Preface
Read
+
Publisher
Nainoia, Inc.
PO Box 462, Bellefonte, PA 16823
(814) 470-8028
Nainoia Inc, Publisher
LinkedIn/NAINOIA-INC
Third Party Publisher Resources
Request Custom Formatted Verses
Please contact us below
Submit your proposed corrections
I understand that the Aionian Bible republishes public domain and Creative Commons Bible texts and that volunteers may be needed to present the original text accurately. I also understand that apocryphal text is removed and most variant verse numbering is mapped to the English standard. I have entered my corrections under the verse(s) below. Proposed corrections to the The Igbo Holy Bible for Everyone, Job Chapter 27 https://www.AionianBible.org/Bibles/Igbo---Igbo-Bible/Job/27 1) Ma Job gakwara nʼihu nʼokwu ya sị: 2) “Nʼezie, dịka Chineke na-adị ndụ, onye jụrụ ikpere m ikpe ziri ezi, Onye pụrụ ime ihe niile, onye mere ka m hụ ihe ilu nke mkpụrụobi. 3) Ogologo mgbe m nwere ndụ nʼime m, mgbe iku ume Chineke dịkwa nʼimi m, 4) egbugbere ọnụ m agaghị ekwu ihe ọjọọ, ire m agakwaghị ekwu okwu aghụghọ. 5) Agaghị m ekwenye na ihe unu kwuru ziri ezi; ruo mgbe m ga-anwụ, agaghị m agọnarị izuoke m. 6) Aga m ejigidesi ezi omume m aka ike, agaghị m ahapụ ya; o nwekwaghị mgbe obi m ga-ata m ụta ogologo ụbọchị niile nke ndụ m. 7) “Ka ndị iro m dịrị ka ndị ajọ omume, ka ndị na-ebili imegide m dịrị ka ndị na-emebi iwu. 8) Nʼihi nke a, gịnị bụ olileanya onye na-amaghị Chineke nwere mgbe e bipụrụ ya, mgbe Chineke wepụrụ ndụ ya? 9) Chineke ọ na-anụ ịkwa akwa ya mgbe nsogbu dakwasịrị ya? 10) Ọ ga-achọta ihe ụtọ nʼime Onye pụrụ ime ihe niile? Ọ ga-akpọku Chineke mgbe niile? 11) “Aga m akụziri unu maka ike nke Chineke; agaghị m ezo ihe banyere ụzọ Onye pụrụ ime ihe niile. 12) Unu onwe unu ahụla ihe ndị a, gịnị mere unu ji ekwu okwu ndị a na-enweghị isi? 13) “Nke a bụ oke Chineke na-ekenye ndị ajọ omume, nke a bụkwa ihe nketa nke onye ahụ na-adịghị eme ebere na-anata site nʼaka Onye pụrụ ime ihe niile. 14) Nʼagbanyeghị ọnụọgụgụ ụmụ ya, oke ha bụ mma agha; ụmụ ya agaghị enwe ihe oriri ga-ezuru ha. 15) Ọrịa na-efe efe ga-egbu ndị ya fọrọ ndụ; ọzọ, ụmụ nwanyị ha hapụrụ nwụọ agaghị akwa akwa nʼihi ha. 16) Ọ bụrụ na ọ kpakọta ọlaọcha dịka uzuzu, ma tụkọtakwa uwe dịka aja ụrọ, 17) ihe ndị ọ kpakọtara bụ onye ezi omume ga-eyi ha, ndị aka ha dị ọcha ga-ekekwa ọlaọcha ya. 18) Ụlọ o wuru dị ka ụlọ nla, dịkwa ka ụlọ ntu nke onye nche wuru. 19) Ọ na-edina ala dịka ọgaranya ma ọ gaghị edinakwa dịka ọgaranya ọzọ; mgbe ọ saghere anya ya abụọ, ihe niile efuola. 20) Oke egwu na-adakwasị ya dịka idee mmiri; oke ebili mmiri na-ebufu ya nʼabalị. 21) Ifufe si nʼọwụwa anyanwụ na-ebufu ya, agaghị ahụkwa ya anya ọzọ; ọ na-azachapụ ya site nʼọnọdụ ya. 22) Ọ na-atụfu ya na-enweghị ebere mgbe ọ na-eme ngwangwa ịgbapụ site nʼike ya. 23) Ọ na-akụkọta aka ya nʼịkwa emo, were ịma ọsụ wezuga ya nʼọnọdụ ya.” Additional comments?
Refresh Captcha
The world's first Holy Bible un-translation!