< Izikiel 29 >
1 Nʼafọ nke iri, nʼọnwa nke iri, nʼụbọchị nke iri na abụọ, okwu nke Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
Ngomnyaka wetshumi, ngenyanga yetshumi, ngolwetshumi lambili lwenyanga, ilizwi leNkosi lafika kimi, lisithi:
2 “Nwa nke mmadụ, chee ihu gị nʼIjipt buo amụma megide Fero bụ eze Ijipt, na ala Ijipt niile.
Ndodana yomuntu, misa ubuso bakho bumelene loFaro inkosi yeGibhithe, uprofethe umelene laye, njalo umelene layo yonke iGibhithe.
3 Gwa ya okwu, sị, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị: “‘Lee, mụ onwe m na-emegide gị, Fero eze Ijipt, gị onye bụ ogologo anụ ọjọọ ahụ na-amakpu nʼetiti mmiri iyi. Nʼihi na ị sịrị, “Ọ bụ m nwe Naịl, ọ bụkwa mụ onwe m mere ya nye onwe m.”
Khuluma uthi: Itsho njalo iNkosi uJehova: Khangela, ngimelane lawe, Faro, nkosi yeGibhithe, umgobho omkhulu olele phakathi kwemifula yawo, othi: Umfula wami ngowami, ngazenzela wona.
4 Ma aga m etinye nko nʼagba gị, mee ka azụ niile nke iyi gị niile rapara nʼakpịrịkpa gị. Aga m adọpụta gị site nʼetiti iyi gị niile, mee ka azụ niile rapara nʼakpịrịkpa gị.
Kodwa ngizafaka izingwegwe emihlathini yakho, ngenze inhlanzi zemifula yakho zinamathele emaxolweni akho, ngikukhuphule phakathi kwemifula yakho, lazo zonke inhlanzi zemifula yakho zizanamathela emaxolweni akho.
5 Aga m ahapụ gị na azụ niile nke osimiri iyi gị nʼọzara, ebe ahụ ka unu ga-anọ nwụọ nʼala ubi, a gaghị eli unu eli maọbụ tụtụọ unu, nʼihi na emeela m ka unu bụrụ nri nye anụ ọhịa niile, na nnụnụ niile.
Njalo ngizakutshiya enkangala, wena lazo zonke inhlanzi zemifula yakho; uzawela ebusweni beganga; kawuyikuhlanganiswa, kawuyikubuthwa; ngizakunikela ube yikudla kuzo izilo zeganga lenyoni zamazulu.
6 Mgbe ahụ, ndị niile bi nʼIjipt ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị. “‘Ị dịrịla ka mkpanaka achara nʼebe ụlọ Izrel nọ.
Labo bonke abahlali beGibhithe bazakwazi ukuthi ngiyiNkosi, ngoba bebeludondolo lomhlanga kuyo indlu kaIsrayeli.
7 Mgbe ha jidere gị nʼaka, ị nyajiri dọwaa ha ubu ha. Mgbe ha dabeere na gị, ị gbajiri mee ka ha ghara inwekwa ike iguzosi ike nʼụkwụ ha.
Lapho bekubamba ngesandla, wephula wadabula lonke ihlombe labo; lalapho beseyama kuwe, wephuka, wenza zonke inkalo zabo zama.
8 “‘Nʼihi ya, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Lee, aga m eme ka mma agha bịakwasị gị, aga m ebipụkwa mmadụ na anụmanụ niile dị nʼime gị.
Ngakho itsho njalo iNkosi uJehova: Khangela, ngizaletha inkemba phezu kwakho, ngiqume kusuke kuwe umuntu lenyamazana.
9 Ala Ijipt ga-aghọ ebe tọgbọrọ nʼefu; ha ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị. “‘Nʼihi na ị sịrị, “Osimiri Naịl bụ nke m. Ọ bụ m kere ya.”
Lelizwe leGibhithe lizakuba yincithakalo lenkangala. Khona bezakwazi ukuthi ngiyiNkosi. Ngoba uthe: Umfula ngowami, mina-ke ngiwenzile.
10 Nʼihi ya, aga m edo onwe m megide gị, megidekwa osimiri gị. Aga m ala Ijipt niile nʼiyi site na Migdol ruo Aswan, ruokwa nʼoke ala ha na ndị Kush.
Ngakho, khangela, ngimelene lawe, ngimelene lemifula yakho; ngenze ilizwe leGibhithe libe yizincithakalo isibili lenkangala, kusukela emphotshongweni kusiya eSevene kuze kube semngceleni weEthiyophiya.
11 Ọ dịghị ụkwụ anụmanụ maọbụ mmadụ ga-agafe nʼime ya, agaghị ebikwa nʼime ya ruo mgbe iri afọ anọ gasịrị.
Kakulanyawo lomuntu oluzadlula kilo, kakulanyawo lwenyamazana oluzadlula kilo; futhi kaliyikuhlalwa okweminyaka engamatshumi amane.
12 Aga m emekwa ka ala Ijipt bụrụ ebe tọgbọrọ nʼefu nʼetiti mkpọmkpọ ala niile, obodo ya niile ga-atọgbọrọ nʼefu iri afọ anọ nʼetiti obodo ndị e mere ka ha laa nʼiyi. Aga m achụsasị ndị Ijipt nʼetiti mba niile, fesaa ha nʼala niile.
Ngoba ngizakwenza ilizwe leGibhithe libe yincithakalo phakathi kwamazwe wonke achithekileyo; lemizi yalo phakathi kwemizi engamanxiwa izakuba yincithakalo okweminyaka engamatshumi amane; njalo ngizahlakaza amaGibhithe phakathi kwezizwe, ngiwasabalalise emazweni.
13 “‘Ọzọkwa, Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, nʼọgwụgwụ iri afọ anọ ahụ, aga m achịkọtakwa ndị Ijipt site nʼebe niile ha gbasara.
Ngoba itsho njalo iNkosi uJehova: Ekupheleni kweminyaka engamatshumi amane ngizabutha amaGibhithe ebantwini abahlakazekele khona.
14 Aga m emekwa ka ndị ya niile laghachi nʼala Patros, ala ebe a mụrụ ha. Ma Ijipt agaghị abụkwa alaeze a maara nke ọma ọzọ.
Njalo ngizabuyisela abathunjwa beGibhithe, ngibenze babuyele elizweni lePatrosi, elizweni lokuzalwa kwabo; lapho-ke bazakuba ngumbuso ophansi.
15 Ọ ga-abụ alaeze dị nnọọ ala karịa alaeze niile. Ọ dịkwaghị mgbe ọzọ ọ ga-eweli onwe ya elu karịa mba ọzọ niile. Aga m emekwa ka ha dị nta, nke ha agaghị inwe ike achịkwa mba niile ọzọ.
Lizakuba phansi kulayo imibuso, futhi kalisayikuziphakamisa phezu kwezizwe; ngoba ngizabanciphisa ukuze bangabuyi babuse phezu kwezizwe.
16 Ijipt agaghị abụkwara ụlọ Izrel ihe ntụkwasị obi, kama ọ ga-abụrụ ha ihe iji cheta mmehie ha mere mgbe ha lere anya enyemaka site nʼaka ya. Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onye kachasị ihe niile elu, bụOnyenwe anyị.’”
Njalo kalisayikuba lithemba kuyo indlu kaIsrayeli, eletha ukukhunjulwa kwesiphambeko, lapho bephenduka ukulandela bona. Kodwa bazakwazi ukuthi ngiyiNkosi uJehova.
17 Ọ ruo, nʼiri afọ abụọ na asaa, nʼọnwa mbụ, nʼụbọchị nke mbụ, ka okwu nke Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
Kwasekusithi ngomnyaka wamatshumi amabili lesikhombisa, ngenyanga yokuqala, ngolokuqala lwenyanga, ilizwi leNkosi lafika kimi, lisithi:
18 “Nwa nke mmadụ, Nebukadneza bụ eze Babilọn mere ka ndị agha ya lụsoo Taịa ọgụ nʼebe ọ dị ukwuu. Isi niile ọbụla ka e mere ka ọ kwọchasịa, ubu niile kwa echihịara echihịa. Ma ya na ndị agha ya anataghị ụgwọ ọrụ ọbụla, nʼagha ahụ o buru megide Taịa.
Ndodana yomuntu, uNebhukadirezari inkosi yeBhabhiloni wenza ibutho lakhe lakhonza inkonzo enkulu limelene leTire; lonke ikhanda laphucwa, lalo lonke ihlombe lasutshulwa; kanti yena kalamvuzo, lebutho lakhe, ngenxa yeTire, ngenxa yenkonzo ayikhonza emelene layo.
19 Nʼihi nke a, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu sị: Lee, ana m aga inye Nebukadneza eze Babilọn ala Ijipt. Ọ ga-akwakọrọ akụnụba ya, ọ ga-azacha ma bukọrọkwa ihe niile nke dị nʼala ahụ. Ha ga-abụkwa ụgwọ ọrụ nke ndị agha ya.
Ngakho itsho njalo iNkosi uJehova: Khangela, ngizanikela ilizwe leGibhithe kuNebhukadirezari inkosi yeBhabhiloni; njalo uzathatha ixuku layo, athumbe ukuthunjwa kwayo, aphange impango yayo; njalo kuzakuba liholo lebutho lakhe.
20 Enyefeela m ala Ijipt nʼaka ya, ka ọ bụrụ ụgwọ ọrụ nʼihi ọrụ ya, nʼihi na ya na ndị agha ya rụụrụ m ya. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.”
Ngimnike ilizwe leGibhithe kube ngumvuzo akhonza ngawo kulo, ngoba bangisebenzela, itsho iNkosi uJehova.
21 “Nʼụbọchị ahụ, aga m eme ka otu mpi puputara ụlọ Izrel. Aga m asaghekwa ọnụ gị nʼetiti ha. Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.”
Ngalolosuku ngizakwenza uphondo lwendlu kaIsrayeli lukhahlele, ngikunike ukukhamisa komlomo phakathi kwabo. Njalo bazakwazi ukuthi ngiyiNkosi.