< Izikiel 12 >

1 Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
Neno la Yahwe likanijia, kusema,
2 “Nwa nke mmadụ, i bi nʼetiti ndị na-enupu isi, ndị nwere anya ịhụ ụzọ ma ha adịghị ahụ; ndị nwere ntị ịnụ ihe ma ha adịghị anụ ihe, nʼihi na ha bụ ndị nnupu isi.
“Mwana wa adamu, unaishi kwenye nyumba ya uasi, wana macho ya kuona lakini hawaoni; na wana masikio ya kusikia lakini hawasikii, kwa sababu wao ni nyumba iliyoasi.
3 “Ya mere, nwa nke mmadụ, kwakọtaa ngwongwo ụlọ gị maka ị ga biri nʼala ọzọ, mee nke a nʼehihie dịka ha na-ele gị anya, hapụ ụlọ gị gaa nʼebe ọzọ. Ma eleghị anya ha ga-aghọta, ọ bụ ezie na ha bụ ndị nnupu isi.
Kwa hiyo wewe mwanadamu, andaa mambo yako kwa ajili ya uhamisho, na anza kuondoka mchana usoni kwao, kwa kuwa nitakuhamisha kwenye uso wao kutoka sehemu yao kwenda sehemu nyingine. Labda wataanza kuona, kuwa wao ni nyumba ya uasi.
4 Kwapụta ngwongwo gị nʼezi nʼehihie ka ha hụ ya. Ma hapụ ụlọ gị nʼabalị dịka ndị na-agba ọsọ ndụ si eme, mgbe ha na-amalite ije ha, nke ịga ibi nʼala ọzọ.
Utatoa vitu vyako kwa ajili ya kuhamisha mchana katika macho yao; toka jioni kwenye macho yao kama ambavyo uendavyo kwenye uhamisho.
5 Mgbe ha na-ele gị anya, gwupuo mgbidi, site na ya kwara ngwongwo gị pụọ.
Chimba shimo ukutani kwenye uso wa macho yao, na ingia ndani yake.
6 Mgbe ha nọ na-ele gị anya, bulie ibu gị, tụkwasị ya nʼubu gị, pụọ gawa nʼime ọchịchịrị, kpuchie ihu gị, ka ị ghara ihu ala ahụ anya. Nʼihi na emela m gị ihe ịrịbama nye ụlọ Izrel niile.”
Kwenye macho yao, chukua vitu vyako kwenye mabega yako, na uwalete kwenye giza. Funika uso wako kama ishara kwenye nyumba ya Israeli.”
7 Emere m ihe e nyere m nʼiwu. Ebupụtara m ngwongwo m nʼehihie, jikọta ha maka ịgba ọsọ ndụ. Nʼanyasị, eji m aka m gwuo ọnụ na mgbidi ahụ. Ebukwasịrị m ngwongwo m nʼubu, bulie ije nʼime ọchịchịrị mgbe ha nọ na-ele m anya.
Hivyo nikafanya hivyo, kama nilivyokuwa nimeamriwa. Nikatoa vitu vya uhamisho wakati wa mchana, na katika jioni nikachimba shimo hata kwenye ukuta kwa mkono. Nikachukua vitu vyangu kwenye giza, na kuviweka juu kwenye bega langu katika macho yao.
8 Nʼụtụtụ echi ya, okwu Onyenwe anyị bịakwutere m,
Kisha neno la Yahwe likanijia asubuhi, likisema,
9 “Nwa nke mmadụ, ọ bụ na ụlọ Izrel ndị nnupu isi ahụ ajụbeghị gị, ‘o lee ihe ị na-eme?’
Mwanadamu, je nyumba ya Israeli, ile ni nyumba ya uasi, hawakukwambia, 'Unafanya nini?'
10 “Gwa ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Amụma a bụ maka onyeisi nọ na Jerusalem, nʼụlọ Izrel niile nọkwa ebe ahụ.’
Waambie, 'Bwana Yahwe asema hivi: hili tendo la kinabii linamhuusu mwana wa mfalme wa Yerusalemu, na nyumba yote ya Israeli walio kati yao.'
11 Sị ha, ‘Mụ onwe m bụ ihe ama nye unu.’ “Dịka m mere, otu a kwa ka a ga-eme nye ha. Ha ga-aga na mba ọzọ biri ka ndị a dọtara nʼagha.
Sema, 'Mimi ni ishara kwenu. Kama nilivyofanya, itafanyika kwao; watakwenda uhamishoni na kuwa wafungwa.
12 “Nwa eze nke nọ nʼetiti ha ga-amaburu ibu ya nʼubu pụọ nʼọchịchịrị, ọ ga-egwupụ mgbidi aja nke obodo site nʼebe ahụ pụọ. Ọ ga-ekpuchikwa ihu ya ka ọ ghara iji anya ya hụ obodo ahụ.
Yule mwana wa mfalme aliye miongoni mwao atavibeba vitu vyake kwenye bega lake katika giza, na ataenda zake kupitia kwenye ukuta. Watachimba kwenye ukuta na kutoa vitu vyao nje. Atafunika uso wake, hivyo hataona nchi kwa macho yake.
13 Ma aga m eji ụgbụ m jide ya, meekwa ka ọ bịaruo Babilọn bụ ala ndị Kaldịa. Ebe ahụ ka ọ ga-anọ nwụọ, ma ọ gaghị ahụ ya anya.
Nitausambaza wavu wangu juu yake naye atanaswa kwenye mtego wangu; kisha nitamleta Babeli, ncha ya Wakaldayo, lakini hataiona. Atafia huko.
14 Ndị niile gbara ya gburugburu na ndị agha ya niile ka m ga-achụsa nʼala niile, ọ bụkwa mma agha ka m ga-amịpụta jiri chụọ ha ọsọ.
Pia nitatawatawanya katika kila mwelekeo wale wote waliomzunguka wanaomsaidia na jeshi lake lote, na nitaufuata upanga nyuma yao.
15 “Ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, mgbe m chụsachara ha nʼetiti mba niile dị iche iche, fesaakwa ha nʼala niile.
Kisha watajua kwamba mimi ni Yahwe, wakati nitakapo watawanya kwenye nchi zote.
16 Ma ọ bụ mmadụ ole na ole nʼime ha ka m ga-edebe ndụ site na mma agha, na ụnwụ na ọrịa na-efe efe. Ka ha nwee ike kọọ akụkọ ihe arụ niile ha nʼetiti mba dị iche iche ebe ha gbagara ọsọ. Ha ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.”
Lakini nitaacha kuwaangamiza watu wachache kutoka miongoni mwao kutoka kwenye upanga, njaa, na tauni, hivyo wanaweza kukumbuka maovu yao yote katika nchi zao nilipowachukulia, hivyo watajua kwamba mimi ni Yahwe.”'
17 Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
Neno la Yahwe likanijia, likisema,
18 “Nwa nke mmadụ, tụọ egwu mgbe ị na-eri nri gị. Jirikwa ihe ọtụtụ tụpụta mmiri ọṅụṅụ gị, dịka a ga-asị na ọ bụ ihe ikpeazụ i nwere.
“Mwanadamu, kula mkate wako kwa kutetemeka, na kunywa maji yako kwa mtetemo na hofu.
19 Ị ga-asịkwa ndị bi nʼala ahụ, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu banyere ndị bi na Jerusalem, nʼala nke Izrel, sị, Ha ga-eji ụjọ rie achịcha ha, jirikwa obi ịlọ mmiri ṅụọ mmiri ha, nʼihi na a ga-ekpochapụ ihe niile dị nʼala ha, nʼihi ihe ike nke ndị bi nʼime ya.
Kisha waambie watu wa nchi, 'Bwana Yahwe asema hivi kuhusiana na wale wakaao Yerusalemu, na nchi ya Israeli: Watakula mikate yao kwa kutetemeka na kunywa maji yao wakiwa wanatetemeka, kwa kuwa nchi itaporwa vitu vyote viijazavyo kwa sababu ya kuwa kinyume na waishio huko.
20 Obodo niile nke ndị mmadụ bi nʼime ya ga-ala nʼiyi, otu aka ahụ, ala unu niile ga-abụ ebe tọgbọrọ na nkịtị. Mgbe ahụ, unu ga-amata na mụ onwe bụ Onyenwe anyị.’”
Hivyo ile miji iliyokuwa wenyeji itachukuliwa, na nchi itakuwa ukiwa; hivyo mtajua kwamba mimi ni Yahwe.”'
21 Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
Tena neno la Yahwe likanijia, likisema,
22 “Nwa nke mmadụ, kedụ ihe ilu a na-atụ nʼIzrel pụtara, nke na-asị ‘Ụbọchị adịla oke anya, ọhụ niile abụrụkwala ihe na-enweghị isi?’
“Mwanadamu, je ni mithali gani hii mlio nayo katika nchi ya Israeli mliyoisema, 'Siku zimerefushwa, na kila ono linaanguka'?
23 Gwa ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu, Aga m eme ka ilu a kwụsị, ha agaghị atụkwa ya dịka ilu nʼIzrel ọzọ.’ Kama gwa ha, ‘Nʼụbọchị ahụ adịla nso mgbe ọhụ niile ga-emezu.
Kwa hiyo, waambie, 'Bwana Yahwe asema hivi: Nitaweka mwisho wa hii mithali, na watu wa Israeli hawataitumia tena.' Waambie, 'Siku zi karibu wakati kila ono litatimizwa.
24 Nʼihi na agaghị enwekwa ọhụ ụgha ọzọ, maọbụ ịjụ ase ire ụtọ nʼetiti ụlọ Izrel.
Kwa kuwa hakutakuwa na maono ya uongo yoyote wala upendeleo wa mgawanyiko kati ya nyumba ya Israeli.
25 Ma mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ga-ekwu ihe m zubere. Ihe ọbụla m kwuru ga-emezu na-atụfughị oge. Nʼihi na ọ bụ nʼoge unu dị ndụ, unu ndị nnupu isi, ka m ga-emezu ihe ọbụla bụ nke m kwuru. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.’”
Kwa kuwa mimi Yahwe! Nimesema, na nitayatiza yale maneno nilyoyasema. Hakuna kitu kitakacho chelewesha. Kwa kuwa nitaongea hili neno katika siku zenu, nyumba ya uasi, na nitalitimiza! -hivi ndivyo Bwana Yahwe asemavyo.””
26 Okwu nke Onyenwe anyị bịakwutere m,
Tena neno la Yahwe likanijia, likisema,
27 “Nwa nke mmadụ, lee, ụlọ nke Izrel na-asị, ‘Ọhụ niile ọ na-ahụ bụ maka ọtụtụ afọ dị nʼihu, amụma ya bụkwa maka oge na-abịa nʼihu.’
“Mwanadamu! Tazama, nyumba ya Israeli imesema, 'Lile ono alionalo ni kwa siku nyingi kutoka sasa, na ametabiri kipindi kilicho mbali sana.'
28 “Nʼihi ya, gwa ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, ọ dịghịkwa okwu m nke a ga-atụfu oge ọzọ nʼime ya, ihe ọbụla m kwuru ka a ga-emezu. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.’”
Kwa hiyo waambie, 'Bwana Yahwe asema hivi: Neno langu halitacheleweshwa sana, lakini lile neno nililoliongea litatimizwa-hivi ndivyo Yahwe asemavyo.'”

< Izikiel 12 >