< Job 27 >

1 Ma Job gakwara nʼihu nʼokwu ya sị:
約伯繼續他的言論說:
2 “Nʼezie, dịka Chineke na-adị ndụ, onye jụrụ ikpere m ikpe ziri ezi, Onye pụrụ ime ihe niile, onye mere ka m hụ ihe ilu nke mkpụrụobi.
我指著那剝奪我權利的天主起誓,指著使我心靈苦痛的全能者起誓:
3 Ogologo mgbe m nwere ndụ nʼime m, mgbe iku ume Chineke dịkwa nʼimi m,
幾時我還有氣息,我鼻中尚有天主賦予的生氣,
4 egbugbere ọnụ m agaghị ekwu ihe ọjọọ, ire m agakwaghị ekwu okwu aghụghọ.
我的口唇決不說謊言,我的舌頭決不講虛話。
5 Agaghị m ekwenye na ihe unu kwuru ziri ezi; ruo mgbe m ga-anwụ, agaghị m agọnarị izuoke m.
若叫我說你們有理,那決辨不到;到我斷氣,我決不放棄我的純正。
6 Aga m ejigidesi ezi omume m aka ike, agaghị m ahapụ ya; o nwekwaghị mgbe obi m ga-ata m ụta ogologo ụbọchị niile nke ndụ m.
我堅持我的正義,決不罷休;對於已往的生活,我問心無愧。
7 “Ka ndị iro m dịrị ka ndị ajọ omume, ka ndị na-ebili imegide m dịrị ka ndị na-emebi iwu.
惟願恨我的人,遭惡人的命運;起來攻擊我的人,遭罪犯的處分。
8 Nʼihi nke a, gịnị bụ olileanya onye na-amaghị Chineke nwere mgbe e bipụrụ ya, mgbe Chineke wepụrụ ndụ ya?
惡人呼籲時,有何期待﹖當他向天主舉起靈魂時,有何希望﹖
9 Chineke ọ na-anụ ịkwa akwa ya mgbe nsogbu dakwasịrị ya?
災難臨到他身上時,天主豈能聽他的呼求﹖
10 Ọ ga-achọta ihe ụtọ nʼime Onye pụrụ ime ihe niile? Ọ ga-akpọku Chineke mgbe niile?
他豈是以全能者為喜樂,時時祈求天主﹖
11 “Aga m akụziri unu maka ike nke Chineke; agaghị m ezo ihe banyere ụzọ Onye pụrụ ime ihe niile.
我要將天主的作為教導你們;對全能者的意旨,我決不隱瞞。
12 Unu onwe unu ahụla ihe ndị a, gịnị mere unu ji ekwu okwu ndị a na-enweghị isi?
其實,這一切你們都熟悉,但為何還這樣空談﹖
13 “Nke a bụ oke Chineke na-ekenye ndị ajọ omume, nke a bụkwa ihe nketa nke onye ahụ na-adịghị eme ebere na-anata site nʼaka Onye pụrụ ime ihe niile.
納阿瑪人左法爾就說:這是天主給惡人定的命運,是強暴者由全能者所承受的產業:
14 Nʼagbanyeghị ọnụọgụgụ ụmụ ya, oke ha bụ mma agha; ụmụ ya agaghị enwe ihe oriri ga-ezuru ha.
他的子女雖眾多,都必死於刀下;他的後代子孫,不得飽食。
15 Ọrịa na-efe efe ga-egbu ndị ya fọrọ ndụ; ọzọ, ụmụ nwanyị ha hapụrụ nwụọ agaghị akwa akwa nʼihi ha.
剩餘的人,為瘟疫所葬送;他們的遺孀,不舉喪哀弔。
16 Ọ bụrụ na ọ kpakọta ọlaọcha dịka uzuzu, ma tụkọtakwa uwe dịka aja ụrọ,
他們雖積蓄銀子,多如塵沙;備製衣服,多如土堆;
17 ihe ndị ọ kpakọtara bụ onye ezi omume ga-eyi ha, ndị aka ha dị ọcha ga-ekekwa ọlaọcha ya.
他們固然預備,但義人來穿,無辜者要分取他們的金銀。
18 Ụlọ o wuru dị ka ụlọ nla, dịkwa ka ụlọ ntu nke onye nche wuru.
他們建造的房屋有如蛛網,又如守望者搭的茅舍。
19 Ọ na-edina ala dịka ọgaranya ma ọ gaghị edinakwa dịka ọgaranya ọzọ; mgbe ọ saghere anya ya abụọ, ihe niile efuola.
他們睡眠時,雖稱富足,但睜開眼時,已一無所有。
20 Oke egwu na-adakwasị ya dịka idee mmiri; oke ebili mmiri na-ebufu ya nʼabalị.
白天有恐怖侵襲,黑夜有颶風將他們颳去。
21 Ifufe si nʼọwụwa anyanwụ na-ebufu ya, agaghị ahụkwa ya anya ọzọ; ọ na-azachapụ ya site nʼọnọdụ ya.
東風將他們吹去,把他們捲走,離其居地。
22 Ọ na-atụfu ya na-enweghị ebere mgbe ọ na-eme ngwangwa ịgbapụ site nʼike ya.
他們成了眾人毫不憐憫的箭靶,他們沒法逃避恐嚇的手。
23 Ọ na-akụkọta aka ya nʼịkwa emo, were ịma ọsụ wezuga ya nʼọnọdụ ya.”
人人都對之鼓掌稱慶,由各方向之嘲笑辱罵。

< Job 27 >