyoka, njengezihuquzelayo zomhlaba zizathuthumela ekuvalekeni kwazo, zizamesaba uJehova uNkulunkulu wethu, zesabe ngenxa yakho.
18 Onye bụ chi ahụ dịka gị, nke na-agbaghara ma na-ehichapụ mmehie na njehie nke ndị fọdụrụ afọdụ nʼetiti ihe nketa gị? Ị naghị anọgide na-ewe iwe ruo mgbe ebighị ebi, kama ị bụ onye ọ na-atọ ụtọ inwe obi ebere.
Ngubani onguNkulunkulu njengawe, othethelela isono, adlule esiphambekweni sensali yelifa lakhe? Kagcini ulaka lwakhe kuze kube phakade, ngoba ethokoza emuseni.
19 Ọ ga-emekwara anyị ebere ọzọ. Ọ ga-azọdakwa mmehie anyị nʼokpuru ukwu ya, Ị ga-atụbakwa mmehie anyị niile nʼebe dịkarịsịrị omimi nke oke osimiri.
Uzaphenduka, asihawukele; uzanyathelela phansi iziphambeko zethu; wena uzaphosela zonke izono zabo ezinzikini zolwandle.
20 Ị ga-egosi Jekọb ntụkwasị obi, gosikwa Ebraham ịhụnanya gị, dịka ị ṅụọrọ nna nna anyị ha nʼiyi, site na mgbe ochie.
Uzanika iqiniso kuJakobe, umusa kuAbrahama, owakufungela obaba bethu kusukela ensukwini zendulo.