< Job 31 >

1 “Mụ na anya m gbara ndụ kpebie na o nweghị mgbe m ga-ele nwaagbọghọ ọbụla anya nʼihi agụụ ịkwa iko.
“Ngasenza isivumelwano lamehlo ami ukuthi angakhangeli intombi ayihawukele.
2 Nʼihi na, gịnị bụ oke mmadụ ketara nʼaka Chineke onye bi nʼelu; gịnị bụkwa ihe nketa ya site nʼaka Onye pụrụ ime ihe niile nọ nʼelu?
Siyini isabelo somuntu asabelwe nguNkulunkulu ophezulu na, ilifa lakhe elivela kuSomandla phezulu?
3 Ọ bụghị mbibi nye ndị ajọ omume, nhụju anya nye ndị na-eme ihe ọjọọ?
Akusikubhujiswa kwababi lokutshabalaliswa kwalabo abenza okubi na?
4 Ọ bụ na ọ naghị ahụ ụzọ m niile, gụọkwa nzọ ukwu m niile ọnụ?
Kanti kaziboni yini izindlela zami abale zonke izinyathelo zami?
5 “Ọ bụrụ na m gara ije nʼụzọ ụgha maọbụ na ụkwụ m mere ngwangwa gbasoro ụzọ aghụghọ,
Nxa ngike ngahamba ngokwamanga loba unyawo lwami lwakhuthalela inkohliso
6 ka Chineke were ihe ọtụtụ ziri ezi tụọ m, ọ ga-amata na m bụ onye na-enweghị ịta ụta.
uNkulunkulu akangikale esikalini sakhe esiqotho ukuze abone ukuthi angilasici,
7 Ọ bụrụ na nzọ ụkwụ m si nʼụzọ wezuga onwe ya, ọ bụrụ anya m na-edu obi m, ma ọ bụkwanụ na aka m abụọ bụ ihe e merụrụ emerụ,
nxa izinyathelo zami zike zaphambuka endleleni, nxa inhliziyo yami ikhokhelwe ngamehlo ami, noma kumbe izandla zami zike zangcoliswa,
8 ọ bụrụ otu a, ka onye ọzọ rie ihe m kụrụ nʼubi, ka e hopuchakwa ihe niile m kụrụ nʼubi.
lapho-ke abanye kabazidlele lokho engikuhlanyeleyo, njalo amabele ami kawasitshunwe.
9 “Ọ bụrụ na ọ gụọla obi m agụụ ijekwuru nwanyị ọzọ, maọbụ na m ezoola nʼọnụ ụzọ onye agbataobi m,
Nxa inhliziyo yami ike yakhangwa ngowesifazane, kumbe nxa ngike ngacathama ngasemnyango kamakhelwane,
10 mgbe ahụ, ka nwunye m kwọọrọ nwoke ọzọ nri, ka ndị ikom ọzọ dinaa ya.
lapho-ke owami umfazi kacholele enye indoda, njalo amanye amadoda kawalale laye.
11 Nʼihi na nke ahụ ga-abụ ihe ihere, bụrụkwa mmehie kwesiri ka e kpee ya ikpe.
Ngoba lokho bekuzakuba lihlazo, isono esifanele ukwahlulelwa.
12 Ọ bụ ọkụ na-ere ruo nʼebe ịla nʼiyi; nke pụrụ ihopu ihe owuwe ubi m niile.
Kungumlilo otshisayo onguMaqothula; ngabe kwasiphuna isivuno sami.
13 “Ọ bụrụ na m jụrụ ikpe ikpe ziri ezi nye nwoke maọbụ nwanyị ọbụla na-ejere m ozi mgbe ha nwere mkpesa megide m,
Nxa ngingaphathanga kuhle izisebenzi zami, esesilisa lesesifazane nxa kukhona abakusolayo kimi,
14 gịnị ka m ga-eme mgbe Chineke bịakwutere m? Gịnị ka m ga-aza ya mgbe ọ jụrụ m ajụjụ?
ngizakuthini lapho uNkulunkulu esengibuza ngakho na? Ngizaphendula ngithini nxa sekumele ngichaze na?
15 Ọ bụ na ọ bụghị onye kpụrụ m nʼafọ nne m mekwara ha? Ọ bụghị ya kpụrụ anyị abụọ nʼafọ nne anyị?
Yena lowo owangenzayo esibelethweni kabenzanga labo na? Kasuye yini yena kanye owasenzayo sonke phakathi kwezisu zabomama na?
16 “Ọ bụrụ na m ajụ inye ndị ogbenye ihe dị ha mkpa, ma ọ bụrụkwa na m eme ka anya nwanyị di ya nwụrụ dalaa ya nʼisi,
Nxa ngilahlele eceleni izifiso zabayanga loba ngayekela amehlo omfelokazi edinwa yizinyembezi,
17 ọ bụrụ na m dobere ihe oriri m maka naanị m, ma jụ inye ya ụmụ mgbei;
nxa ngizidlele ngedwa isinkwa sami, ngingasabelani lezintandane,
18 ma site nʼokorobịa m, azụlitere m ha dịka nna kwesiri, ọ bụkwa site na nwantakịrị ka m bụ onyendu nye nwanyị di ya nwụrụ.
kodwa ebutsheni bami ngabondla njengaboyise, njalo kusukela ekuzalweni kwami ngamkhokhela umfelokazi,
19 Ọ bụrụ na ọ dị mgbe m hụrụ onye na-ala nʼiyi nʼihi enweghị akwa, maọbụ onye nọ nʼụkọ nke na-enweghị uwe,
nxa ngike ngabona umuntu esifa ngokuswela izigqoko, loba umuntu oswelayo engelasivunulo,
20 ma obi ha agọzighị m nʼihi iji ajị sitere nʼụmụ atụrụ m mee ka o nwee okpomọkụ nʼahụ ya.
njalo inhliziyo yakhe ayingibusisanga ngokumfudumeza ngoboya bezimvu zami,
21 Ọ bụrụ na m eweliela aka m megide onye nna ya nwụrụ, nʼihi na m mara na m nwere nkwuwa okwu nʼụlọikpe,
nxa ngike ngaphakamisa isandla sami phezu kwentandane, kodwa mina ngikwazi ukuthi bayangilalela emthethwandaba,
22 mgbe ahụ, ka aka m si nʼubu m dapụ, ka e tijiekwa ogwe aka m site na nkwonkwo ya.
nxa kunjalo kayikhumuke ingalo yami kusukela ehlombe, kayephulwe endololwaneni.
23 Nʼihi na atụrụ m egwu mbibi na-esite nʼaka Chineke, nʼihi egwu ebube ya, enweghị m ike ime ihe ndị a.
Ngoba ngesaba ukubhubhisa kukaNkulunkulu, kwathi ngokwesaba inkazimulo yakhe, ngayekela ukwenza izinto ezinjalo.
24 “Ọ bụrụ na ntụkwasị obi m dị nʼọlaedo, maọbụ na m sị ọlaedo a nụchara anụcha, ‘Ị bụ ebe ndabere m.’
Nxa ngifake ithemba lami phezu kwegolide, loba ngathi kulo igolide elicolekileyo, ‘Ulithemba lami,’
25 Ọ bụrụ na m ṅụrịrị ọṅụ nʼihi oke akụ m, ihe nnweta nke aka m ritere nʼuru,
nxa bengithokoziswa yinotho yami enengi, lenzuzo evele ngezandla zami,
26 ọ bụrụ na m legidere anyanwụ anya nʼebube ya, maọbụ ọnwa nʼike nchawa ya,
nxa ngilikhangele ilanga libenyezela loba inyanga ihamba ngenkazimulo,
27 nke ga-eme ka obi m bụrụ ihe a rafuru na nzuzo, maọbụ aka m abụrụ ihe e weliri ife ha ofufe,
yaze yayengeka inhliziyo yami ngaphakathi nganga isandla sami ukuzikhonza,
28 mgbe ahụ, ihe ndị a ga-abụ mmehie nke a ga-ekpe ikpe, nʼihi na m gaara abụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nye Chineke, Onye bi nʼelu.
lezi lazo yizono ebezifanele ukwahlulelwa, ngoba bengizabe ngingathembekanga kuNkulunkulu ophezulu.
29 “Ọ bụrụ na m ṅụrịrị ọṅụ nʼihi ọdachi nke dakwasịrị onye iro m maọbụ chịa ọchị nʼihi nsogbu nke dakwasịrị ya,
Nxa ngike ngathokoza ngomnyama owehlele isitha sami kumbe ngagqabhaza ngohlupho olumehleleyo,
30 ekwebeghị m ka ọnụ m mehie megide ha site nʼịbụ ndụ ha ọnụ.
kangivumelanga umlomo wami ukuba wenze isono ngokuqalekisa ukuphila kwakhe,
31 Ọ bụrụ na o nwebeghị oge ndị nọ nʼezinaụlọ m kwuru okwu sị. ‘Onye ka ọ bụ nke na-erijubeghị afọ site nʼihe oriri Job na-enye?’
nxa abantu bendlu yami bengakaze bathi, ‘Ngubani ongazange azitike ngenyama kaJobe na?’
32 Ma ọ dịghị onye ọbịa na-anọ ọnọdụ abalị nʼama, nʼihi ụzọ m na-eghe oghe mgbe ọbụla nye ndị ije.
kodwa kakulasihambi esake salala emgwaqweni, ngoba umnyango wami wawuhlala uvulelwe izihambi
33 Ọ bụrụ na m na-ezo mmehie m dịka ndị ọzọ, site nʼizobe mmehie m nʼime obi m,
nxa ngisithukuzile isono sami njengokwenziwa ngabantu, ngokufihla umlandu wami enhliziyweni yami
34 nʼihi na m tụrụ egwu igwe mmadụ, si otu a, tụọ oke egwu nʼihi nleda anya nke ndị agbụrụ dị iche iche, nke mere ka m gbaa nkịtị ghara ịpụ nʼezi.
ngoba ngisesaba abantu ngithuthunyeliswa yikweyiswa ngabosendo ngazithulela ngaze ngala lokuphumela phandle.
35 (“O, a sị na o nwere onye ga-ege m ntị! Ana m ebinye aka m nʼokwu ngọpụ m, ka Onye pụrụ ime ihe niile za m, ka onye na-ebo m ebubo depụta ihe o nwere megide m nʼakwụkwọ.
(Oh, kube ukhona ongizwayo! Sengisayina incwadi yokuzivikela kwami, uSomandla kangiphendule; ongimangalelayo kabhale phansi icala angethesa lona.
36 Nʼezie, aga m eyiri ya nʼubu m, aga m eyinyekwa ya dịka okpueze.
Leyoncwadi ngingayithwala ehlombe lami, ngingayithwala ekhanda njengomqhele.
37 Aga m agụkọrọ ya nzọ ụkwụ m niile, aga m ejekwuru ya dịka ọkpara eze.)
Bengingamchazela ngokugcweleyo ngazozonke izinyathelo zami; ngisondele kuye njengenkosana.)
38 “Ọ bụrụ na ala m etie mkpu megide m, ọ bụrụ na olulu dị na ya ejupụta nʼanya mmiri,
Nxa ilizwe lakithi lingiphika lemifolo yalo imanzi ngezinyembezi,
39 ọ bụrụ na m eripịa ihe o mepụtara na-akwụghị ụgwọ, maọbụ mee ka mmụọ ndị bi nʼime ya daa mba,
nxa ngike ngadla izithelo zalo angaze ngabhadala loba ngephula imimoya yabanikazi,
40 ka ogwu pupụta nʼọnọdụ ọka wiiti, ka ahịhịa na-esi isi ọjọọ pupụtakwa nʼọnọdụ ọka balị.” Okwu Job agwụla.
nxa kunjalo kakumile ameva esikhundleni sengqoloyi, lokhula esikhundleni sebhali.” Aphela lapha amazwi kaJobe.

< Job 31 >