Preface
Read
+
Publisher
Nainoia, Inc.
PO Box 462, Bellefonte, PA 16823
(814) 470-8028
Nainoia Inc, Publisher
LinkedIn/NAINOIA-INC
Third Party Publisher Resources
Request Custom Formatted Verses
Please contact us below
Submit your proposed corrections
I understand that the Aionian Bible republishes public domain and Creative Commons Bible texts and that volunteers may be needed to present the original text accurately. I also understand that apocryphal text is removed and most variant verse numbering is mapped to the English standard. I have entered my corrections under the verse(s) below. Proposed corrections to the The Igbo Holy Bible for Everyone, Joshua Chapter 1 https://www.AionianBible.org/Bibles/Igbo---Igbo-Bible/Joshua 1) Mgbe Mosis, bụ odibo Onyenwe anyị nwụrụ, Onyenwe anyị gwara Joshua nwa Nun, onye na-enyere Mosis aka okwu sị, 2) “Mosis, odibo m anwụọla. Ugbu a, jikere onwe gị, meekwa ka ndị m jikere ịgafe ofe ọzọ nke osimiri Jọdan, ịbanye nʼala ahụ m na-aga inye ha, bụ ndị Izrel. 3) Ana m agwa gị ihe m gwara Mosis mgbe ọ dị ndụ sị, Ebe ọbụla unu ga-azọkwasị ụkwụ unu nʼala, ala ahụ ga-abụ nke unu. 4) Oke ala unu ga-abụ site nʼọzara dị na ndịda ruo Lebanọn, ma site nʼiyi ukwu Yufretis, tinyere ala niile nke ndị Het, ruo nʼosimiri ukwu ahụ dị nʼọdịda anyanwụ. 5) Ọ dịghị onye ọbụla pụrụ iguzo imegide gị ụbọchị niile nke ndụ gị. Aga m anọnyere gị dịka m si nọnyere Mosis. Agaghị m ahapụ gị aka. Agaghị m agbakụtakwa gị azụ. 6) Dịrị ike, nweekwa ume, nʼihi na ị ga-abụ onye ga-edu ndị a iketa ala ahụ m ṅụrụ nʼiyi inye nna nna ha ochie. 7) “Naanị dịrị ike, nweekwa ume. Lezie anya ime ihe niile Mosis bụ odibo m nyere gị nʼiwu. Ewezugala onwe gị na ya gaa aka nri maọbụ aka ekpe, ka ihe si otu a gaara gị nke ọma nʼebe ọbụla ị na-aga. 8) Esitela nʼọnụ gị wezuga ihe dị nʼAkwụkwọ Iwu a. Kama na-atụgharị uche gị na ya ehihie na abalị, ka i si otu a lezie anya imezu ihe niile e dere nʼime ya. Mgbe ahụ ị ga-aba ụba, ihe ga-agakwara gị nke ọma. 9) Ọ bụ na m enyebeghị gị iwu sị gị, Nwee obi ike, dịrịkwa ike! Wezuga ụjọ niile na ịda mba nke obi. Cheta na mụ, bụ Onyenwe anyị Chineke gị, nọnyeere gị ebe ọbụla ị na-aga.” 10) Mgbe ahụ, Joshua nyere ndịisi Izrel niile iwu sị ha, 11) “Jegharịanụ nʼetiti ebe obibi ụmụ Izrel gwa mmadụ niile okwu sị ha ‘Dozierenụ onwe unu ihe unu ga-eri nʼụzọ, nʼihi na nʼime ụbọchị atọ, anyị ga-agafe osimiri Jọdan, imeri na inweta ala ahụ Onyenwe anyị bụ Chineke na-enye unu.’” 12) Joshua kpọkọtara ndịisi ebo Ruben, na Gad, na ọkara ebo Manase, gwa ha okwu sị, 13) “Chetanụ iwu ahụ Mosis odibo Onyenwe anyị nyere unu, mgbe ọ sịrị, ‘Onyenwe anyị Chineke unu na-enye unu izuike. O nyekwala unu ala a.’ 14) Kama ndị nwunye unu, na ụmụntakịrị unu, na anụ ụlọ unu, ga-anọ nʼala a dị nʼọwụwa anyanwụ nke Mosis nyere unu. Ma ndị agha unu, ndị jikeere ejike, ga-eduru ndị Izrel ndị ọzọ gafee osimiri Jọdan inyere ụmụnna ha aka, 15) tutu ruo mgbe Onyenwe anyị Chineke unu nyere ha izuike, dịka o si nye unu, na tutu ruo mgbe ha nwetara ala niile bụ nke Onyenwe anyị Chineke unu ga-enye ha. Mgbe nke a mezuru, unu ga-alaghachi azụ, nweta ala ahụ Mosis onyeozi Onyenwe anyị nyere unu nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan.” 16) Mgbe ahụ, ha zara Joshua, “Ihe ọbụla nke ị nyere anyị nʼiwu anyị ga-eme ha, ebe ọbụla i zigara anyị ka anyị ga-aga. 17) Anyị ga-ege gị ntị dịka anyị si gee Mosis ntị. Ka Onyenwe anyị Chineke gị nọnyere gị dịka o si nọnyere Mosis. 18) Onye ọbụla nupuru isi nʼiwu i nyere anyị, ọ ga-anwụ. Naanị dịrị ike, nweekwa obi ike.” Additional comments?
Refresh Captcha
The world's first Holy Bible un-translation!