Preface
Read
+
Publisher
Nainoia, Inc.
PO Box 462, Bellefonte, PA 16823
(814) 470-8028
Nainoia Inc, Publisher
LinkedIn/NAINOIA-INC
Third Party Publisher Resources
Request Custom Formatted Verses
Please contact us below
Submit your proposed corrections
I understand that the Aionian Bible republishes public domain and Creative Commons Bible texts and that volunteers may be needed to present the original text accurately. I also understand that apocryphal text is removed and most variant verse numbering is mapped to the English standard. I have entered my corrections under the verse(s) below. Proposed corrections to the The Igbo Holy Bible for Everyone, Isaiah Chapter 54 https://www.AionianBible.org/Bibles/Igbo---Igbo-Bible/Isaiah/54 1) “Bụọ abụ, gị nwanyị aga, gị onye na-amụtaghị nwa; tie mkpu ọṅụ, tiwakwaa olu abụ, gị onye ime nwa na-emetụbeghị; nʼihi na ụmụ nwanyị ahụ a hapụrụ naanị ya ga-adị ọtụtụ karịa ụmụ nke nwanyị nwere di,” Otu a ka Onyenwe anyị kwuru. 2) “Mee ka ebe ụlọ ikwu gị saa mbara, gbasapụ akwa mgbochi ụlọ ikwu gị, egbochila gbasapụ aka; mee ka ụdọ gị dị ogologo, meekwa ka o sie ike nke ọma. 3) Nʼihi na nʼaka nri na nʼaka ekpe ka ị ga-agbasa gaa; ụmụ gị ga-achụpụ mba dị iche iche site nʼala ha, bichikwaa nʼobodo ha niile dakpọsịrị adakpọsị, nke tọgbọrọ nʼefu. 4) “Atụla egwu, nʼihi na ihere agaghị emekwa gị ọzọ. Ị gaghị abụkwa onye e wedara nʼala. Ị gakwaghị echeta ihere mere gị mgbe ị bụ nwantakịrị, na ịta ụta dịrị gị nʼihi ọnwụ di gị. 5) Nʼihi na onye kere gị ga-abụrụ gị di. Aha ya bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile; Onye nsọ Izrel bụ Onye mgbapụta gị, Chineke nke ụwa niile ka a na-akpọ ya. 6) Nʼihi na Onyenwe anyị ga-akpọghachi gị dịka a ga-asị na ị bụ nwunye a hapụrụ ahapụ, nke ọ na-ewutakwa nʼime mmụọ ya bụ nwunye alụtara na nwantakịrị, naanị ka ọ bụrụ onye ajụrụ ajụ,” ka Chineke gị na-ekwu. 7) “Naanị nwa mgbe nta ka m hapụrụ gị. Ma aga m eji obi ebere ukwuu kpọghachikwa gị 8) Na nwa oge, esitere m nʼoke iwe na-ewe m zonarị gị ihu m, ma site nʼịhụnanya m nke na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi, aga m enwe ọmịiko nʼahụ gị.” Otu a ka Onyenwe anyị, onye mgbapụta gị kwuru. 9) “Dịka m si ṅụọ iyi nʼoge Noa sị na m agaghị ekwekwa ka mmiri kpuchie ụwa ọzọ, bibie ndụ ndị dị nʼime ya, ana m aṅụkwa iyi ugbu a na mụ agaghị ekwe ka iwe m bịakwasị gị ọzọ. Agakwaghị m abasiri gị mba ike. 10) Nʼihi na a pụrụ iwezuga ugwu ukwu niile, wezugakwa ugwu nta niile site nʼọnọdụ ha, ma obi ebere m agaghị esi nʼebe ị nọ pụọ, agaghị ewezugakwa ọgbụgba ndụ nke udo m,” ka Onyenwe anyị, onye nwere ọmịiko nʼahụ gị, kwuru. 11) “Gị, onye a na-emekpa ahụ, onye oke ikuku ụwa a na-ebugharị, nke onye ọbụla na-adịghị akasị obi, lee, aga m e ji nkume tọkwọisi wugharịa gị, jirikwa nkume ọma safaia dị oke ọnụahịa tọọ ntọala gị niile. 12) Aga m eji nkume rubi wugharịa akụkụ ụlọ gị niile, jiri nkume na-egbu nweghenweghe wuo ọnụ ụzọ ama gị niile. Aga m ejikwa nkume dị oke ọnụahịa wuo mgbidi obodo gị. 13) Ụmụ gị niile ga-abụ ndị Onyenwe anyị ga-akụziri ihe. Udo ha ga-adịkwa ukwu. 14) Nʼezi omume ka a ga-eme ka ị guzosie ike. Mmegbu ga-adịkwa anya site nʼebe ị nọ, nʼihi ya, ị gaghị atụ egwu ihe ọjọọ ọbụla. Ọ dịghị ihe egwu ga-abịaru gị nso, nʼihi na a ga-ewezuga ha site nʼebe ị nọ. 15) Ọ bụrụ na onye ọbụla abịa ịlụso gị ọgụ, ọ siteghị nʼaka m; onye ọbụla nke na-alụso gị ọgụ ga-abụ onye e meriri emeri. 16) “Lee, ọ bụ mụ onwe m kere ọkpụ ụzụ nke na-eji icheku afụ ọkụ o ji akpụ ihe agha nke mbibi. Ọ bụkwa m kere ndị agha ahụ mbibi bụ ọrụ ha. 17) Nʼụbọchị ahụ, ọ dịghị ihe agha a kpụrụ megide gị nke ga-adị ire. Ọzọ, ị ga-emeri ndị niile kpọrọ gị ikpe mmegide. Nʼihi na nke a bụ ihe nketa dịrị ndị ohu Onyenwe anyị. Mkpepụta ha na-esite na m.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. Additional comments?
Refresh Captcha
The world's first Holy Bible un-translation!