< Izikiel 29 >
1 Nʼafọ nke iri, nʼọnwa nke iri, nʼụbọchị nke iri na abụọ, okwu nke Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
On the twelfth day of the tenth month of the tenth year, a message from the Lord came to me, saying,
2 “Nwa nke mmadụ, chee ihu gị nʼIjipt buo amụma megide Fero bụ eze Ijipt, na ala Ijipt niile.
“Son of man, face towards Pharaoh king of Egypt and prophesy against him and the whole of Egypt.
3 Gwa ya okwu, sị, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị: “‘Lee, mụ onwe m na-emegide gị, Fero eze Ijipt, gị onye bụ ogologo anụ ọjọọ ahụ na-amakpu nʼetiti mmiri iyi. Nʼihi na ị sịrị, “Ọ bụ m nwe Naịl, ọ bụkwa mụ onwe m mere ya nye onwe m.”
Tell him that this is what the Lord God says: Watch out, because I'm condemning you, Pharaoh king of Egypt, you great monster lying in your rivers, who says, ‘The Nile belongs to me; I made it myself.’
4 Ma aga m etinye nko nʼagba gị, mee ka azụ niile nke iyi gị niile rapara nʼakpịrịkpa gị. Aga m adọpụta gị site nʼetiti iyi gị niile, mee ka azụ niile rapara nʼakpịrịkpa gị.
I'm going to put hooks in your jaws and make the fish in your river stick to your scales. I will pull you up out of your river, and all the fish will stick to your scales.
5 Aga m ahapụ gị na azụ niile nke osimiri iyi gị nʼọzara, ebe ahụ ka unu ga-anọ nwụọ nʼala ubi, a gaghị eli unu eli maọbụ tụtụọ unu, nʼihi na emeela m ka unu bụrụ nri nye anụ ọhịa niile, na nnụnụ niile.
I will throw you and the fish away, leaving you in the desert. Your body will fall on the ground and be left in the open. It won't be collected or taken to be buried. I'll leave you as food for wild animals and birds of prey.
6 Mgbe ahụ, ndị niile bi nʼIjipt ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị. “‘Ị dịrịla ka mkpanaka achara nʼebe ụlọ Izrel nọ.
Then everyone in Egypt will know that I am the Lord. When you had to deal with the people of Israel you were like a flimsy walking stick made from a reed.
7 Mgbe ha jidere gị nʼaka, ị nyajiri dọwaa ha ubu ha. Mgbe ha dabeere na gị, ị gbajiri mee ka ha ghara inwekwa ike iguzosi ike nʼụkwụ ha.
When Israel grabbed hold of you, you split apart, damaging their shoulder. When they leaned on you, you broke, putting their backs out.
8 “‘Nʼihi ya, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Lee, aga m eme ka mma agha bịakwasị gị, aga m ebipụkwa mmadụ na anụmanụ niile dị nʼime gị.
So this is what the Lord God says: I will attack you with a sword and kill both people and animals.
9 Ala Ijipt ga-aghọ ebe tọgbọrọ nʼefu; ha ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị. “‘Nʼihi na ị sịrị, “Osimiri Naịl bụ nke m. Ọ bụ m kere ya.”
Egypt will become an empty wasteland. Then they will know that I am the Lord. Because you said, ‘The Nile belongs to me; I made it,’
10 Nʼihi ya, aga m edo onwe m megide gị, megidekwa osimiri gị. Aga m ala Ijipt niile nʼiyi site na Migdol ruo Aswan, ruokwa nʼoke ala ha na ndị Kush.
that's why I'm condemning you and your river. I will ruin Egypt, making it into an empty wasteland all the way from Migdol in the north to Syene in the south, and up to the border with Cush.
11 Ọ dịghị ụkwụ anụmanụ maọbụ mmadụ ga-agafe nʼime ya, agaghị ebikwa nʼime ya ruo mgbe iri afọ anọ gasịrị.
No one, human or animal, will travel that way or live there for forty years.
12 Aga m emekwa ka ala Ijipt bụrụ ebe tọgbọrọ nʼefu nʼetiti mkpọmkpọ ala niile, obodo ya niile ga-atọgbọrọ nʼefu iri afọ anọ nʼetiti obodo ndị e mere ka ha laa nʼiyi. Aga m achụsasị ndị Ijipt nʼetiti mba niile, fesaa ha nʼala niile.
I will make Egypt more of a wasteland than any other country, and its towns will lie in ruins for forty years among all the other ruined towns. I will scatter the Egyptians among the different nations and countries.
13 “‘Ọzọkwa, Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, nʼọgwụgwụ iri afọ anọ ahụ, aga m achịkọtakwa ndị Ijipt site nʼebe niile ha gbasara.
However, this is what the Lord God says: After forty years I will gather the Egyptians from the different countries where they were scattered.
14 Aga m emekwa ka ndị ya niile laghachi nʼala Patros, ala ebe a mụrụ ha. Ma Ijipt agaghị abụkwa alaeze a maara nke ọma ọzọ.
I will bring Egypt out of captivity and take them back to the land of Pathros, where they originally came from. Their kingdom will be insignificant.
15 Ọ ga-abụ alaeze dị nnọọ ala karịa alaeze niile. Ọ dịkwaghị mgbe ọzọ ọ ga-eweli onwe ya elu karịa mba ọzọ niile. Aga m emekwa ka ha dị nta, nke ha agaghị inwe ike achịkwa mba niile ọzọ.
Egypt will be the lowest of kingdoms and won't ever be more important than other nations again. I will bring Egypt down so that it won't ever be able to rule over the nations again.
16 Ijipt agaghị abụkwara ụlọ Izrel ihe ntụkwasị obi, kama ọ ga-abụrụ ha ihe iji cheta mmehie ha mere mgbe ha lere anya enyemaka site nʼaka ya. Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onye kachasị ihe niile elu, bụOnyenwe anyị.’”
The people of Israel won't ever trust in Egypt again; instead they will be reminded them of their sin when they turned to the Egyptians for help. Then they will know that I am the Lord God.”
17 Ọ ruo, nʼiri afọ abụọ na asaa, nʼọnwa mbụ, nʼụbọchị nke mbụ, ka okwu nke Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
On the first day of the first month of the twenty-seventh year, a message from the Lord came to me, saying,
18 “Nwa nke mmadụ, Nebukadneza bụ eze Babilọn mere ka ndị agha ya lụsoo Taịa ọgụ nʼebe ọ dị ukwuu. Isi niile ọbụla ka e mere ka ọ kwọchasịa, ubu niile kwa echihịara echihịa. Ma ya na ndị agha ya anataghị ụgwọ ọrụ ọbụla, nʼagha ahụ o buru megide Taịa.
“Son of man, Nebuchadnezzar king of Babylon made his army work really hard in the siege against Tyre. The soldiers had their hair worn off their heads, and their shoulders rubbed raw. However, he and his army didn't gain any benefit from Tyre for all the work they did in attacking it.
19 Nʼihi nke a, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu sị: Lee, ana m aga inye Nebukadneza eze Babilọn ala Ijipt. Ọ ga-akwakọrọ akụnụba ya, ọ ga-azacha ma bukọrọkwa ihe niile nke dị nʼala ahụ. Ha ga-abụkwa ụgwọ ọrụ nke ndị agha ya.
So this is what the Lord God says: I'm going to give Egypt to Nebuchadnezzar king of Babylon who will seize everything valuable. He will loot the country, robbing it to pay his army.
20 Enyefeela m ala Ijipt nʼaka ya, ka ọ bụrụ ụgwọ ọrụ nʼihi ọrụ ya, nʼihi na ya na ndị agha ya rụụrụ m ya. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.”
I'm rewarding him for all his work by giving him Egypt because the work they did was for me, declares the Lord God.
21 “Nʼụbọchị ahụ, aga m eme ka otu mpi puputara ụlọ Izrel. Aga m asaghekwa ọnụ gị nʼetiti ha. Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.”
At that time I will give power back to the people of Israel and I will help you speak to them. Then they will know that I am the Lord.”