< Joshua 1 >

1 Mgbe Mosis, bụ odibo Onyenwe anyị nwụrụ, Onyenwe anyị gwara Joshua nwa Nun, onye na-enyere Mosis aka okwu sị,
Kwasekusithi emva kokufa kukaMozisi inceku yeNkosi, iNkosi yakhuluma kuJoshuwa indodana kaNuni, inceku kaMozisi, isithi:
2 “Mosis, odibo m anwụọla. Ugbu a, jikere onwe gị, meekwa ka ndị m jikere ịgafe ofe ọzọ nke osimiri Jọdan, ịbanye nʼala ahụ m na-aga inye ha, bụ ndị Izrel.
UMozisi inceku yami usefile; ngakho-ke sukuma uchaphe le iJordani, wena labo bonke lababantu, liye elizweni engibanika lona, ebantwaneni bakoIsrayeli.
3 Ana m agwa gị ihe m gwara Mosis mgbe ọ dị ndụ sị, Ebe ọbụla unu ga-azọkwasị ụkwụ unu nʼala, ala ahụ ga-abụ nke unu.
Yonke indawo lapho ingaphansi yonyawo lwenu ezanyathela khona ngilinike yona, njengokutsho kwami kuMozisi.
4 Oke ala unu ga-abụ site nʼọzara dị na ndịda ruo Lebanọn, ma site nʼiyi ukwu Yufretis, tinyere ala niile nke ndị Het, ruo nʼosimiri ukwu ahụ dị nʼọdịda anyanwụ.
Kusukela enkangala lale iLebhanoni kuze kufike emfuleni omkhulu, umfula iYufrathi, ilizwe lonke lamaHethi, njalo kufike elwandle olukhulu lapho okutshona khona ilanga, kuzakuba ngumngcele wenu.
5 Ọ dịghị onye ọbụla pụrụ iguzo imegide gị ụbọchị niile nke ndụ gị. Aga m anọnyere gị dịka m si nọnyere Mosis. Agaghị m ahapụ gị aka. Agaghị m agbakụtakwa gị azụ.
Kakulamuntu ozakuma phambi kwakho zonke izinsuku zempilo yakho. Njengalokhu ngangiloMozisi, ngizakuba lawe; kangiyikukutshiya, kangiyikukulahla.
6 Dịrị ike, nweekwa ume, nʼihi na ị ga-abụ onye ga-edu ndị a iketa ala ahụ m ṅụrụ nʼiyi inye nna nna ha ochie.
Qina, ume isibindi, ngoba wena uzakwenza lababantu badle ilifa lelizwe engalifungela oyise ukubanika lona.
7 “Naanị dịrị ike, nweekwa ume. Lezie anya ime ihe niile Mosis bụ odibo m nyere gị nʼiwu. Ewezugala onwe gị na ya gaa aka nri maọbụ aka ekpe, ka ihe si otu a gaara gị nke ọma nʼebe ọbụla ị na-aga.
Kuphela qina, ube lesibindi esikhulu, ukugcina ukwenza ngokomlayo wonke uMozisi inceku yami akulaya wona; ungaphambuki kuwo uye ngakwesokunene loba ngakwesokhohlo, ukuze uphumelele loba ngaphi lapho oya khona.
8 Esitela nʼọnụ gị wezuga ihe dị nʼAkwụkwọ Iwu a. Kama na-atụgharị uche gị na ya ehihie na abalị, ka i si otu a lezie anya imezu ihe niile e dere nʼime ya. Mgbe ahụ ị ga-aba ụba, ihe ga-agakwara gị nke ọma.
Ugwalo lwalumlayo lungasuki emlonyeni wakho, kodwa uzindle kuwo emini lebusuku, ukuze uqaphele ukwenza njengakho konke okubhaliweyo kulo, ngoba khona uzakwenza indlela yakho iphumelele, ubusuphumelela.
9 Ọ bụ na m enyebeghị gị iwu sị gị, Nwee obi ike, dịrịkwa ike! Wezuga ụjọ niile na ịda mba nke obi. Cheta na mụ, bụ Onyenwe anyị Chineke gị, nọnyeere gị ebe ọbụla ị na-aga.”
Kangikulayanga yini? Qina, ume isibindi; ungesabi, ungatshaywa luvalo, ngoba iNkosi uNkulunkulu wakho ilawe loba ngaphi lapho oya khona.
10 Mgbe ahụ, Joshua nyere ndịisi Izrel niile iwu sị ha,
UJoshuwa waselaya izinduna zabantu, esithi:
11 “Jegharịanụ nʼetiti ebe obibi ụmụ Izrel gwa mmadụ niile okwu sị ha ‘Dozierenụ onwe unu ihe unu ga-eri nʼụzọ, nʼihi na nʼime ụbọchị atọ, anyị ga-agafe osimiri Jọdan, imeri na inweta ala ahụ Onyenwe anyị bụ Chineke na-enye unu.’”
Dabulani phakathi kwenkamba lilaye abantu lithi: Zilungiseleni umphako, ngoba kusesezinsuku ezintathu lizachapha le iJordani, ukuze lingene lidle ilifa lelizwe iNkosi uNkulunkulu wenu elinika lona ukuthi lidle ilifa lalo.
12 Joshua kpọkọtara ndịisi ebo Ruben, na Gad, na ọkara ebo Manase, gwa ha okwu sị,
UJoshuwa wasekhuluma kwabakoRubeni labakoGadi lengxenye yesizwe sakoManase esithi:
13 “Chetanụ iwu ahụ Mosis odibo Onyenwe anyị nyere unu, mgbe ọ sịrị, ‘Onyenwe anyị Chineke unu na-enye unu izuike. O nyekwala unu ala a.’
Khumbulani ilizwi uMozisi inceku yeNkosi alilaya ngalo esithi: INkosi uNkulunkulu wenu iyaliphumuza, ilinika lelilizwe.
14 Kama ndị nwunye unu, na ụmụntakịrị unu, na anụ ụlọ unu, ga-anọ nʼala a dị nʼọwụwa anyanwụ nke Mosis nyere unu. Ma ndị agha unu, ndị jikeere ejike, ga-eduru ndị Izrel ndị ọzọ gafee osimiri Jọdan inyere ụmụnna ha aka,
Omkenu, abantwanyana benu, lezifuyo zenu kuzahlala elizweni uMozisi alinika lona nganeno kweJordani; kodwa lina lizachapha lihlomile phambi kwabafowenu, wonke amaqhawe alamandla, libasize,
15 tutu ruo mgbe Onyenwe anyị Chineke unu nyere ha izuike, dịka o si nye unu, na tutu ruo mgbe ha nwetara ala niile bụ nke Onyenwe anyị Chineke unu ga-enye ha. Mgbe nke a mezuru, unu ga-alaghachi azụ, nweta ala ahụ Mosis onyeozi Onyenwe anyị nyere unu nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan.”
iNkosi ize iphumuze abafowenu njengani, labo njalo badle ilifa lelizwe iNkosi uNkulunkulu wenu ebanika lona. Lizabuyela-ke elizweni lelifa lenu, lidle ilifa lalo, uMozisi inceku yeNkosi alinika lona, nganeno kweJordani, empumalanga.
16 Mgbe ahụ, ha zara Joshua, “Ihe ọbụla nke ị nyere anyị nʼiwu anyị ga-eme ha, ebe ọbụla i zigara anyị ka anyị ga-aga.
Basebemphendula uJoshuwa besithi: Konke osilaya khona sizakwenza, laloba ngaphi lapho ozasithuma khona sizahamba.
17 Anyị ga-ege gị ntị dịka anyị si gee Mosis ntị. Ka Onyenwe anyị Chineke gị nọnyere gị dịka o si nọnyere Mosis.
Njengakho konke esamlalela uMozisi ngakho, ngokunjalo sizakulalela. Kuphela iNkosi uNkulunkulu wakho ibe lawe njengoba yayiloMozisi.
18 Onye ọbụla nupuru isi nʼiwu i nyere anyị, ọ ga-anwụ. Naanị dịrị ike, nweekwa obi ike.”
Wonke umuntu ozavukela umlomo wakho, angalaleli amazwi akho, kukho konke omlaya khona, uzabulawa. Kuphela qina, ume isibindi.

< Joshua 1 >