< Izikiel 30 >

1 Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
The LORD’s word came again to me, saying,
2 “Nwa nke mmadụ, buo amụma sịkwa, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu, “‘Kwasienụ akwa ike ma sị, “Ewoo, nʼihi ụbọchị ahụ!”
“Son of man, prophesy, and say, ‘The Lord GOD says: “Wail, ‘Alas for the day!’
3 Nʼihi nʼụbọchị ahụ adịla nso, Ụbọchị nke Onyenwe anyị abịala nso, ụbọchị igwe ojii, ụbọchị ga-ewetara mba dị iche iche mbibi.
For the day is near, even the LORD’s day is near. It will be a day of clouds, a time of the nations.
4 Mma agha ga-abịakwasị Ijipt, ihe mgbu ga-adakwasị Kush. Mgbe ndị e gburu egbu ga-abụ aja dị nʼala, a ga-ekpokọrọkwa akụnụba ya, mebikwaa ntọala ya. Ala ya ga-abụkwa ihe e bibiri ebibi.
A sword will come on Egypt, and anguish will be in Ethiopia, when the slain fall in Egypt. They take away her multitude, and her foundations are broken down.
5 Kush na Libiya, Lidiya na ndị Arebịa niile gwara ọgwa, Kub na ndị mba ọgbụgba ndụ ahụ, na Ijipt ga-eso daa site na mma agha.
“‘“Ethiopia, Put, Lud, all the mixed people, Cub, and the children of the land that is allied with them, will fall with them by the sword.”
6 “‘Ọ bụ ihe a ka Onyenwe anyị kwuru: “‘Ndị niile na-akwagide Ijipt ga-ada, nganga niile nke ike ya ga-agwụsịkwa. Site na Migdol ruo nʼAswan, ọ bụ site na mma agha ka ha ga-ada nʼime ya. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.
“‘The LORD says: “They also who uphold Egypt will fall. The pride of her power will come down. They will fall by the sword in it from the tower of Seveneh,” says the Lord GOD.
7 Ha ga-atọgbọrọ nʼefu, nʼetiti ala niile tọgbọrọ nʼefu. Obodo ha niile ga-abụ mkpọmkpọ ebe, nʼetiti ọtụtụ obodo e bibiri ebibi.
“They will be desolate in the middle of the countries that are desolate. Her cities will be among the cities that are wasted.
8 Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, mgbe m tinyesịrị ọkụ nʼIjipt, mgbe m gwepịara ndị niile na-enyere ya aka.
They will know that I am the LORD when I have set a fire in Egypt, and all her helpers are destroyed.
9 “‘Nʼụbọchị ahụ, aga m ezipu ndị ozi ndị ga-eji ụgbọ dị iche iche, ka ha gaa menye ndị Kush egwu, bụ ndị onwe ha jụrụ afọ. Oke egwu ga-ejidekwa ha nʼoge ahụ nʼihi ihe dakwasịrị Ijipt, nʼihi ihe ndị a aghaghị imezu.
“‘“In that day messengers will go out from before me in ships to make the careless Ethiopians afraid. There will be anguish on them, as in the day of Egypt; for, behold, it comes.”
10 “‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, “‘Aga m esite nʼaka Nebukadneza eze Babilọn bibie igwe ndị agha Ijipt niile.
“‘The Lord GOD says: “I will also make the multitude of Egypt to cease, by the hand of Nebuchadnezzar king of Babylon.
11 Ya onwe ya na ndị agha ya, bụ mba kachasị mba niile njọ na-enweghị obi ebere, ka a ga-akpọbata ka ha bịa bibie ala ahụ. Ha ga-amịpụta mma agha ha megide Ijipt, werekwa ozu ndị e gburu egbu tụsasịa nʼala ahụ.
He and his people with him, the terrible of the nations, will be brought in to destroy the land. They will draw their swords against Egypt, and fill the land with the slain.
12 Aga m eme ka osimiri Naịl taa. Ọ ga-aghọkwa ala kpọrọ nkụ. Aga m ewerekwa ala ahụ resi mba ndị ọjọọ. Aga m ala ala ahụ na ihe niile dị nʼime ya nʼiyi. Ọ bụkwa ndị mba ọzọ ka m ga-eji mee ya. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ekwuola ya.
I will make the rivers dry, and will sell the land into the hand of evil men. I will make the land desolate, and all that is therein, by the hand of foreigners. I, the LORD, have spoken it.”
13 “‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, “‘M ga-ala arụsị niile nʼiyi, mekwaa ka ihe niile a kpụrụ akpụ dị na Memfis kwụsị. Onye eze agakwaghị adị ọzọ nʼIjipt, aga m emekwa ka egwu jupụta nʼala ahụ niile.
“‘The Lord GOD says: “I will also destroy the idols, and I will cause the images to cease from Memphis. There will be no more a prince from the land of Egypt. I will put a fear in the land of Egypt.
14 Aga m emekwa ka Patros tọgbọrọ nʼefu. Aga m etinye ọkụ na Zoan, ma taa Tibs ahụhụ.
I will make Pathros desolate, and will set a fire in Zoan, and will execute judgments on No.
15 M ga-awụkwasị Pelusium ọnụma m, bụ ebe siri ike nke Ijipt, m ga-ebipụkwa igwe ndị Tibs niile.
I will pour my wrath on Sin, the stronghold of Egypt. I will cut off the multitude of No.
16 Aga m amụnye ọkụ nʼIjipt, Pelusium ga-anọ nʼoke ihe mgbu. A ga-eji ike tipịa Tibs. Memfis ga-anọgidekwa nʼọnọdụ ọjọọ ụbọchị niile.
I will set a fire in Egypt Sin will be in great anguish. No will be broken up. Memphis will have adversaries in the daytime.
17 Ụmụ okorobịa Heliopolis na Bubasti ga-anwụ site na mma agha. Obodo ndị a niile ga-abụkwa ndị a dọtara nʼagha.
The young men of Aven and of Pibeseth will fall by the sword. They will go into captivity.
18 Ụbọchị ahụ ga-agba ọchịchịrị na Tapanhis mgbe m ga-agbaji yoku Ijipt, nʼebe ahụ ka mpako nke ike ya ga-agwụsị. Igwe ojii ga-ekpuchi ya, a ga-adọtakwa obodo nta ya niile nʼagha.
At Tehaphnehes also the day will withdraw itself, when I break the yokes of Egypt there. The pride of her power will cease in her. As for her, a cloud will cover her, and her daughters will go into captivity.
19 Aga m eme ka Ijipt taa ahụhụ dị ukwuu, ka ha mata nʼezie na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.’”
Thus I will execute judgments on Egypt. Then they will know that I am the LORD.”’”
20 O ruo, nʼafọ nke iri na otu ya, nʼụbọchị nke asaa, nʼọnwa nke mbụ, okwu nke Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
In the eleventh year, in the first month, in the seventh day of the month, the LORD’s word came to me, saying,
21 “Nwa nke mmadụ, agbajiela m ogwe aka Fero, eze Ijipt. Lee, o nwebeghị onye gbara ya ọkpụkpụ, ma ọ bụkwanụ kee ya ihe, ka o sie ike ọzọ ijide mma agha.
“Son of man, I have broken the arm of Pharaoh king of Egypt. Behold, it has not been bound up, to apply medicines, to put a bandage to bind it, that it may become strong to hold the sword.
22 Nʼihi ya, nke a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị: Lee, mụ onwe m na-emegide Fero bụ eze Ijipt. Aga m agbaji ogwe aka ya abụọ, ma nke siri ike ma nke gbajiri agbaji na mbụ. Aga m emekwa ka mma agha ya si nʼaka ya dapụ.
Therefore the Lord GOD says: ‘Behold, I am against Pharaoh king of Egypt, and will break his arms, the strong arm, and that which was broken. I will cause the sword to fall out of his hand.
23 Aga m achụsa ndị Ijipt nʼetiti mba niile tụsaakwa ha nʼobodo niile,
I will scatter the Egyptians among the nations, and will disperse them through the countries.
24 meekwa ka ogwe aka abụọ nke eze Babilọn sie ike. Aga m etinye mma agha m nʼaka ya, ma ogwe aka abụọ nke Fero ka m ga-agbajisi. Mgbe ahụ, Fero ga-asụ ude nʼihu eze Babilọn dịka onye e merụrụ ahụ.
I will strengthen the arms of the king of Babylon, and put my sword in his hand; but I will break the arms of Pharaoh, and he will groan before the king of Babylon with the groaning of a mortally wounded man.
25 Aga m eme ka ogwe aka abụọ nke eze Babilọn sie ike; ma ogwe aka Fero ga-akpọnwụ. Mgbe ahụ, ha ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, mgbe m tinyere mma agha nʼaka eze Babilọn, na mgbe o setịpụrụ ya imegide Ijipt.
I will hold up the arms of the king of Babylon, but the arms of Pharaoh will fall down. Then they will know that I am the LORD when I put my sword into the hand of the king of Babylon, and he stretches it out on the land of Egypt.
26 Aga m achụsa ndị Ijipt nʼetiti mba niile, fesaa ha nʼala niile. Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.”
I will scatter the Egyptians among the nations and disperse them through the countries. Then they will know that I am the LORD.’”

< Izikiel 30 >