< Aịzaya 54 >

1 “Bụọ abụ, gị nwanyị aga, gị onye na-amụtaghị nwa; tie mkpu ọṅụ, tiwakwaa olu abụ, gị onye ime nwa na-emetụbeghị; nʼihi na ụmụ nwanyị ahụ a hapụrụ naanị ya ga-adị ọtụtụ karịa ụmụ nke nwanyị nwere di,” Otu a ka Onyenwe anyị kwuru.
Sing, O barren, thou that didst not bear; break forth into singing, and cry aloud, thou that didst not travail with child: for more are the children of the desolate than the children of the married wife, saith the LORD.
2 “Mee ka ebe ụlọ ikwu gị saa mbara, gbasapụ akwa mgbochi ụlọ ikwu gị, egbochila gbasapụ aka; mee ka ụdọ gị dị ogologo, meekwa ka o sie ike nke ọma.
Enlarge the place of thy tent, and let them stretch forth the curtains of thine habitations; spare not: lengthen thy cords, and strengthen thy stakes.
3 Nʼihi na nʼaka nri na nʼaka ekpe ka ị ga-agbasa gaa; ụmụ gị ga-achụpụ mba dị iche iche site nʼala ha, bichikwaa nʼobodo ha niile dakpọsịrị adakpọsị, nke tọgbọrọ nʼefu.
For thou shalt spread abroad on the right hand and on the left; and thy seed shall possess the nations, and make the desolate cities to be inhabited.
4 “Atụla egwu, nʼihi na ihere agaghị emekwa gị ọzọ. Ị gaghị abụkwa onye e wedara nʼala. Ị gakwaghị echeta ihere mere gị mgbe ị bụ nwantakịrị, na ịta ụta dịrị gị nʼihi ọnwụ di gị.
Fear not; for thou shalt not be ashamed: neither be thou confounded; for thou shalt not be put to shame: for thou shalt forget the shame of thy youth, and the reproach of thy widowhood shalt thou remember no more.
5 Nʼihi na onye kere gị ga-abụrụ gị di. Aha ya bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile; Onye nsọ Izrel bụ Onye mgbapụta gị, Chineke nke ụwa niile ka a na-akpọ ya.
For thy Maker is thine husband; the LORD of hosts is his name: and the Holy One of Israel is thy redeemer; the God of the whole earth shall he be called.
6 Nʼihi na Onyenwe anyị ga-akpọghachi gị dịka a ga-asị na ị bụ nwunye a hapụrụ ahapụ, nke ọ na-ewutakwa nʼime mmụọ ya bụ nwunye alụtara na nwantakịrị, naanị ka ọ bụrụ onye ajụrụ ajụ,” ka Chineke gị na-ekwu.
For the LORD hath called thee as a wife forsaken and grieved in spirit, even a wife of youth, when she is cast off, saith thy God.
7 “Naanị nwa mgbe nta ka m hapụrụ gị. Ma aga m eji obi ebere ukwuu kpọghachikwa gị
For a small moment have I forsaken thee; but with great mercies will I gather thee.
8 Na nwa oge, esitere m nʼoke iwe na-ewe m zonarị gị ihu m, ma site nʼịhụnanya m nke na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi, aga m enwe ọmịiko nʼahụ gị.” Otu a ka Onyenwe anyị, onye mgbapụta gị kwuru.
In overflowing wrath I hid my face from thee for a moment; but with everlasting kindness will I have mercy on thee, saith the LORD thy redeemer.
9 “Dịka m si ṅụọ iyi nʼoge Noa sị na m agaghị ekwekwa ka mmiri kpuchie ụwa ọzọ, bibie ndụ ndị dị nʼime ya, ana m aṅụkwa iyi ugbu a na mụ agaghị ekwe ka iwe m bịakwasị gị ọzọ. Agakwaghị m abasiri gị mba ike.
For this is [as] the waters of Noah unto me: for as I have sworn that the waters of Noah should no more go over the earth, so have I sworn that I would not be wroth with thee, nor rebuke thee.
10 Nʼihi na a pụrụ iwezuga ugwu ukwu niile, wezugakwa ugwu nta niile site nʼọnọdụ ha, ma obi ebere m agaghị esi nʼebe ị nọ pụọ, agaghị ewezugakwa ọgbụgba ndụ nke udo m,” ka Onyenwe anyị, onye nwere ọmịiko nʼahụ gị, kwuru.
For the mountains shall depart, and the hills be removed; but my kindness shall not depart from thee, neither shall my covenant of peace be removed, saith the LORD that hath mercy on thee.
11 “Gị, onye a na-emekpa ahụ, onye oke ikuku ụwa a na-ebugharị, nke onye ọbụla na-adịghị akasị obi, lee, aga m e ji nkume tọkwọisi wugharịa gị, jirikwa nkume ọma safaia dị oke ọnụahịa tọọ ntọala gị niile.
O thou afflicted, tossed with tempest, and not comforted, behold, I will set thy stones in fair colours, and lay thy foundations with sapphires.
12 Aga m eji nkume rubi wugharịa akụkụ ụlọ gị niile, jiri nkume na-egbu nweghenweghe wuo ọnụ ụzọ ama gị niile. Aga m ejikwa nkume dị oke ọnụahịa wuo mgbidi obodo gị.
And I will make thy pinnacles of rubies, and thy gates of carbuncles, and all thy border of pleasant stones.
13 Ụmụ gị niile ga-abụ ndị Onyenwe anyị ga-akụziri ihe. Udo ha ga-adịkwa ukwu.
And all thy children shall be taught of the LORD; and great shall be the peace of thy children.
14 Nʼezi omume ka a ga-eme ka ị guzosie ike. Mmegbu ga-adịkwa anya site nʼebe ị nọ, nʼihi ya, ị gaghị atụ egwu ihe ọjọọ ọbụla. Ọ dịghị ihe egwu ga-abịaru gị nso, nʼihi na a ga-ewezuga ha site nʼebe ị nọ.
In righteousness shalt thou be established: thou shalt be far from oppression, for thou shalt not fear; and from terror, for it shall not come near thee.
15 Ọ bụrụ na onye ọbụla abịa ịlụso gị ọgụ, ọ siteghị nʼaka m; onye ọbụla nke na-alụso gị ọgụ ga-abụ onye e meriri emeri.
Behold, they may gather together, but not by me: whosoever shall gather together against thee shall fall because of thee.
16 “Lee, ọ bụ mụ onwe m kere ọkpụ ụzụ nke na-eji icheku afụ ọkụ o ji akpụ ihe agha nke mbibi. Ọ bụkwa m kere ndị agha ahụ mbibi bụ ọrụ ha.
Behold, I have created the smith that bloweth the fire of coals, and bringeth forth a weapon for his work; and I have created the waster to destroy.
17 Nʼụbọchị ahụ, ọ dịghị ihe agha a kpụrụ megide gị nke ga-adị ire. Ọzọ, ị ga-emeri ndị niile kpọrọ gị ikpe mmegide. Nʼihi na nke a bụ ihe nketa dịrị ndị ohu Onyenwe anyị. Mkpepụta ha na-esite na m.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
No weapon that is formed against thee shall prosper; and every tongue that shall rise against thee in judgment thou shalt condemn. This is the heritage of the servants of the LORD, and their righteousness which is of me, saith the LORD.

< Aịzaya 54 >

A Dove is Sent Forth from the Ark
A Dove is Sent Forth from the Ark