< Job 32 >

1 Mgbe ahụ, ndị ikom atọ ndị a kwusịrị ịsa Job okwu ọbụla ọzọ nʼihi na ọ hụrụ onwe ya dịka onye ezi omume.
So these three men ceased to answer Job, because he was righteous in his own eyes.
2 Ma oke iwe were Elihu nwa Barakel onye obodo Buz, si nʼikwu Ram megide Job nʼihi na ọ gụrụ onwe ya dịka onye ezi omume karịa Chineke.
Then was kindled the wrath of Elihu the son of Barachel the Buzite, of the kindred of Ram: against Job was his wrath kindled, because he justified himself rather than God.
3 Iwe wekwara ya nʼebe mmadụ atọ ndị enyi Job nọ, nʼihi na ọ dịghị ebe ha hụtara Job dịka onye ụzọ ya na-ezighị ezi, ma ha gara nʼihu ịma ya ikpe.
Also against his three friends was his wrath kindled, because they had found no answer, and yet had condemned Job.
4 Ma ruo ugbu a, Elihu agwaghị Job okwu ọbụla nʼihi na ndị ọzọ bụ okenye nʼebe ọ nọ.
Now Elihu had waited till Job had spoken, because they were elder than he.
5 Ma mgbe ọ hụrụ na ndị ikom atọ ndị a enweghị okwu ọzọ ha ga-ekwu, nke a kpasuru ya iwe.
When Elihu saw that there was no answer in the mouth of these three men, then his wrath was kindled.
6 Ma Elihu nwa Barakel onye obodo Buz zara sị: “Abụ m nwantakịrị nʼọnụọgụgụ afọ m gbara, ma unu bụ ndị okenye; ọ bụ nke a mere m ji gbaa nkịtị nʼụjọ, hapụ ịgwa unu ihe m maara.
And Elihu the son of Barachel the Buzite answered and said, I am young, and you are very old; why I was afraid, and dared not show you my opinion.
7 Echere m nʼobi m sị, ‘Ọnụọgụgụ afọ ga-ekwu okwu; ọtụtụ afọ ka ọ dịkwara ikuzi amamihe.’
I said, Days should speak, and multitude of years should teach wisdom.
8 Ma ọ bụ mmụọ dị nʼime mmadụ, nkuume nke Onye pụrụ ime ihe niile na-enye nghọta.
But there is a spirit in man: and the inspiration of the Almighty gives them understanding.
9 Ọ bụghị naanị ndị okenye bụ ndị mara ihe, ọ bụkwaghị naanị ndị gbara ọtụtụ afọ bụ ndị na-aghọta ihe ziri ezi.
Great men are not always wise: neither do the aged understand judgment.
10 “Ya mere m na-asị, Geenụ m ntị; mụ onwe m ga-agwa unu ihe m ma.
Therefore I said, Listen to me; I also will show my opinion.
11 Echeere m oge niile unu na-ekwu okwu, egere m ntị na ntụgharị uche unu, oge niile unu na-achọpụta okwu unu ga-ekwu.
Behold, I waited for your words; I gave ear to your reasons, whilst you searched out what to say.
12 Egere m nnọọ unu ntị, ma ọ dịghị onye nʼime unu nwerela ike gosi Job ụzọ o si jehie; ọ dịghị onye nʼime unu zaghachiri ịrụ ụka ya.
Yes, I attended to you, and, behold, there was none of you that convinced Job, or that answered his words:
13 Unu ekwula sị, ‘Anyị achọtala amamihe; ka Chineke na-abụghị mmadụ gosi ya mmehie ya.’
Lest you should say, We have found out wisdom: God thrusts him down, not man.
14 Ma Job edozighị okwu ya nʼusoro megide m, ya mere agaghị m eji ịrụ ụka unu zaghachi ya.
Now he has not directed his words against me: neither will I answer him with your speeches.
15 “Ha adaala mba na-enweghị ihe ọzọ ha ga-ekwu; ike okwu agwụla ha.
They were amazed, they answered no more: they left off speaking.
16 M ga-echere, ugbu a ha deere duu, ugbu a ha guzo ebe ahụ na-enweghị ọsịsa?
When I had waited, (for they spoke not, but stood still, and answered no more; )
17 Mụ onwe m ga-ekwu uche m; ihe m maara ka mụ onwe m ga-ekwu,
I said, I will answer also my part, I also will show my opinion.
18 nʼihi na okwu juru m ọnụ, ọ bụkwa mmụọ dị nʼime m na-akwagide m.
For I am full of matter, the spirit within me constrains me.
19 Nʼime m, adị m ka mmanya na-agbọ ụfụfụ a kwuchiri na karama, dịka karama akpụkpọ ọhụrụ dị njikere ịgbawa.
Behold, my belly is as wine which has no vent; it is ready to burst like new bottles.
20 Aga m ekwurịrị okwu ka m sị nʼụzọ dị otu a chọta izuike; aga m emeghe egbugbere ọnụ m ma zaghachi.
I will speak, that I may be refreshed: I will open my lips and answer.
21 Agaghị m ekpe mmadụ ọbụla ikpe mmegide maọbụ jaa mmadụ ọbụla mma nʼụzọ na-ezighị ezi.
Let me not, I pray you, accept any man’s person, neither let me give flattering titles to man.
22 Nʼihi na ọ bụrụ na m bụ ọka nwere ire ụtọ nʼịja ihe na-ezighị ezi mma, Onye kere m ga-ewepụ m nʼoge na-adịghị anya.
For I know not to give flattering titles; in so doing my maker would soon take me away.

< Job 32 >