< 2 Ihe E Mere 27 >

1 Jotam gbara iri afọ abụọ na ise mgbe e mere ya eze. Ọ chịrị afọ iri na isii na Jerusalem. Nne ya bụ Jerusha nwa Zadọk.
בן עשרים וחמש שנה יותם במלכו ושש עשרה שנה מלך בירושלם ושם אמו ירושה בת צדוק
2 O mere ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị dịka nna ya Ụzaya mere, ma o meghị dịka nna ya, ọ banyeghị nʼime ụlọnsọ Onyenwe anyị. Ma ndị mmadụ gara nʼihu na-eme omume ha rụrụ arụ.
ויעש הישר בעיני יהוה ככל אשר עשה עזיהו אביו--רק לא בא אל היכל יהוה ועוד העם משחיתים
3 Jotam wugharịrị Ọnụ Ụzọ Ama nke dị Elu nke ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, rụọkwa ọtụtụ ọrụ nʼelu mgbidi nke ugwu Ofel.
הוא בנה את שער בית יהוה--העליון ובחומת העפל בנה לרב
4 O wuru ọtụtụ obodo nʼala ugwu ugwu Juda, wuokwa ọtụtụ ebe e wusiri ike na ụlọ elu nche nʼoke ọhịa.
וערים בנה בהר יהודה ובחרשים בנה בירניות ומגדלים
5 Jotam busoro eze ndị Amọn agha, meriekwa ha. Nʼafọ ahụ, ndị Amọn bunyere ya narị talenti ọlaọcha, na bushel ọka iri puku na puku abụọ, na bushel ọka balị iri puku na puku abụọ.
והוא נלחם עם מלך בני עמון ויחזק עליהם ויתנו לו בני עמון בשנה ההיא מאה ככר כסף ועשרת אלפים כרים חטים ושעורים עשרת אלפים זאת השיבו לו בני עמון ובשנה השנית והשלשית
6 Jotam ghọrọ eze dị ike nʼihi na ọ kpachara anya debe iwu Onyenwe anyị Chineke ya.
ויתחזק יותם כי הכין דרכיו לפני יהוה אלהיו
7 Ihe ndị ọzọ niile nʼoge ọchịchị Jotam, tinyere ihe gbasara agha niile ọ lụrụ, na ihe ndị ọzọ niile nke o mere, e deturu ha nʼakwụkwọ akụkọ ndị eze Izrel na Juda.
ויתר דברי יותם וכל מלחמתיו ודרכיו--הנם כתובים על ספר מלכי ישראל ויהודה
8 Ọ gbara iri afọ abụọ na ise mgbe e mere ya eze. Ọ chịrị afọ iri na isii na Jerusalem.
בן עשרים וחמש שנה היה במלכו ושש עשרה שנה מלך בירושלם
9 Jotam sooro ndị nna nna ya dina nʼọnwụ, e lie ya nʼobodo Devid. Ehaz nwa ya nwoke ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
וישכב יותם עם אבתיו ויקברו אתו בעיר דויד וימלך אחז בנו תחתיו

< 2 Ihe E Mere 27 >