Preface
Read
+
Publisher
Nainoia, Inc.
PO Box 462, Bellefonte, PA 16823
(814) 470-8028
Nainoia Inc, Publisher
LinkedIn/NAINOIA-INC
Third Party Publisher Resources
Request Custom Formatted Verses
Please contact us below
Submit your proposed corrections
I understand that the Aionian Bible republishes public domain and Creative Commons Bible texts and that volunteers may be needed to present the original text accurately. I also understand that apocryphal text is removed and most variant verse numbering is mapped to the English standard. I have entered my corrections under the verse(s) below. Proposed corrections to the The Igbo Holy Bible for Everyone, Ezekiel Chapter 30 https://www.AionianBible.org/Bibles/Igbo---Igbo-Bible/Ezekiel/30 1) Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị, 2) “Nwa nke mmadụ, buo amụma sịkwa, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu, “‘Kwasienụ akwa ike ma sị, “Ewoo, nʼihi ụbọchị ahụ!” 3) Nʼihi nʼụbọchị ahụ adịla nso, Ụbọchị nke Onyenwe anyị abịala nso, ụbọchị igwe ojii, ụbọchị ga-ewetara mba dị iche iche mbibi. 4) Mma agha ga-abịakwasị Ijipt, ihe mgbu ga-adakwasị Kush. Mgbe ndị e gburu egbu ga-abụ aja dị nʼala, a ga-ekpokọrọkwa akụnụba ya, mebikwaa ntọala ya. Ala ya ga-abụkwa ihe e bibiri ebibi. 5) Kush na Libiya, Lidiya na ndị Arebịa niile gwara ọgwa, Kub na ndị mba ọgbụgba ndụ ahụ, na Ijipt ga-eso daa site na mma agha. 6) “‘Ọ bụ ihe a ka Onyenwe anyị kwuru: “‘Ndị niile na-akwagide Ijipt ga-ada, nganga niile nke ike ya ga-agwụsịkwa. Site na Migdol ruo nʼAswan, ọ bụ site na mma agha ka ha ga-ada nʼime ya. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri. 7) Ha ga-atọgbọrọ nʼefu, nʼetiti ala niile tọgbọrọ nʼefu. Obodo ha niile ga-abụ mkpọmkpọ ebe, nʼetiti ọtụtụ obodo e bibiri ebibi. 8) Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, mgbe m tinyesịrị ọkụ nʼIjipt, mgbe m gwepịara ndị niile na-enyere ya aka. 9) “‘Nʼụbọchị ahụ, aga m ezipu ndị ozi ndị ga-eji ụgbọ dị iche iche, ka ha gaa menye ndị Kush egwu, bụ ndị onwe ha jụrụ afọ. Oke egwu ga-ejidekwa ha nʼoge ahụ nʼihi ihe dakwasịrị Ijipt, nʼihi ihe ndị a aghaghị imezu. 10) “‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, “‘Aga m esite nʼaka Nebukadneza eze Babilọn bibie igwe ndị agha Ijipt niile. 11) Ya onwe ya na ndị agha ya, bụ mba kachasị mba niile njọ na-enweghị obi ebere, ka a ga-akpọbata ka ha bịa bibie ala ahụ. Ha ga-amịpụta mma agha ha megide Ijipt, werekwa ozu ndị e gburu egbu tụsasịa nʼala ahụ. 12) Aga m eme ka osimiri Naịl taa. Ọ ga-aghọkwa ala kpọrọ nkụ. Aga m ewerekwa ala ahụ resi mba ndị ọjọọ. Aga m ala ala ahụ na ihe niile dị nʼime ya nʼiyi. Ọ bụkwa ndị mba ọzọ ka m ga-eji mee ya. Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ekwuola ya. 13) “‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru, “‘M ga-ala arụsị niile nʼiyi, mekwaa ka ihe niile a kpụrụ akpụ dị na Memfis kwụsị. Onye eze agakwaghị adị ọzọ nʼIjipt, aga m emekwa ka egwu jupụta nʼala ahụ niile. 14) Aga m emekwa ka Patros tọgbọrọ nʼefu. Aga m etinye ọkụ na Zoan, ma taa Tibs ahụhụ. 15) M ga-awụkwasị Pelusium ọnụma m, bụ ebe siri ike nke Ijipt, m ga-ebipụkwa igwe ndị Tibs niile. 16) Aga m amụnye ọkụ nʼIjipt, Pelusium ga-anọ nʼoke ihe mgbu. A ga-eji ike tipịa Tibs. Memfis ga-anọgidekwa nʼọnọdụ ọjọọ ụbọchị niile. 17) Ụmụ okorobịa Heliopolis na Bubasti ga-anwụ site na mma agha. Obodo ndị a niile ga-abụkwa ndị a dọtara nʼagha. 18) Ụbọchị ahụ ga-agba ọchịchịrị na Tapanhis mgbe m ga-agbaji yoku Ijipt, nʼebe ahụ ka mpako nke ike ya ga-agwụsị. Igwe ojii ga-ekpuchi ya, a ga-adọtakwa obodo nta ya niile nʼagha. 19) Aga m eme ka Ijipt taa ahụhụ dị ukwuu, ka ha mata nʼezie na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.’” 20) O ruo, nʼafọ nke iri na otu ya, nʼụbọchị nke asaa, nʼọnwa nke mbụ, okwu nke Onyenwe anyị ruru m ntị, sị, 21) “Nwa nke mmadụ, agbajiela m ogwe aka Fero, eze Ijipt. Lee, o nwebeghị onye gbara ya ọkpụkpụ, ma ọ bụkwanụ kee ya ihe, ka o sie ike ọzọ ijide mma agha. 22) Nʼihi ya, nke a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị: Lee, mụ onwe m na-emegide Fero bụ eze Ijipt. Aga m agbaji ogwe aka ya abụọ, ma nke siri ike ma nke gbajiri agbaji na mbụ. Aga m emekwa ka mma agha ya si nʼaka ya dapụ. 23) Aga m achụsa ndị Ijipt nʼetiti mba niile tụsaakwa ha nʼobodo niile, 24) meekwa ka ogwe aka abụọ nke eze Babilọn sie ike. Aga m etinye mma agha m nʼaka ya, ma ogwe aka abụọ nke Fero ka m ga-agbajisi. Mgbe ahụ, Fero ga-asụ ude nʼihu eze Babilọn dịka onye e merụrụ ahụ. 25) Aga m eme ka ogwe aka abụọ nke eze Babilọn sie ike; ma ogwe aka Fero ga-akpọnwụ. Mgbe ahụ, ha ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, mgbe m tinyere mma agha nʼaka eze Babilọn, na mgbe o setịpụrụ ya imegide Ijipt. 26) Aga m achụsa ndị Ijipt nʼetiti mba niile, fesaa ha nʼala niile. Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.” Additional comments?
Refresh Captcha
The world's first Holy Bible un-translation!