Preface
Read
+
Publisher
Nainoia, Inc.
PO Box 462, Bellefonte, PA 16823
(814) 470-8028
Nainoia Inc, Publisher
LinkedIn/NAINOIA-INC
Third Party Publisher Resources
Request Custom Formatted Verses
Please contact us below
Submit your proposed corrections
I understand that the Aionian Bible republishes public domain and Creative Commons Bible texts and that volunteers may be needed to present the original text accurately. I also understand that apocryphal text is removed and most variant verse numbering is mapped to the English standard. I have entered my corrections under the verse(s) below. Proposed corrections to the The Igbo Holy Bible for Everyone, Ezekiel Chapter 12 https://www.AionianBible.org/Bibles/Igbo---Igbo-Bible/Ezekiel/12 1) Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị, 2) “Nwa nke mmadụ, i bi nʼetiti ndị na-enupu isi, ndị nwere anya ịhụ ụzọ ma ha adịghị ahụ; ndị nwere ntị ịnụ ihe ma ha adịghị anụ ihe, nʼihi na ha bụ ndị nnupu isi. 3) “Ya mere, nwa nke mmadụ, kwakọtaa ngwongwo ụlọ gị maka ị ga biri nʼala ọzọ, mee nke a nʼehihie dịka ha na-ele gị anya, hapụ ụlọ gị gaa nʼebe ọzọ. Ma eleghị anya ha ga-aghọta, ọ bụ ezie na ha bụ ndị nnupu isi. 4) Kwapụta ngwongwo gị nʼezi nʼehihie ka ha hụ ya. Ma hapụ ụlọ gị nʼabalị dịka ndị na-agba ọsọ ndụ si eme, mgbe ha na-amalite ije ha, nke ịga ibi nʼala ọzọ. 5) Mgbe ha na-ele gị anya, gwupuo mgbidi, site na ya kwara ngwongwo gị pụọ. 6) Mgbe ha nọ na-ele gị anya, bulie ibu gị, tụkwasị ya nʼubu gị, pụọ gawa nʼime ọchịchịrị, kpuchie ihu gị, ka ị ghara ihu ala ahụ anya. Nʼihi na emela m gị ihe ịrịbama nye ụlọ Izrel niile.” 7) Emere m ihe e nyere m nʼiwu. Ebupụtara m ngwongwo m nʼehihie, jikọta ha maka ịgba ọsọ ndụ. Nʼanyasị, eji m aka m gwuo ọnụ na mgbidi ahụ. Ebukwasịrị m ngwongwo m nʼubu, bulie ije nʼime ọchịchịrị mgbe ha nọ na-ele m anya. 8) Nʼụtụtụ echi ya, okwu Onyenwe anyị bịakwutere m, 9) “Nwa nke mmadụ, ọ bụ na ụlọ Izrel ndị nnupu isi ahụ ajụbeghị gị, ‘o lee ihe ị na-eme?’ 10) “Gwa ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Amụma a bụ maka onyeisi nọ na Jerusalem, nʼụlọ Izrel niile nọkwa ebe ahụ.’ 11) Sị ha, ‘Mụ onwe m bụ ihe ama nye unu.’ “Dịka m mere, otu a kwa ka a ga-eme nye ha. Ha ga-aga na mba ọzọ biri ka ndị a dọtara nʼagha. 12) “Nwa eze nke nọ nʼetiti ha ga-amaburu ibu ya nʼubu pụọ nʼọchịchịrị, ọ ga-egwupụ mgbidi aja nke obodo site nʼebe ahụ pụọ. Ọ ga-ekpuchikwa ihu ya ka ọ ghara iji anya ya hụ obodo ahụ. 13) Ma aga m eji ụgbụ m jide ya, meekwa ka ọ bịaruo Babilọn bụ ala ndị Kaldịa. Ebe ahụ ka ọ ga-anọ nwụọ, ma ọ gaghị ahụ ya anya. 14) Ndị niile gbara ya gburugburu na ndị agha ya niile ka m ga-achụsa nʼala niile, ọ bụkwa mma agha ka m ga-amịpụta jiri chụọ ha ọsọ. 15) “Ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, mgbe m chụsachara ha nʼetiti mba niile dị iche iche, fesaakwa ha nʼala niile. 16) Ma ọ bụ mmadụ ole na ole nʼime ha ka m ga-edebe ndụ site na mma agha, na ụnwụ na ọrịa na-efe efe. Ka ha nwee ike kọọ akụkọ ihe arụ niile ha nʼetiti mba dị iche iche ebe ha gbagara ọsọ. Ha ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.” 17) Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị, 18) “Nwa nke mmadụ, tụọ egwu mgbe ị na-eri nri gị. Jirikwa ihe ọtụtụ tụpụta mmiri ọṅụṅụ gị, dịka a ga-asị na ọ bụ ihe ikpeazụ i nwere. 19) Ị ga-asịkwa ndị bi nʼala ahụ, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu banyere ndị bi na Jerusalem, nʼala nke Izrel, sị, Ha ga-eji ụjọ rie achịcha ha, jirikwa obi ịlọ mmiri ṅụọ mmiri ha, nʼihi na a ga-ekpochapụ ihe niile dị nʼala ha, nʼihi ihe ike nke ndị bi nʼime ya. 20) Obodo niile nke ndị mmadụ bi nʼime ya ga-ala nʼiyi, otu aka ahụ, ala unu niile ga-abụ ebe tọgbọrọ na nkịtị. Mgbe ahụ, unu ga-amata na mụ onwe bụ Onyenwe anyị.’” 21) Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị, 22) “Nwa nke mmadụ, kedụ ihe ilu a na-atụ nʼIzrel pụtara, nke na-asị ‘Ụbọchị adịla oke anya, ọhụ niile abụrụkwala ihe na-enweghị isi?’ 23) Gwa ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu, Aga m eme ka ilu a kwụsị, ha agaghị atụkwa ya dịka ilu nʼIzrel ọzọ.’ Kama gwa ha, ‘Nʼụbọchị ahụ adịla nso mgbe ọhụ niile ga-emezu. 24) Nʼihi na agaghị enwekwa ọhụ ụgha ọzọ, maọbụ ịjụ ase ire ụtọ nʼetiti ụlọ Izrel. 25) Ma mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ga-ekwu ihe m zubere. Ihe ọbụla m kwuru ga-emezu na-atụfughị oge. Nʼihi na ọ bụ nʼoge unu dị ndụ, unu ndị nnupu isi, ka m ga-emezu ihe ọbụla bụ nke m kwuru. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.’” 26) Okwu nke Onyenwe anyị bịakwutere m, 27) “Nwa nke mmadụ, lee, ụlọ nke Izrel na-asị, ‘Ọhụ niile ọ na-ahụ bụ maka ọtụtụ afọ dị nʼihu, amụma ya bụkwa maka oge na-abịa nʼihu.’ 28) “Nʼihi ya, gwa ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, ọ dịghịkwa okwu m nke a ga-atụfu oge ọzọ nʼime ya, ihe ọbụla m kwuru ka a ga-emezu. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.’” Additional comments?
Refresh Captcha
The world's first Holy Bible un-translation!