Preface
Read
+
Publisher
Nainoia, Inc.
PO Box 462, Bellefonte, PA 16823
(814) 470-8028
Nainoia Inc, Publisher
LinkedIn/NAINOIA-INC
Third Party Publisher Resources
Request Custom Formatted Verses
Please contact us below
Submit your proposed corrections
I understand that the Aionian Bible republishes public domain and Creative Commons Bible texts and that volunteers may be needed to present the original text accurately. I also understand that apocryphal text is removed and most variant verse numbering is mapped to the English standard. I have entered my corrections under the verse(s) below. Proposed corrections to the The Igbo Holy Bible for Everyone, Job Chapter 31 https://www.AionianBible.org/Bibles/Igbo---Igbo-Bible/Job/31 1) “Mụ na anya m gbara ndụ kpebie na o nweghị mgbe m ga-ele nwaagbọghọ ọbụla anya nʼihi agụụ ịkwa iko. 2) Nʼihi na, gịnị bụ oke mmadụ ketara nʼaka Chineke onye bi nʼelu; gịnị bụkwa ihe nketa ya site nʼaka Onye pụrụ ime ihe niile nọ nʼelu? 3) Ọ bụghị mbibi nye ndị ajọ omume, nhụju anya nye ndị na-eme ihe ọjọọ? 4) Ọ bụ na ọ naghị ahụ ụzọ m niile, gụọkwa nzọ ukwu m niile ọnụ? 5) “Ọ bụrụ na m gara ije nʼụzọ ụgha maọbụ na ụkwụ m mere ngwangwa gbasoro ụzọ aghụghọ, 6) ka Chineke were ihe ọtụtụ ziri ezi tụọ m, ọ ga-amata na m bụ onye na-enweghị ịta ụta. 7) Ọ bụrụ na nzọ ụkwụ m si nʼụzọ wezuga onwe ya, ọ bụrụ anya m na-edu obi m, ma ọ bụkwanụ na aka m abụọ bụ ihe e merụrụ emerụ, 8) ọ bụrụ otu a, ka onye ọzọ rie ihe m kụrụ nʼubi, ka e hopuchakwa ihe niile m kụrụ nʼubi. 9) “Ọ bụrụ na ọ gụọla obi m agụụ ijekwuru nwanyị ọzọ, maọbụ na m ezoola nʼọnụ ụzọ onye agbataobi m, 10) mgbe ahụ, ka nwunye m kwọọrọ nwoke ọzọ nri, ka ndị ikom ọzọ dinaa ya. 11) Nʼihi na nke ahụ ga-abụ ihe ihere, bụrụkwa mmehie kwesiri ka e kpee ya ikpe. 12) Ọ bụ ọkụ na-ere ruo nʼebe ịla nʼiyi; nke pụrụ ihopu ihe owuwe ubi m niile. 13) “Ọ bụrụ na m jụrụ ikpe ikpe ziri ezi nye nwoke maọbụ nwanyị ọbụla na-ejere m ozi mgbe ha nwere mkpesa megide m, 14) gịnị ka m ga-eme mgbe Chineke bịakwutere m? Gịnị ka m ga-aza ya mgbe ọ jụrụ m ajụjụ? 15) Ọ bụ na ọ bụghị onye kpụrụ m nʼafọ nne m mekwara ha? Ọ bụghị ya kpụrụ anyị abụọ nʼafọ nne anyị? 16) “Ọ bụrụ na m ajụ inye ndị ogbenye ihe dị ha mkpa, ma ọ bụrụkwa na m eme ka anya nwanyị di ya nwụrụ dalaa ya nʼisi, 17) ọ bụrụ na m dobere ihe oriri m maka naanị m, ma jụ inye ya ụmụ mgbei; 18) ma site nʼokorobịa m, azụlitere m ha dịka nna kwesiri, ọ bụkwa site na nwantakịrị ka m bụ onyendu nye nwanyị di ya nwụrụ. 19) Ọ bụrụ na ọ dị mgbe m hụrụ onye na-ala nʼiyi nʼihi enweghị akwa, maọbụ onye nọ nʼụkọ nke na-enweghị uwe, 20) ma obi ha agọzighị m nʼihi iji ajị sitere nʼụmụ atụrụ m mee ka o nwee okpomọkụ nʼahụ ya. 21) Ọ bụrụ na m eweliela aka m megide onye nna ya nwụrụ, nʼihi na m mara na m nwere nkwuwa okwu nʼụlọikpe, 22) mgbe ahụ, ka aka m si nʼubu m dapụ, ka e tijiekwa ogwe aka m site na nkwonkwo ya. 23) Nʼihi na atụrụ m egwu mbibi na-esite nʼaka Chineke, nʼihi egwu ebube ya, enweghị m ike ime ihe ndị a. 24) “Ọ bụrụ na ntụkwasị obi m dị nʼọlaedo, maọbụ na m sị ọlaedo a nụchara anụcha, ‘Ị bụ ebe ndabere m.’ 25) Ọ bụrụ na m ṅụrịrị ọṅụ nʼihi oke akụ m, ihe nnweta nke aka m ritere nʼuru, 26) ọ bụrụ na m legidere anyanwụ anya nʼebube ya, maọbụ ọnwa nʼike nchawa ya, 27) nke ga-eme ka obi m bụrụ ihe a rafuru na nzuzo, maọbụ aka m abụrụ ihe e weliri ife ha ofufe, 28) mgbe ahụ, ihe ndị a ga-abụ mmehie nke a ga-ekpe ikpe, nʼihi na m gaara abụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nye Chineke, Onye bi nʼelu. 29) “Ọ bụrụ na m ṅụrịrị ọṅụ nʼihi ọdachi nke dakwasịrị onye iro m maọbụ chịa ọchị nʼihi nsogbu nke dakwasịrị ya, 30) ekwebeghị m ka ọnụ m mehie megide ha site nʼịbụ ndụ ha ọnụ. 31) Ọ bụrụ na o nwebeghị oge ndị nọ nʼezinaụlọ m kwuru okwu sị. ‘Onye ka ọ bụ nke na-erijubeghị afọ site nʼihe oriri Job na-enye?’ 32) Ma ọ dịghị onye ọbịa na-anọ ọnọdụ abalị nʼama, nʼihi ụzọ m na-eghe oghe mgbe ọbụla nye ndị ije. 33) Ọ bụrụ na m na-ezo mmehie m dịka ndị ọzọ, site nʼizobe mmehie m nʼime obi m, 34) nʼihi na m tụrụ egwu igwe mmadụ, si otu a, tụọ oke egwu nʼihi nleda anya nke ndị agbụrụ dị iche iche, nke mere ka m gbaa nkịtị ghara ịpụ nʼezi. 35) (“O, a sị na o nwere onye ga-ege m ntị! Ana m ebinye aka m nʼokwu ngọpụ m, ka Onye pụrụ ime ihe niile za m, ka onye na-ebo m ebubo depụta ihe o nwere megide m nʼakwụkwọ. 36) Nʼezie, aga m eyiri ya nʼubu m, aga m eyinyekwa ya dịka okpueze. 37) Aga m agụkọrọ ya nzọ ụkwụ m niile, aga m ejekwuru ya dịka ọkpara eze.) 38) “Ọ bụrụ na ala m etie mkpu megide m, ọ bụrụ na olulu dị na ya ejupụta nʼanya mmiri, 39) ọ bụrụ na m eripịa ihe o mepụtara na-akwụghị ụgwọ, maọbụ mee ka mmụọ ndị bi nʼime ya daa mba, 40) ka ogwu pupụta nʼọnọdụ ọka wiiti, ka ahịhịa na-esi isi ọjọọ pupụtakwa nʼọnọdụ ọka balị.” Okwu Job agwụla. Additional comments?
Refresh Captcha
The world's first Holy Bible un-translation!