Preface
Read
+
Publisher
Nainoia, Inc.
PO Box 462, Bellefonte, PA 16823
(814) 470-8028
Nainoia Inc, Publisher
LinkedIn/NAINOIA-INC
Third Party Publisher Resources
Request Custom Formatted Verses
Please contact us below
Submit your proposed corrections
I understand that the Aionian Bible republishes public domain and Creative Commons Bible texts and that volunteers may be needed to present the original text accurately. I also understand that apocryphal text is removed and most variant verse numbering is mapped to the English standard. I have entered my corrections under the verse(s) below. Proposed corrections to the The Igbo Holy Bible for Everyone, Ezekiel Chapter 29 https://www.AionianBible.org/Bibles/Igbo---Igbo-Bible/Ezekiel/29 1) Nʼafọ nke iri, nʼọnwa nke iri, nʼụbọchị nke iri na abụọ, okwu nke Onyenwe anyị ruru m ntị, sị, 2) “Nwa nke mmadụ, chee ihu gị nʼIjipt buo amụma megide Fero bụ eze Ijipt, na ala Ijipt niile. 3) Gwa ya okwu, sị, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị: “‘Lee, mụ onwe m na-emegide gị, Fero eze Ijipt, gị onye bụ ogologo anụ ọjọọ ahụ na-amakpu nʼetiti mmiri iyi. Nʼihi na ị sịrị, “Ọ bụ m nwe Naịl, ọ bụkwa mụ onwe m mere ya nye onwe m.” 4) Ma aga m etinye nko nʼagba gị, mee ka azụ niile nke iyi gị niile rapara nʼakpịrịkpa gị. Aga m adọpụta gị site nʼetiti iyi gị niile, mee ka azụ niile rapara nʼakpịrịkpa gị. 5) Aga m ahapụ gị na azụ niile nke osimiri iyi gị nʼọzara, ebe ahụ ka unu ga-anọ nwụọ nʼala ubi, a gaghị eli unu eli maọbụ tụtụọ unu, nʼihi na emeela m ka unu bụrụ nri nye anụ ọhịa niile, na nnụnụ niile. 6) Mgbe ahụ, ndị niile bi nʼIjipt ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị. “‘Ị dịrịla ka mkpanaka achara nʼebe ụlọ Izrel nọ. 7) Mgbe ha jidere gị nʼaka, ị nyajiri dọwaa ha ubu ha. Mgbe ha dabeere na gị, ị gbajiri mee ka ha ghara inwekwa ike iguzosi ike nʼụkwụ ha. 8) “‘Nʼihi ya, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Lee, aga m eme ka mma agha bịakwasị gị, aga m ebipụkwa mmadụ na anụmanụ niile dị nʼime gị. 9) Ala Ijipt ga-aghọ ebe tọgbọrọ nʼefu; ha ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị. “‘Nʼihi na ị sịrị, “Osimiri Naịl bụ nke m. Ọ bụ m kere ya.” 10) Nʼihi ya, aga m edo onwe m megide gị, megidekwa osimiri gị. Aga m ala Ijipt niile nʼiyi site na Migdol ruo Aswan, ruokwa nʼoke ala ha na ndị Kush. 11) Ọ dịghị ụkwụ anụmanụ maọbụ mmadụ ga-agafe nʼime ya, agaghị ebikwa nʼime ya ruo mgbe iri afọ anọ gasịrị. 12) Aga m emekwa ka ala Ijipt bụrụ ebe tọgbọrọ nʼefu nʼetiti mkpọmkpọ ala niile, obodo ya niile ga-atọgbọrọ nʼefu iri afọ anọ nʼetiti obodo ndị e mere ka ha laa nʼiyi. Aga m achụsasị ndị Ijipt nʼetiti mba niile, fesaa ha nʼala niile. 13) “‘Ọzọkwa, Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, nʼọgwụgwụ iri afọ anọ ahụ, aga m achịkọtakwa ndị Ijipt site nʼebe niile ha gbasara. 14) Aga m emekwa ka ndị ya niile laghachi nʼala Patros, ala ebe a mụrụ ha. Ma Ijipt agaghị abụkwa alaeze a maara nke ọma ọzọ. 15) Ọ ga-abụ alaeze dị nnọọ ala karịa alaeze niile. Ọ dịkwaghị mgbe ọzọ ọ ga-eweli onwe ya elu karịa mba ọzọ niile. Aga m emekwa ka ha dị nta, nke ha agaghị inwe ike achịkwa mba niile ọzọ. 16) Ijipt agaghị abụkwara ụlọ Izrel ihe ntụkwasị obi, kama ọ ga-abụrụ ha ihe iji cheta mmehie ha mere mgbe ha lere anya enyemaka site nʼaka ya. Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onye kachasị ihe niile elu, bụOnyenwe anyị.’” 17) Ọ ruo, nʼiri afọ abụọ na asaa, nʼọnwa mbụ, nʼụbọchị nke mbụ, ka okwu nke Onyenwe anyị ruru m ntị, sị, 18) “Nwa nke mmadụ, Nebukadneza bụ eze Babilọn mere ka ndị agha ya lụsoo Taịa ọgụ nʼebe ọ dị ukwuu. Isi niile ọbụla ka e mere ka ọ kwọchasịa, ubu niile kwa echihịara echihịa. Ma ya na ndị agha ya anataghị ụgwọ ọrụ ọbụla, nʼagha ahụ o buru megide Taịa. 19) Nʼihi nke a, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu sị: Lee, ana m aga inye Nebukadneza eze Babilọn ala Ijipt. Ọ ga-akwakọrọ akụnụba ya, ọ ga-azacha ma bukọrọkwa ihe niile nke dị nʼala ahụ. Ha ga-abụkwa ụgwọ ọrụ nke ndị agha ya. 20) Enyefeela m ala Ijipt nʼaka ya, ka ọ bụrụ ụgwọ ọrụ nʼihi ọrụ ya, nʼihi na ya na ndị agha ya rụụrụ m ya. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.” 21) “Nʼụbọchị ahụ, aga m eme ka otu mpi puputara ụlọ Izrel. Aga m asaghekwa ọnụ gị nʼetiti ha. Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.” Additional comments?
Refresh Captcha
The world's first Holy Bible un-translation!