< Izikiel 12 >

1 Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
And the word of Jehovah came to me, saying:
2 “Nwa nke mmadụ, i bi nʼetiti ndị na-enupu isi, ndị nwere anya ịhụ ụzọ ma ha adịghị ahụ; ndị nwere ntị ịnụ ihe ma ha adịghị anụ ihe, nʼihi na ha bụ ndị nnupu isi.
Son of man, thou dwellest in the midst of a rebellious house; they have eyes to see, and see not; they have ears to hear, and hear not; for they are a rebellious house.
3 “Ya mere, nwa nke mmadụ, kwakọtaa ngwongwo ụlọ gị maka ị ga biri nʼala ọzọ, mee nke a nʼehihie dịka ha na-ele gị anya, hapụ ụlọ gị gaa nʼebe ọzọ. Ma eleghị anya ha ga-aghọta, ọ bụ ezie na ha bụ ndị nnupu isi.
Therefore, thou son of man, prepare thee stuff for removing from the land; and remove by day in their sight, and remove from thy place to another place before their eyes. It may be they will consider, though they be a rebellious house.
4 Kwapụta ngwongwo gị nʼezi nʼehihie ka ha hụ ya. Ma hapụ ụlọ gị nʼabalị dịka ndị na-agba ọsọ ndụ si eme, mgbe ha na-amalite ije ha, nke ịga ibi nʼala ọzọ.
And carry forth thy stuff, as stuff for removing, by day in their sight, and go forth at even in their sight, as they that go forth into captivity.
5 Mgbe ha na-ele gị anya, gwupuo mgbidi, site na ya kwara ngwongwo gị pụọ.
Before their eyes break thou through the wall, and carry forth thereby.
6 Mgbe ha nọ na-ele gị anya, bulie ibu gị, tụkwasị ya nʼubu gị, pụọ gawa nʼime ọchịchịrị, kpuchie ihu gị, ka ị ghara ihu ala ahụ anya. Nʼihi na emela m gị ihe ịrịbama nye ụlọ Izrel niile.”
In their sight bear it upon thy shoulders, and carry it forth in the twilight. Cover thy face, so that thou see not the ground; for I have made thee a sign to the house of Israel.
7 Emere m ihe e nyere m nʼiwu. Ebupụtara m ngwongwo m nʼehihie, jikọta ha maka ịgba ọsọ ndụ. Nʼanyasị, eji m aka m gwuo ọnụ na mgbidi ahụ. Ebukwasịrị m ngwongwo m nʼubu, bulie ije nʼime ọchịchịrị mgbe ha nọ na-ele m anya.
And I did as I was commanded, I carried forth my stuff, as stuff for removing from the land, by day; and in the evening I broke through the wall with my hand; I carried it forth in the twilight; I took it upon my shoulder before their eyes.
8 Nʼụtụtụ echi ya, okwu Onyenwe anyị bịakwutere m,
And the word of Jehovah came to me in the morning, and said:
9 “Nwa nke mmadụ, ọ bụ na ụlọ Izrel ndị nnupu isi ahụ ajụbeghị gị, ‘o lee ihe ị na-eme?’
Son of man, hath not the house of Israel, the rebellious house, said to thee, “What doest thou?”
10 “Gwa ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Amụma a bụ maka onyeisi nọ na Jerusalem, nʼụlọ Izrel niile nọkwa ebe ahụ.’
Say to them, Thus saith the Lord Jehovah: This burden concerneth the prince in Jerusalem, and all the house of Israel that is therein.
11 Sị ha, ‘Mụ onwe m bụ ihe ama nye unu.’ “Dịka m mere, otu a kwa ka a ga-eme nye ha. Ha ga-aga na mba ọzọ biri ka ndị a dọtara nʼagha.
Say, I am your sign. As I have done, so shall it be done to them. They shall remove and go into captivity.
12 “Nwa eze nke nọ nʼetiti ha ga-amaburu ibu ya nʼubu pụọ nʼọchịchịrị, ọ ga-egwupụ mgbidi aja nke obodo site nʼebe ahụ pụọ. Ọ ga-ekpuchikwa ihu ya ka ọ ghara iji anya ya hụ obodo ahụ.
And the prince that is among them shall bear upon his shoulder in the twilight, and shall go forth. They shall break through the wall to carry forth thereby; he shall cover his face, that he see not the ground with his eyes.
13 Ma aga m eji ụgbụ m jide ya, meekwa ka ọ bịaruo Babilọn bụ ala ndị Kaldịa. Ebe ahụ ka ọ ga-anọ nwụọ, ma ọ gaghị ahụ ya anya.
I will also spread my net upon him, and he shall be taken in my snare, and I will bring him to Babylon, into the land of the Chaldaeans; yet he shall not see it, though he shall die there.
14 Ndị niile gbara ya gburugburu na ndị agha ya niile ka m ga-achụsa nʼala niile, ọ bụkwa mma agha ka m ga-amịpụta jiri chụọ ha ọsọ.
And all that are round about him to help him, and all his bands, will I scatter to every wind; and I will draw out the sword after them.
15 “Ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị, mgbe m chụsachara ha nʼetiti mba niile dị iche iche, fesaakwa ha nʼala niile.
And they shall know that I am Jehovah, when I shall disperse them among the nations, and scatter them in the countries.
16 Ma ọ bụ mmadụ ole na ole nʼime ha ka m ga-edebe ndụ site na mma agha, na ụnwụ na ọrịa na-efe efe. Ka ha nwee ike kọọ akụkọ ihe arụ niile ha nʼetiti mba dị iche iche ebe ha gbagara ọsọ. Ha ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.”
But I will leave a few men of them from the sword, from the famine, and from the pestilence; that they may declare all their abominations among the heathen, whither they come; and they shall know that I am Jehovah.
17 Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
And the word of Jehovah came to me, saying:
18 “Nwa nke mmadụ, tụọ egwu mgbe ị na-eri nri gị. Jirikwa ihe ọtụtụ tụpụta mmiri ọṅụṅụ gị, dịka a ga-asị na ọ bụ ihe ikpeazụ i nwere.
Son of man, eat thy bread with quaking, and drink thy water with trembling and with carefulness;
19 Ị ga-asịkwa ndị bi nʼala ahụ, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu banyere ndị bi na Jerusalem, nʼala nke Izrel, sị, Ha ga-eji ụjọ rie achịcha ha, jirikwa obi ịlọ mmiri ṅụọ mmiri ha, nʼihi na a ga-ekpochapụ ihe niile dị nʼala ha, nʼihi ihe ike nke ndị bi nʼime ya.
and say to the people of the land: Thus saith the Lord Jehovah concerning the inhabitants of Jerusalem in the land of Israel; their bread shall they eat with carefulness, and their water shall they drink with astonishment; that their land may be desolate from all that is therein, because of the violence of them that dwell in it.
20 Obodo niile nke ndị mmadụ bi nʼime ya ga-ala nʼiyi, otu aka ahụ, ala unu niile ga-abụ ebe tọgbọrọ na nkịtị. Mgbe ahụ, unu ga-amata na mụ onwe bụ Onyenwe anyị.’”
And the inhabited cities shall be laid waste, and the land shall be desolate, that ye may know that I am Jehovah.
21 Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,
And the word of Jehovah came to me, saying:
22 “Nwa nke mmadụ, kedụ ihe ilu a na-atụ nʼIzrel pụtara, nke na-asị ‘Ụbọchị adịla oke anya, ọhụ niile abụrụkwala ihe na-enweghị isi?’
Son of man, what meaneth that proverb which ye have in the land of Israel, saying, “The days are delayed, and every vision faileth”?
23 Gwa ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu, Aga m eme ka ilu a kwụsị, ha agaghị atụkwa ya dịka ilu nʼIzrel ọzọ.’ Kama gwa ha, ‘Nʼụbọchị ahụ adịla nso mgbe ọhụ niile ga-emezu.
Therefore say to them, Thus saith the Lord Jehovah: I will make this proverb to cease, and they shall no more use it as a proverb in Israel. But say to them, The days are at hand, and what is declared in every vision.
24 Nʼihi na agaghị enwekwa ọhụ ụgha ọzọ, maọbụ ịjụ ase ire ụtọ nʼetiti ụlọ Izrel.
For there shall be no longer any vain vision or deceptive divination within the house of Israel.
25 Ma mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ga-ekwu ihe m zubere. Ihe ọbụla m kwuru ga-emezu na-atụfughị oge. Nʼihi na ọ bụ nʼoge unu dị ndụ, unu ndị nnupu isi, ka m ga-emezu ihe ọbụla bụ nke m kwuru. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.’”
For I am Jehovah; I speak, and the word which I speak shall come to pass; it shall no more be delayed. In your own days, ye rebellious house, will I speak the word and perform it, saith the Lord Jehovah.
26 Okwu nke Onyenwe anyị bịakwutere m,
And the word of Jehovah came to me, saying:
27 “Nwa nke mmadụ, lee, ụlọ nke Izrel na-asị, ‘Ọhụ niile ọ na-ahụ bụ maka ọtụtụ afọ dị nʼihu, amụma ya bụkwa maka oge na-abịa nʼihu.’
Son of man, behold, they of the house of Israel say, “The vision which he seeth is for many days to come, and he prophesieth of times that are far off.”
28 “Nʼihi ya, gwa ha, ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, ọ dịghịkwa okwu m nke a ga-atụfu oge ọzọ nʼime ya, ihe ọbụla m kwuru ka a ga-emezu. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.’”
Therefore say to them, Thus saith the Lord Jehovah: There shall none of my words be deferred any more; what I speak shall be done, saith the Lord Jehovah.

< Izikiel 12 >