< Job 32 >
1 Mgbe ahụ, ndị ikom atọ ndị a kwusịrị ịsa Job okwu ọbụla ọzọ nʼihi na ọ hụrụ onwe ya dịka onye ezi omume.
Bato wana misato batikaki koyanola Yobo, pamba te azalaki komimona sembo na miso na ye moko.
2 Ma oke iwe were Elihu nwa Barakel onye obodo Buz, si nʼikwu Ram megide Job nʼihi na ọ gụrụ onwe ya dịka onye ezi omume karịa Chineke.
Kasi Eliwu, mwana mobali ya Barakeyeli, moto ya libota ya Buzi mpe ya etuka ya Rami, asilikelaki Yobo makasi, pamba te amimonaki sembo koleka Nzambe.
3 Iwe wekwara ya nʼebe mmadụ atọ ndị enyi Job nọ, nʼihi na ọ dịghị ebe ha hụtara Job dịka onye ụzọ ya na-ezighị ezi, ma ha gara nʼihu ịma ya ikpe.
Asilikelaki mpe baninga misato ya Yobo, pamba te balongaki te kopesa Yobo eyano oyo esengeli; nzokande bakweyisaki Nzambe.
4 Ma ruo ugbu a, Elihu agwaghị Job okwu ọbụla nʼihi na ndị ọzọ bụ okenye nʼebe ọ nọ.
Eliwu awelaki te koloba moto ya liboso epai ya Yobo, pamba te baninga wana misato ya Yobo bazalaki mikolo na ye na mibu ya mbotama.
5 Ma mgbe ọ hụrụ na ndị ikom atọ ndị a enweghị okwu ọzọ ha ga-ekwu, nke a kpasuru ya iwe.
Kasi tango Eliwu amonaki ete bato wana misato bazali lisusu na likambo ya koloba te, asilikaki makasi.
6 Ma Elihu nwa Barakel onye obodo Buz zara sị: “Abụ m nwantakịrị nʼọnụọgụgụ afọ m gbara, ma unu bụ ndị okenye; ọ bụ nke a mere m ji gbaa nkịtị nʼụjọ, hapụ ịgwa unu ihe m maara.
Boye Eliwu, mwana mobali ya Barakeyeli, moto ya libota ya Buzi, alobaki: « Nazali leki na mibu ya mbotama, mpe bino bozali mikolo; yango wana nazalaki kobanga mpe nazangaki makasi ya koloba na bino makambo oyo ngai nayebi.
7 Echere m nʼobi m sị, ‘Ọnụọgụgụ afọ ga-ekwu okwu; ọtụtụ afọ ka ọ dịkwara ikuzi amamihe.’
Nazalaki komilobela: ‹ Bato oyo bazali na mibu ebele ya mbotama bakoyeba koloba, pamba te kozala na mibu ebele epesaka bwanya. ›
8 Ma ọ bụ mmụọ dị nʼime mmadụ, nkuume nke Onye pụrụ ime ihe niile na-enye nghọta.
Nzokande, kati na moto, ezali nde molimo, ezali pema ya Nkolo-Na-Nguya-Nyonso nde epesaka moto boyebi.
9 Ọ bụghị naanị ndị okenye bụ ndị mara ihe, ọ bụkwaghị naanị ndị gbara ọtụtụ afọ bụ ndị na-aghọta ihe ziri ezi.
Ezali kaka mibange te nde bazali na bwanya, mpe ezali kaka bampaka te nde basosolaka makambo oyo ezali sembo.
10 “Ya mere m na-asị, Geenụ m ntị; mụ onwe m ga-agwa unu ihe m ma.
Yango wana nalobi: Boyoka ngai, ngai mpe nakoloba na bino makambo oyo nayebi.
11 Echeere m oge niile unu na-ekwu okwu, egere m ntị na ntụgharị uche unu, oge niile unu na-achọpụta okwu unu ga-ekwu.
Tango bino bozalaki koloba, ngai nazalaki koloba te, nazalaki koyoka makanisi na bino, wana bozalaki koluka makambo ya koloba.
12 Egere m nnọọ unu ntị, ma ọ dịghị onye nʼime unu nwerela ike gosi Job ụzọ o si jehie; ọ dịghị onye nʼime unu zaghachiri ịrụ ụka ya.
Nalandaki bino na bokebi nyonso; moko te kati na bino amoni mabe ya Yobo, moko te kati na bino alongi makanisi ya Yobo.
13 Unu ekwula sị, ‘Anyị achọtala amamihe; ka Chineke na-abụghị mmadụ gosi ya mmehie ya.’
Boloba te: ‹ Tomoni bwanya; Nzambe kaka nde akoki kolonga ye, kasi moto te. ›
14 Ma Job edozighị okwu ya nʼusoro megide m, ya mere agaghị m eji ịrụ ụka unu zaghachi ya.
Lokola Yobo alobaki maloba na ye epai na ngai te, ngai mpe nakosalela makanisi na bino te mpo na kozongisela ye eyano.
15 “Ha adaala mba na-enweghị ihe ọzọ ha ga-ekwu; ike okwu agwụla ha.
Bayoki soni, batikali ata na liloba moko te ya koloba, makambo ya koloba esili bango na minoko!
16 M ga-echere, ugbu a ha deere duu, ugbu a ha guzo ebe ahụ na-enweghị ọsịsa?
Boni, nasengeli sik’oyo kozela, awa bazangi maloba to basuki wana mpe bakangi minoko?
17 Mụ onwe m ga-ekwu uche m; ihe m maara ka mụ onwe m ga-ekwu,
Ngai mpe nakoloba sik’oyo, nakoloba makambo oyo nayebi.
18 nʼihi na okwu juru m ọnụ, ọ bụkwa mmụọ dị nʼime m na-akwagide m.
Lokola maloba ebele etondi kati na ngai, motema na ngai ezali kopela lokola moto.
19 Nʼime m, adị m ka mmanya na-agbọ ụfụfụ a kwuchiri na karama, dịka karama akpụkpọ ọhụrụ dị njikere ịgbawa.
Kati na ngai, nazali lokola mbeki ya vino oyo ezali kotoka, lokola mbeki ya vino ya sika oyo ekomi pene ya kopasuka.
20 Aga m ekwurịrị okwu ka m sị nʼụzọ dị otu a chọta izuike; aga m emeghe egbugbere ọnụ m ma zaghachi.
Nakoloba mpo ete motema na ngai ekita, nakofungola bibebu na ngai mpo ete nayanola.
21 Agaghị m ekpe mmadụ ọbụla ikpe mmegide maọbụ jaa mmadụ ọbụla mma nʼụzọ na-ezighị ezi.
Nakopona bilongi te, nakobondela mpe moto moko te;
22 Nʼihi na ọ bụrụ na m bụ ọka nwere ire ụtọ nʼịja ihe na-ezighị ezi mma, Onye kere m ga-ewepụ m nʼoge na-adịghị anya.
pamba te, soki nayebaki kobondela bato, Mokeli na ngai alingaki kolongola ngai mbala moko.