< Diuteronomi 19 >

1 Mgbe Onyenwe anyị Chineke gị bibiri mba ndị ahụ nwe ala ahụ ọ na-enye gị, mgbe ị chụpụrụ ha bichie nʼobodo ha nakwa ụlọ ha niile,
Lapho iNkosi uNkulunkulu wakho isiqumile izizwe, olizwe lazo iNkosi uNkulunkulu wakho ekunike lona, osusidla ilifa lazo, osuhlala emizini yazo lezindlini zazo,
2 mgbe ahụ, kewapụta obodo atọ nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị inweta, doo ha iche.
imizi emithathu uzazehlukanisela yona phakathi kwelizwe iNkosi uNkulunkulu wakho ekunika lona ukudla ilifa lalo.
3 Kewaa ala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị dịka ihe nketa ụzọ atọ ka otu obodo mgbaba dịrị nʼotu akụkụ. Wuzie ụzọ e si aga nʼobodo ndị a ka ọ dịrị onye na-agba ọsọ mfe ịgbaje nʼebe ahụ.
Uzazilungisela indlela, wehlukanise umngcele welizwe lakho iNkosi uNkulunkulu wakho ekunika lona ukudla ilifa lalo, ube lezigaba ezintathu, ukuze wonke umbulali abalekele khona.
4 Nke a bụ iwu banyere onye ọbụla gburu mmadụ gbaba nʼebe ahụ maka izere ndụ. Ọ bụrụ na mmadụ esite na-amaghị ama gbuo onye agbataobi ya, bụ onye ọ na-akpọghị asị nʼoge gara aga, ọ ga-agbaba nʼobodo ahụ nʼihi ize ndụ ya.
Lalolu ludaba lombulali ongabalekela khona ukuze aphile: Lowo otshaya umakhelwane wakhe kungeyisikho ngabomo, obengamzondi mandulo,
5 Ọ bụrụ na mmadụ na ibe ya agaa nʼọhịa ịwa nkụ ma isi anyụike ya esite nʼosisi ya dapụ dagbuo nwoke ahụ so ya gaa ịwa nkụ, nwoke ahụ na-awa nkụ ga-agbala nʼime otu obodo ndị a ichebe ndụ ya.
njengongena egangeni lomakhelwane wakhe ukuyagamula izihlahla, lesandla sakhe sitshaya ngehloka ukugamula isihlahla, lensimbi ikhumuke emphinini, imtshaye umakhelwane wakhe aze afe, yena uzabalekela komunye waleyomizi ukuze aphile.
6 Ma ọ bụghị otu a, onye ahụ na-agba ụgwọ ọchụ ga-esite nʼọnụma juru ya obi chụọ nwoke ahụ ọsọ, chụkwute ya, gbuo ya ma ọ bụrụ na obodo mgbaba ahụ adịrị nʼebe dị anya, ọ bụ ezie na nwoke ahụ abụghị onye kwesiri ọnwụ, ebe ọ bụ na o siteghị nʼekworo gbuo onye o gburu.
Hlezi umphindiseli wegazi axotshane lombulali, inhliziyo yakhe isatshisa, amfice ngoba indlela inde, amtshaye ambulale, lanxa bekungelasigwebo sokufa kuye, ngoba ebengamzondi mandulo.
7 Ọ bụ nke a mere m ji nye unu iwu ka unu wepụtara onwe unu obodo mgbaba atọ.
Ngalokhu ngiyalilaya ngisithi: Uzazehlukanisela imizi emithathu.
8 Ọ bụrụ na Onyenwe anyị Chineke gị emee ka oke ala gị saa mbara dịka ọ ṅụụrụ nna nna gị ha nʼiyi na ọ ga-eme, ọ bụrụkwa na o nye gị ala niile dịka o kwere na nkwa,
Uba-ke iNkosi uNkulunkulu wakho iqhelisa umngcele wakho, njengokufunga kwayo kuboyihlo, ikunika ilizwe lonke eyakhuluma ngalo ukubanika oyihlo,
9 nʼihi na i leziri anya gbasoo iwu ndị a m nyere gị taa ịhụ Onyenwe anyị Chineke gị nʼanya, na ije ije dịka ụzọ ya si dị, mgbe ahụ, i nwere ike họpụta obodo atọ ọzọ, nke ga-abụ obodo izere ndụ.
uba ugcina yonke limithetho ukuyenza engikulaya yona lamuhla, ukuthanda iNkosi uNkulunkulu wakho, lokuhamba endleleni zayo izinsuku zonke, khona uzazengezelelela eminye imizi emithathu ngaphandle kwaleyo emithathu.
10 Nʼụzọ dị otu a, ị ga-enwe ike gbochie ọnwụ ndị aka ha dị ọcha. Ọbara onye na-adịghị ihe o mere agaghị adịkwa gị nʼisi, nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị dịka ihe nketa.
Ukuze kungachithwa igazi elingelacala phakathi kwelizwe lakho iNkosi uNkulunkulu wakho ekunika lona ukuba yilifa, ube lecala legazi phezu kwakho.
11 Ma ọ bụrụ na nwoke ọbụla echere onye ọ kpọrọ asị nʼụzọ, gbuo ya, mesịa gbara ọsọ gaa nʼime otu obodo ndị a,
Kodwa uba umuntu elenzondo kumakhelwane wakhe, amcathamele, amvukele, amtshaye okokufa aze afe, abalekele komunye walimizi,
12 ndị okenye obodo ya ga-ezi ndị mmadụ ka ha gaa kpụta ya site nʼebe ahụ. Ha ga-ewerekwa ya nyefee nʼaka onye ga-abọrọ onye ahụ nwụrụ anwụ ọbọ, ka o gbuo ya.
khona abadala bomuzi wakhe bazathumela bamthathe lapho, bamnikele esandleni somphindiseli wegazi ukuthi afe.
13 Emerela ya ebere. Ị ghaghị ikpochapụ site nʼIzrel ikpe ọmụma nke so iwufu ọbara ndị aka ha dị ọcha, ka ihe gaara gị nke ọma.
Ilihlo lakho lingamhawukeli, kodwa uzakhupha igazi elingelacala koIsrayeli, ukuze kukulungele.
14 Mgbe ị batara nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-aga inye gị dịka ihe nketa, ehigharịla oke ala onye agbataobi gị nʼala ahụ enyere gị inweta.
Ungatshedisi isikhonkwane somngcele womakhelwane wakho abendulo abasibethelayo elifeni lakho, ozakudla ilifa lalo elizweni iNkosi uNkulunkulu wakho ekunika lona ukudla ilifa lalo.
15 Amala onye ọbụla ikpe mmehie nʼihi ama otu onye gbara. E kwesiri inwe ndị akaebe abụọ, maọbụ atọ tupu a maa mmadụ ikpe.
Umfakazi oyedwa kayikusukumela umuntu loba ngabuphi ububi loba ngasiphi isono, loba kusiphi isono one ngaso. Ngomlomo wabafakazi ababili kumbe ngomlomo wabafakazi abathathu udaba lungaqiniswa.
16 Ọ bụrụ na onye ọbụla achọọ imegide onye ọzọ site nʼịgba ama ụgha,
Uba kusukuma umfakazi wamanga amelane lomuntu emfakazela ngokubi,
17 a ga-eduru mmadụ abụọ ahụ bịa nʼihu Onyenwe anyị na nʼihu ndị nchụaja na ndị ikpe na-arụ ọrụ nʼoge ahụ.
khona abantu bobabili, abalokuxabana, bazakuma phambi kweNkosi, phambi kwabapristi labahluleli abazakuba bekhona ngalezonsuku.
18 Ndị ikpe ga-enyocha okwu ahụ nke ọma. Ọ bụrụ na a chọpụta na onye akaebe ahụ gbara ama ụgha,
Labahluleli bazachwayisisa; khangela-ke umfakazi ngumfakazi wamanga, ufakaze amanga ngomfowabo,
19 ọ ga-ata ahụhụ ahụ nwoke ahụ ọ gbagidere akaebe gaara ata. Nʼụzọ dị otu a, ị ga-ekpochapụ ndị ọjọọ site nʼetiti gị.
khona lizakwenza kuye lokho abehlose ukukwenza kumfowabo; ngalokhu uzakhupha ububi phakathi kwakho.
20 Ndị niile nụrụ ya ga-atụ egwu, ha agaghị emekwa ihe ọjọọ dị otu ahụ ọzọ.
Lalabo abaseleyo bazakuzwa, besabe, kusukela lapho bangabe besenza ububi obunjengalobu phakathi kwakho.
21 Emekwala ebere ọbụla. Ndụ laara ndụ, anya laara anya, eze laara eze, aka laara aka, ụkwụ laara ụkwụ.
Lelihlo lakho lingabi lesihawu; impilo ngempilo, ilihlo ngelihlo, izinyo ngezinyo, isandla ngesandla, unyawo ngonyawo.

< Diuteronomi 19 >