Preface
Read
+
Publisher
Nainoia, Inc.
PO Box 462, Bellefonte, PA 16823
(814) 470-8028
Nainoia Inc, Publisher
LinkedIn/NAINOIA-INC
Third Party Publisher Resources
Request Custom Formatted Verses
Please contact us below
Submit your proposed corrections
I understand that the Aionian Bible republishes public domain and Creative Commons Bible texts and that volunteers may be needed to present the original text accurately. I also understand that apocryphal text is removed and most variant verse numbering is mapped to the English standard. I have entered my corrections under the verse(s) below. Proposed corrections to the The Igbo Holy Bible for Everyone, Job Chapter 32 https://www.AionianBible.org/Bibles/Igbo---Igbo-Bible/Job/32 1) Mgbe ahụ, ndị ikom atọ ndị a kwusịrị ịsa Job okwu ọbụla ọzọ nʼihi na ọ hụrụ onwe ya dịka onye ezi omume. 2) Ma oke iwe were Elihu nwa Barakel onye obodo Buz, si nʼikwu Ram megide Job nʼihi na ọ gụrụ onwe ya dịka onye ezi omume karịa Chineke. 3) Iwe wekwara ya nʼebe mmadụ atọ ndị enyi Job nọ, nʼihi na ọ dịghị ebe ha hụtara Job dịka onye ụzọ ya na-ezighị ezi, ma ha gara nʼihu ịma ya ikpe. 4) Ma ruo ugbu a, Elihu agwaghị Job okwu ọbụla nʼihi na ndị ọzọ bụ okenye nʼebe ọ nọ. 5) Ma mgbe ọ hụrụ na ndị ikom atọ ndị a enweghị okwu ọzọ ha ga-ekwu, nke a kpasuru ya iwe. 6) Ma Elihu nwa Barakel onye obodo Buz zara sị: “Abụ m nwantakịrị nʼọnụọgụgụ afọ m gbara, ma unu bụ ndị okenye; ọ bụ nke a mere m ji gbaa nkịtị nʼụjọ, hapụ ịgwa unu ihe m maara. 7) Echere m nʼobi m sị, ‘Ọnụọgụgụ afọ ga-ekwu okwu; ọtụtụ afọ ka ọ dịkwara ikuzi amamihe.’ 8) Ma ọ bụ mmụọ dị nʼime mmadụ, nkuume nke Onye pụrụ ime ihe niile na-enye nghọta. 9) Ọ bụghị naanị ndị okenye bụ ndị mara ihe, ọ bụkwaghị naanị ndị gbara ọtụtụ afọ bụ ndị na-aghọta ihe ziri ezi. 10) “Ya mere m na-asị, Geenụ m ntị; mụ onwe m ga-agwa unu ihe m ma. 11) Echeere m oge niile unu na-ekwu okwu, egere m ntị na ntụgharị uche unu, oge niile unu na-achọpụta okwu unu ga-ekwu. 12) Egere m nnọọ unu ntị, ma ọ dịghị onye nʼime unu nwerela ike gosi Job ụzọ o si jehie; ọ dịghị onye nʼime unu zaghachiri ịrụ ụka ya. 13) Unu ekwula sị, ‘Anyị achọtala amamihe; ka Chineke na-abụghị mmadụ gosi ya mmehie ya.’ 14) Ma Job edozighị okwu ya nʼusoro megide m, ya mere agaghị m eji ịrụ ụka unu zaghachi ya. 15) “Ha adaala mba na-enweghị ihe ọzọ ha ga-ekwu; ike okwu agwụla ha. 16) M ga-echere, ugbu a ha deere duu, ugbu a ha guzo ebe ahụ na-enweghị ọsịsa? 17) Mụ onwe m ga-ekwu uche m; ihe m maara ka mụ onwe m ga-ekwu, 18) nʼihi na okwu juru m ọnụ, ọ bụkwa mmụọ dị nʼime m na-akwagide m. 19) Nʼime m, adị m ka mmanya na-agbọ ụfụfụ a kwuchiri na karama, dịka karama akpụkpọ ọhụrụ dị njikere ịgbawa. 20) Aga m ekwurịrị okwu ka m sị nʼụzọ dị otu a chọta izuike; aga m emeghe egbugbere ọnụ m ma zaghachi. 21) Agaghị m ekpe mmadụ ọbụla ikpe mmegide maọbụ jaa mmadụ ọbụla mma nʼụzọ na-ezighị ezi. 22) Nʼihi na ọ bụrụ na m bụ ọka nwere ire ụtọ nʼịja ihe na-ezighị ezi mma, Onye kere m ga-ewepụ m nʼoge na-adịghị anya. Additional comments?
Refresh Captcha
The world's first Holy Bible un-translation!