< Matiu 16 >

1 Ndị Farisii na ndị Sadusii bịakwutere Jisọs ịnwa ya ọnwụnwa. Ha gwara ya sị, “Gosi anyị ihe ịrịbama si nʼeluigwe.”
AND the Pharisees and the Sadducees came to him, and, to make trial of him, desired him to shew them a sign from heaven.
2 Ọ zara ha, “Mgbe o ruru anyasị unu na-asị, ‘Ihu eluigwe ga-adị mma nʼihi na ọ na-acha uhie uhie.’
And he answering, said unto them, When evening comes, ye say, Fair weather, for the sky is red.
3 Nʼụtụtụ unu na-asị, ‘Anyị ga-enwe mmiri ozuzo taa nʼihi na ihu eluigwe na-acha uhie uhie ma na-eji oji.’ Lee na unu pụrụ ịkọwa ihu eluigwe, ma unu apụghị isite nʼihe ịrịbama ndị a unu na-ahụ anya kọwaa ihe oge a anyị nọ nʼime ya pụtara.
And in the morning, It will be tempestuous to-day, for the sky is gloomy and fiery red. Ye hypocrites, do ye know how to discern the appearance of the sky, and are ye unable to discern the signs of the times?
4 Ajọ ọgbọ nke jupụtara nʼịkwa iko, nke na-arịọkwa ihe ịrịbama. Ọ nweghị ihe ịrịbama ọzọ a ga-egosi ya karịa ihe ịrịbama Jona.” Mgbe ahụ ọ sitere nʼebe ahụ ha nọ pụọ.
A wicked and adulterous generation seeketh a sign; and no sign shall be given to it, but the sign of the prophet Jonah. And he left them, and departed.
5 Mgbe ha gafesịrị nʼofe ọzọ, ndị na-eso ụzọ ya chetara na ha ejighị achịcha ọbụla.
And when his disciples were come to the other side, they had forgotten to take bread.
6 Nʼoge ahụ kwa, Jisọs dụrụ ha ọdụ sị ha, “Lezienụ anya, ma na-ezekwa ihe ndị na-eko achịcha ndị Farisii na ndị Sadusii.”
Then Jesus said to them, Beware and abstain from the leaven of the Pharisees and of the Sadducees.
7 Ha malitere na-ekwurịta nʼetiti onwe ha, na-asị, ọ bụ nʼihi na anyị ewetaghị ogbe achịcha ọbụla.
So they reasoned among themselves, saying, It is because we have not taken bread.
8 Ebe ọ bụ na Jisọs matara ihe ha na-eche, ọ sịrị, “Unu ndị okwukwe nta! Gịnị mere unu ji na-esogbu onwe unu nʼihi na unu enweghị achịcha?
But when Jesus knew it, he said unto them, Why are ye reasoning among yourselves, O ye of little faith, because ye have not taken bread?
9 Olee mgbe unu ga-amata ihe? Ọ bụ na unu echetaghị puku mmadụ ise ahụ m jiri ogbe achịcha ise mee ka ha rijuo afọ? Ọ bụ nkata ole ka unu tụtụjuru?
Do you not consider, nor remember the five loaves among the five thousand, and how many baskets ye took up?
10 Unu echetakwaghị na m ji ogbe achịcha asaa zụọ puku mmadụ anọ? Iberibe achịcha juru nkata ole ka unu tụtụkọtara?
Nor the seven loaves among the four thousand, and how many baskets ye took up?
11 Gịnị mere unu aghọtaghị na ọ bụghị ihe banyere achịcha ka m na-ekwu? Cheenụ onwe unu nche nʼebe ihe na-eko achịcha ndị Farisii na ndị Sadusii nọ.”
How is it that ye do not understand, that I spake not to you of bread, to beware of the leaven of the Pharisees and of the Sadducees?
12 Mgbe ahụ ka ha ghọtara na ihe ọ na-akọwara ha abụghị ihe banyere ihe na-eko achịcha nke a na-ata ata, kama ọ bụ ihe banyere ozizi ndị Farisii na ndị Sadusii.
Then understood they, that he spake about abstaining not from the leaven in the bread, but from the doctrine of the Pharisees and the Sadducees.
13 Mgbe Jisọs bịaruru obodo a na-akpọ Sizaria Filipai, ọ jụrụ ndị na-eso ụzọ ya ajụjụ sị ha, “Onye ka ndị mmadụ na-asị na Nwa nke Mmadụ bụ?”
Then Jesus coming into the parts of Caesarea Philippi, questioned his disciples, saying, Who do men say that I am? The Son of Man?
14 Ha zara ya sị, “Ụfọdụ na-asị na ị bụ Jọn omee baptizim, ụfọdụ na-asị na ị bụ Ịlaịja, ndị ọzọ na-asịkwa na ị bụ Jeremaya, maọbụ otu nʼime ndị amụma.”
But they replied, Some, that thou art John the Baptist; but others, Elias; and others again, Jeremiah, or one of the prophets.
15 Ọ jụrụ ha sị, “Ma unu onwe unu, ọ bụ onye ka unu na-asị na m bụ?”
He saith unto them, But who do ye say that I am?
16 Saimọn Pita zara sị ya, “Ị bụ Kraịst ahụ, Ọkpara Chineke dị ndụ.”
Then Simon Peter answering said, Thou art the Messiah, the Son of the living God.
17 Jisọs gwara ya sị, “Saimọn Pita nwa Jona, ị bụ onye a gọziri agọzi, nʼihi na anụ ahụ na ọbara ekpugheghị ya nye gị. Kama, ọ bụ Nna m bi nʼeluigwe mere ka ị mata ya.
And Jesus replying, said to him, Blessed art thou, Simon Barjona; for flesh and blood hath not revealed this to thee, but my Father, who is in heaven.
18 Ma mụ onwe m na-agwa gị, na gị onwe gị bụ Pita. Ọ bụkwa nʼelu nkume a ka m ga-ewu ụlọ chọọchị m. Ike niile nke ọkụ ala mmụọ apụghịkwa iguzo megide ya. (Hadēs g86)
And I tell thee, That thou art Peter, and upon this rock will I build my church, and the gates of hell shall not prevail against it. (Hadēs g86)
19 Aga m enye gị mkpisi igodo alaeze eluigwe. Ihe ọbụla ị ga-eke agbụ nʼelu ụwa, ka a ga-ekekwa agbụ nʼeluigwe. Ihe ọbụla ị ga-atọpụ nʼagbụ nʼụwa, a ga-atọpụkwa ya nʼeluigwe.”
And I will give thee the keys of the kingdom of heaven: and whatsoever thou shalt bind on earth shall be bound in heaven; and whatsoever thou shalt loose on earth shall be loosed in heaven.
20 Mgbe ahụ, o nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu ka ha ghara ime ka onye ọbụla mata na ya bụ Kraịst ahụ.
Then he commanded his disciples, that they should tell no man that he was Jesus the Messiah.
21 Site nʼoge ahụ Jisọs malitere ịkọwara ndị na-eso ụzọ ya, na ya aghaghị ịga Jerusalem, ebe ọ ga-ahụ ọtụtụ ahụhụ dị iche iche site nʼaka ndị okenye, na ndịisi nchụaja, na ndị ozizi iwu. O mere ka ha mata na aghaghị igbu ya, ma nʼụbọchị nke atọ, a ga-eme ka o site nʼọnwụ bilie.
From that time Jesus began to shew his disciples, that he must go to Jerusalem, and suffer many things of the elders, and of the chief-priests, and of the scribes, and be put to death, and the third day rise again.
22 Pita duuru ya pụọ nʼotu akụkụ, nọdụ nʼebe ahụ baara ya mba sị ya, “Onyenwe m, Chineke ekwela. Ihe ndị a agaghị adakwasị gị!”
And Peter taking him aside, began to chide him, saying, Mercy on thee, Lord! this shall never be thy case.
23 Ma o chigharịrị sị Pita, “Si nʼebe m nọ pụọ, ekwensu! Ị bụ ihe mgbochi nye m. Nʼihi na ihe ị na-eche echiche ya bụ naanị echiche mmadụ, ọ bụghị uche Chineke.”
Then turning from him, he said unto Peter, Get thee behind me Satan! thou art an offence to me: for thou dost not relish the things of God, but those of men.
24 Mgbe ahụ Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Ọ bụrụ na onye ọbụla achọọ ịbụ onye na-eso ụzọ m, ya buru ụzọ jụ onwe ya, buru obe ya, soro m nʼazụ.
Then said Jesus to his disciples, If any man will come after me, let him deny himself, and take up his cross, and follow me.
25 Nʼihi na onye ọbụla na-eche ndụ ya nche ka ọ hapụ ifunarị ya ga-atụfu ya. Ma onye ọbụla tufuru ndụ ya nʼihi m, ga-achọtakwa ya.
For whosoever is desirous to preserve his life, shall lose it; but whosoever would lose his life for my sake, shall find it.
26 Nʼihi na uru gịnị ka mmadụ nwetara ma ọ bụrụ na o ritechaa ụwa niile nʼuru ma tufuo ndụ ya? Maọbụ gịnị bụ ihe ahụ dị nʼụwa nke mmadụ ga-eji gbanwee ndụ ya?
For what would a man be advantaged, though he could gain the whole world, if he should suffer the loss of his soul? or what will a man give as the ransom for his soul?
27 Nʼihi na Nwa nke Mmadụ ga-abịa nʼebube nke Nna ya, ya na ndị mmụọ ozi ya. Mgbe ahụ ka ọ ga-ekpe onye ọbụla ikpe dị ka ọrụ ya si dị.
For the Son of man shall hereafter come in the glory of his Father, with his angels, and then shall he recompense every man according to his practice.
28 “Nʼezie asị m unu, ụfọdụ nʼime ndị guzo nʼebe, agaghị edetụ ọnwụ ire, tụpụ ha ahụ Nwa nke Mmadụ ka ọ na-abịa nʼalaeze ya.”
Verily I say unto you, There are some of those standing here, who shall in no wise taste of death, until they see the Son of man coming in his kingdom.

< Matiu 16 >